Mr Integrity 2021: Etu m si bụrụ onye kacha kwụwa aka ya ọtọ n'ọrụ oyibo na Naịjiria - Nel
Nelson Okoronkwo bụ nwoke ritere nturuugo Naịjirịa a kpọrọ 'Mr Integrity' n'afọ 2021 n'ihi ezigbo akparamagwa ya.
Okoronkwo bụ nwaafọ Igbo ritere nturugo nke afọ 2021 na ya bụ emume a na-eme kwa afọ.
Nke a bụ ugboro abụọ ya bụ nwoke na-erite nturuugo maka ikwuwa aka ya ọtọ.
N’okwu ya, “Nke a bụ nke ugboro abụọ Onyeisiala Naịjrịa nyere m nturuugo maka eziokwu na ikwuwa aka ọtọ’’. “Onye nke mbụ bụ onyeisiala Ibrahim Badamosi Babangida. Onye nke abụọ nyere ya nturu ugo bụ onyeisiala Mohammadu Buhari.”
Gịnị bụ ọkwa ‘Mr Integrity’
Ntụrụugo ‘Mr Integrity’ bụ ihe nrite nke onyeisiala Naịjirịa na-enye ndị ọrụ Bekee kwụwara aka ha ọtọ n’ọrụ iji na-akwali obi ndị mmadụ ka ha na-enwe akparamagwa dị mma.
Cheta n’afọ 2018, ụmụnwoke abụọ, Francis Emepueaku na Daniel Achi, na-arụ ọrụ nchekwa n’ọdọụgbọelu ofesi Murtala Mohammed Legọs, ritere nturugo a.
Ọzọkwa, otu nwaada Igbo bụ Josephine Ugwu ritekwara ụlọ na ya bụ nturugo n’afọ 2019.
Kirie ka Okoronkwo si malite ije ya na mgbe niile mpụ gbasagoro ya maka eziokwu.
Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Nnamdi Agbanelo