You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Agaghị m agbatịnwu aka mana a ga m agbatịnwu ụbụrụ m'
Efia Ayeyi dị afọ asatọ ma na-arịa ọrịa Osteogenesis Imperfecta.
Ọrịa a na-eme ka ọkpụkpụ gharị isi ike, nke mere na Ayeyi agbajiela okpụkpụ ya ọtụtụ oge kamgbe a mụrụ ya.
Agbanyeghị ụfụfụ mgbaji ọkpụkpụ a na-ebute, Ayeyi ekweghị ka ihe a mere ya dọghachị ya azụ.
Ọ kwọwara etu o si amasị ya ịgụ na ịgba egwu mgbe o nwere ohere ya.