You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe akwadola ndị sineti na ọjụjụ Magu
Ulọikpe ukwuu dị na Abuja ekwetala na ndị sinetị Naijiria mere ọfụma ijụ Ibrahim Magu dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka agha a kpọrọ EFCC.
Onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari họpụtara Magu ịbụ onyeisi EFCC ugboro abụọ mana ndị sineti jụrụ ya ugboro abụọ.
Dịka nkachi a si ga, ọkaikpe ukwu a kpọrọ John Tsoho kachiri na EFCC echeghị ọfụma mgbe ha na-eche na ndi sineti ga nabatarịrị nanị onye ndị isi ọchịchị họpụtara.
Tsoho kwuru na sineti nwere ikike i mgba mbọ hụ na sọsọ ndị tozuru etozu ka a ga họpụta maka ọrụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka na Naijirịa.