Otu nwata akwụkwọ anwụọla na mahadum Yola

Emechiela Modibbo Adama Yụnịvasiti dị na Yola Adamawa steeti.

Nke a mere ka ụmụ akwụkwọ mechara ngagharịiwe nke butere ọnwụ otu nwata akwụkwọ ebe aagbara ụlọụka ndị alakuba ọkụ na mahadum ahụ.

Otu nwata akwụkwọ mahadum ahụ nke achọghị ka-akpọ aha gwara onye ntaakụkọ BBC mbọ a gbara ịzọ nwaakwụkwọ ahụ ndụ amịtaghị mkpụrụ.

"E buru ya ga ụlọọgwụ n'abalị ụnyaahụ mana ọ nwụrụ n' ụtụtụ taa."

O kwukwara na ihe butere ọgbaghara ahụ bụ obi ilu nke sotere ntụliaka otu ụmụakwụkwọ a kpọrọ 'Student Union' na bekee nke ndị nwere mmeri bụkarịrị ndị ụka Kraist.

"Ụnyaahụ otu onye ụka zipu ozi na Whatsapp nke ụmụ akwụkwọ ndị Engineering. Ozi nke a bụtere ezigbo iwe n'afọ ndị uka alakuba."

Ọ gara n'ihu kwue na "Taa ka anyi kwesịrị i bido ile ule. Mana ihe a merenu emebiela ihe niile."

N'ime akwụkwọ ozi onye registra ụlọ akwụkwọ ahụ zipuru, o kwuru na onweghị nwa akwụkwọ ọbụla e kwesịrị ihu n'ala mahadum ahu site na elekere abụọ nke ehihe taa.