You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Achọrọ m iji egwuregwu 'gymnastics' gaa Olimpiks - Stephanie
Ịkụ ụgba bụ ihe a na-ahapụrụ ụmụnwoke na ndị mmonwụ n'ala Igbo, ọ bụ ihe e jiri mara ndị mkpọkịtị.
Mana mgbe nwatakrịrị nwaanyị gbara afọ itoolu malitere kụwa ụgba, mara na ihe dị na ya.
Nne na Nna Stephanie Ogechukwu Onuzuruka che na ọkpụkpụ adịghị ya n'ahụ mgbe ọ malitere ịkụ ụgba ka ọ gbara naanị afọ abụọ.
Mana ka e mechara ghọta ihe dị na ya, ha malitere ịkwado ya nke bụ na ọ gaala ofesi turu ugo lọta.
Lee Ogechukwu na nne ya ka ha kọọrọ gị ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghụrụ.
Ndị mere akụkọ a: Chimezie Ucheagbo na Vining Ogu