You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụkọrọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa: 'Iwe ji anynị'
Ụfọdụ ọdọ mmanụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa na-ere mmanụ ụgbọala karịa narị naịra abụọ.
Ụkọ mmanụ ụgbọala alaghachiala na steeti dị iche iche na Naịjirịa ebe ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na ọtụtụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọ-ala anaghị ere ebe ndị na-ere anaghị ere n'ọnụ gọọmenti wepụtara.
Ha gara na igwe mgbasa ozi twitter we kwuputa ka ukọ mmanụ ụgbọala sị emekpa ha ahụ.
Ha katọkwara gọọmentị etiti.
Ụlọ ọrụ na-ere mmanụ na Naịjirịa bụ NNPC ekwuola na ụlọ mmanụ ha dị na steeti dị ichiche na Naịjirịa na-ere mmanụ n'ọnụ ego kwesiri nụ.
Gụrụ ihe ha na-ekwu na Twitter.
Ụfọdụ na-ajụ mgbe ahụhụ a ga-ebe:
N'izu gara aga, onye isi Sineeti bụ Bukola Saraki kwere na ọ bụrụ na etnye akwụkwọ PIGB ka ọ bụrụ iwu ọ ga-ebelata nsogbu ụkọ mmanụ site na- ịkwụsi mmerụaka,izupu mmanụ petrolu: