Ndị Bishọp ụka Katọlik: Ị gbara nkịtị ewu mụọ n'ọgbụrị

Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlik a kpọrọ 'Catholic Bishop Conference of Nigeria' na bekee kwupụtara nke a oge ha gara hụ onyeisiala Naijiria bụ Mohammadu Buhari n'obi ọrụ ya dị na Aso Rock, Abuja.

Ndị Bishọp ndị a nke onye ndu ha bụ Achịbishọp nke Jos bụ Ignatius Kaigama, kwuru n'akwụkwọ ozi ha gụpụtara n'ije ahụ sị na ọ bụrụ na ha gba nkịtị na amaghị-eme nke gọọmenti etiti, ọ bụrụ na ha akụọla afọ n'ala n'ọrụ ha dịka ndị nna nke okwukwe.

N'ihe gbasara nchekwa obodo, ha tara Buhari ụta sị na ọ gbara nkiti ewu amụọ na ọgbụrị.

Ha sịrị:" Obi dị anyị mwute na e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara dị icheiche n'ala anyị ma laa akụ ha n'iyi. Akụ na ụba ruru nde kwuru nde naira, gunyere ụlọụka,ụlọakwụkwọ,ụlọọgwụ, na ebe a na-azụ ahịa bụcha ihe a gbara ọkụ.

"Ihe kacha ewute anyị bụ ọgbụgbụ ndị oyiegwu na-egbu igwe ndị mmadụ na Benue, Adamawa, Kaduna na Taraba steeti nke bụtere oke mkpu akwa na arịrị ọra mmadụ. Nkịtị gọọmentị etiti gbara ka nke a na-eme bụ ihe dị mgbagwoju anya."

Na ọchịchị na nchekwa akụ na ụba ala Naijiria, ha sịrị na Buhari na-akpa ọke.

Ihe Buhari kwuru

Mana na ọsịsa ya, onyeisi ala gwara ha na onweghị agbụrụ maọbụ mpaghara ọchịchị obodo ama ụma megbue na ike ọrụ gọọmenti.

O kwekwara nkwa na ya ga-enyochagharị ọrụ ndị gọọmenti nyere iji mezie ya.