You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọchị ehi na Benue: 'Aga m emezu iyi ọrụ m' - Buhari
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onye isi ala bụ Muhammadụ Buhari na dị ọnụ na-eru n'okwu na Benue steeti emechaala ọgbakọ ha nwere n'Abuja taa.
Ọgbakọ ahụ bụ iji chọta ụzọ kachasị mma iji kpezie esemokwu dị n'etiti ndị obodo Benue na ndị ọchụ ehi nọ na steeti ahụ.
Na ngwụcha ọgbakọ ahụ, onye isi ala Buhari kwuru site n'akara ya na twitter na ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa niile nọ na Naịjirịa ga-agbasi mbọ ike iweta ya bụ esemokwu n'isi njedebe.