You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
David Beckham: Atụmatụ m izụta otu egwuregwu bịara na mmezu
Site n'ịgba bọọlụ bụrụ onye nwere otu egwuregwu bọọlụ bụ akụkọ onye gbaburu mba England bọọlụ bụ David Beckham, dịka o mere emume mgbape otu egwuregwu ya n'obodo Miami nke mba Amerịka, ndị ga-eso n'asọmpi Major League Soccer.
Major League Soccer (MLS) bụ aha asọmpi iko dị elu na mba Amerịka.
Beckham mere mkpebi ịzụ otu egwuregwu bọọlụ mmeba kamgbe afọ 2014 mgbe ọ na-agbara otu LA Galaxy bọọlụ, Ugbua atụmatụ ya a bịala na mmezu.
Otu egwuregwu ya nke n'enwebeghị aha na-ejikere igba asọmpi n'ọgbọ egwuregwu ga-aba mmadụ puku iri abụọ na ise, dịna n'obodo Miami.
"Obi dị m ụtọ iwetabata otu egwuregwu a n'ime obodo a - ije a adịghị mfe" dịka onye gbaburu otu Manchester United bọọlụ kwuru."
Beckam onye gbara afọ iri anọ n'otu kwukwara "Ekwere m unu nkwa n'otu egwuregwu anyị ga-ewebata n'asọmpi ga-abụ ọka ibe."
Ọ bụ onye kọmishịọna MLS bụ Don Garber nwere Beckham ikikere ịzụta otu egwuregwu bọọlụ ahụ dịka o kwuputara ya n'ụbọchị nkwọ bụ mọnde.
Ozị ekele juputara n'isi Beckham n'ime ihe nkiri nke gosipụtara ụmụya anọ, nwunye ya bụ Victoria, Serena Williams, Usain Bolt, ndịọzọ gụnyere Will Smith, Jay Z na Jennifer Lopez.
Beckham, onye gbara LA Galaxy bọọlụ site otu Real Madrid n'afọ 2007, a bụrụ onye mbụ gbara bọọlụ n'asọmpi MLS nwekwara otu egwuregwu n'asọmpi ahụ.