You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oluomachi Opara: Nwa Imo steeti nwere olu ogene
I chetara nwatakịrị nwere olu ogene wuru ewu na soshal midia?
Nwatakịrị ahụ aha ya bụ Oluomachi Joseph, wuru dịka ndị mmadụ nụrụ olu ya ebe ọ na-agụ egwu dịka ọ na-ebugharị ahịa ọ na-ere.
Ọ gwara BBC Igbo etu o si malite ịgụ egwu site n'ilele ụmụaka ibe ya n'onyonyo.
O kwukwara ihe ọ chọrọ ịbụ mgbe o toro.
Cheta na ndị mmadụ si ebe niile na-achọsi ya ike ịmata etu ha ga-esi gọzie ya; ebe ndị dị ka Femi Fani-Kayode bụbu minista njem ụgbọelu dinyere ndị gara chọọrọ ya ego.
Si n'ọnụ Oluomachi dị naanị afọ itoolu ugbua nụrụ etu o si malite, njem ya ruo ugbua na ebe o nwere olileanya iru.
N'ụbọchị ụka bụ nke ise nke ọnwa Julai, gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwuputara n'elu soshal midia ya etu ya na nwa ya nwoke bụ Oluomachi si soro gaa ụlọụka.
O kwuru na ọ bụ mbụ ya na nwa ya nwoke na-ezute ihu na ihu.
Uzodinma kwukwara na Oluomachi esonyela ndị na-ekwe ukwe n'ụlọụka dị n'isi ụlọọrụ gọọmentị Imo steeti.
Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo.
Akụkọ ndị a ga-amasị gị: