Ọkụ bara na ụlọọgwụ agbagbuola mmadụ iri anọ na South Korea

Ebe foto si, AFP
Ihe ruru mmadụ iri anọ na otu anwụọla na ọkụ ọgbụgba gbara ụlọọgwụ na Miryang. South Korea, ka ụlọ ọrụ nta akụkọ a na-akpọ Yonhap news agency siri kwu.
Ana eche na ọkụ ọgbụgba bidoro na ebe ana ahụ maka ndị aga enete anya ngwa ngwa a na-akpọ emergency room na Sejong Hospital, bụ ebe ọka mmụta maka ọrịa ọbi.
Ihe ruru mmadụ nari abụọ nọ na ime ụlọ ọgwụ a na ụlọ ebe ana enete ndị okenya n'nọdebe ya mgbe ọkụ a bidoro.
Ndị na gbanyụ ọkụ bupuru mmadụ a niile.
Ihe a bụ ọchachasị na ọkụ gbara na South Korea na afọ iri gra aga. Ana tụ anya na ọgụ mmadụ nwụrụ ga a ri enu.
Ndị na gbanyụ ọkụ gwara Yonhap news agency na ọ anwụrụ gbụrụ ndị a nwụrụ.
Ụtụtụ mmadụ meruru nnụkwụ ahụ.
Onyer isi ndị ọrụ ha bụ ịgbanyụ ọkụ Choi Man-woo gwara ndị nta akụkọ na amabeghi ihe kpatara ọkụ a.
"Ndị ihe metụtara si na ebe ana enete ndị okenya nakwa ụlọogwụ a. Onwere ndị na ime ha nwụrụ ka ebu ha eje ụlọọgwụ ọzọ," AFP si na Choi kwuru.

Ebe foto si, Reuters

Pictures from the scene show the building engulfed by heavy grey smoke as well as patients being rescued.

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Reuters
Ọkụ ogbugba mere ka ọ mere otu onwa mmadụ iri abụọ na itoolu nwụrụ na ọkụ gbara otu gym na mba ahụ









