You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Police Steeti ga-eme ka mmadụ ṅụọ mmirri tọgbọ ikọ
Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo etinyela ọnụ n'okwu ndị kwetara na ọ dị mkpa ịhapụ ndị
steetị obụla ka ha nwee ndị uwe ojii nke ha.
Osiri na ọnụogụ Naịjirịa kariri ndị uweojii enwere ugbua dịka otumba uwa bụ UN sịri tuzie.
O kwuru nke a na-ọgbakọ ndị Sineti kpọro maka nchekwa obodo n'Abuja tata bụ Thursday orie.
Osote onyeisiala siri na Naịjirịa ebuka ị nọ n'Abuja na ahazi maka nchekwa obodo.
O kwukwara na polisi nke steeti na ndị nche ime obodo bụ ihe ga-eme ka udo lọghachịte n'obodo Naịjirịa.
Ọ bụ maka mkpamkpa na-akpa na Naịjirịa ugbua mere e ji kpọ ọgbakọ a.
Yemi Osinbanjo Sikwara na gọmentị kwesiri itinyekwu ego n'ego a na-amaputa maka nchekwa obodo.
Ọ dọkwara aka na nti ka "aghara ị gbakwụghe ihe gbasara okwukwe uka na nke agburu ebe mmadụ si na-okwu a na-ese".
Ọ sịkwara na Naịjirịa na ndị agbataobi ya kwesiri ị gbakọaka gbochie ndi amakaekwu ji mkpụmkpụ egbe agafe obodo ndị a.