Oka Iwu: Anyi ga-agba ọsọ ndụ

Ebe foto si, Alamy
Onye isi ndị uweojii n'ala Naijiria bụ Ibrahim Idris agwaala ndị kọmịshọna uweojii nke steeti di ichiche ka ha gba mbọ wepụ ngwọ agha dika egbe na mgbọ n'aka ndị n'eche nche akpọrọ vigilante na militia n'olu bekee.
Idris gwara ndi kọmịshọna na sọọsọ ndị uwe oji kwesịrị iji ngwọ agha n'ala Najiria, ka ha na-echekwa ndụ ndi Naijiria niile dika akwụkwọ iwu ala sịrị kwuo.
Mana BBC Igbo kpọrọ ụfọdụ ndị ọkaikpe na ekwenti. Ha kwuru na atụmatu nke a, nwere ka ọ sị dị.

Ebe foto si, AFP
Goddy Uwazuruike gwara BBC Igbo na "ọ burụ na ndị uwe oji na-arụ ọrụ eziri ha, anyi agaghị na-ekwu maka ndi nche di ichiche na Naijiria. Mana ndi uwe oji adaala na ntule atulere ha, ya mere ndi Naijiria ji bido otu ndi nche"
Lanre Lasisi bụkwa onye oka iwụ ọzọ kwuru na "ndi uwe oji enweghi ike i che ndụ anyi,ya mere anyi jiri bido otu ndi nche. Ọnụ ọgụ ha ezughị oke iche Naijiria, ya mere ndi nche a di ichiche jị dị mkpa"
Mana Idris na ndi uweojii na-ebo ndi nche omume ọjọọ dika ohi. Uwazurike na Lasisi kwuru na ebubo nke a enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ.
Uwazuruike kwuru na ọ bụrụ na onwere ndị n'ime ha bụ ndị ohi, ọ bụ ọrụ dịrị ndị uwe oji inwụchi ha kama ị napụ ha niile ngwọ agha.




