You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Computer village protest: Anyị achoghị nne ukwu na nna ukwu n'ahịa anyị
Ndị ọrụ kọmputa sị na ha achọghị Iyaloja
Ndị na-azụ ahịa na Kọmpụta vileji nke Legọs akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị anabata Iyalọja na Babaloja bụ nke achọrọ ịtụkwasị ha n'isi dịka omenala ndị Yoruba si dị.
Onyeisi ndị otu ahịa ahụ bụ Ahmed Ojikutu bụ ndị kpọrọ onwe ha Allied Products Dealers Association of Nigeria (CAPDAN) kwuru nke a ụnyaahụ mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu.
Ndị na-azụ ahịa mere ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde iji gosi iwe ha ma rịọ ndị Naịjirịa niile ka ha ekwela ka amanye ha mama ukwu na papa ukwu n'ime ahịa ha.
Onye bụ Iyalọja?
Iyalọja bụ nwaanyị onyeisi ahịa dịka ụmụnwaanyị ahịa siri họpụta.
Dịka ọkammụta n'asụsụs Bisoye Elesin siri gwa BBC, ọ bụ Oba obodo ka o ruru ịhọpụta onye bụ Iyalọja.
O kwuru na ọ bụ omenala ịhọpụta onye na-azụ ahịa ebe ahụ ma sorokwa kwalite ahịa ahụ.
Elesin kwuru na ọ nwereike ọ gaghị enwe isi maọbụrụ na ahọpụta Iyalọja n'ahịa ebe e nwere ndị si n'agbụrụ dị icheiche.
May Day
Taa bụ ụbọchị enwepụtara maka ịja ndị ọrụ ike n'ụwa gbaa gburugburu bụkwa ụbọchị ezumike ndị ọrụ niile na Naịjirịa
Odeakwụkwọ Nigeria Labour Congress bụ Peter Ozo-Eson ji ohere a kpọọ oku ka amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra iri atọ n'ọnwa Mee a.
EFCC adọọla ndị Gọvanọ aka na ntị
Onye nnọchite anya ụlọrụ Economic and Financial Crimes Commission arịọla ndị gọvanọ na-abata ọhụrụ na ndị ochie ha sepụ aka na ngarị na mpụ na mmalite ọrụ ahụrụ ha.
Ibrahim Magu bụ onye kwuru nke a n'ọkpakọ ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị ochie sị na mpụ na ntọ bụ ihe kacha echere gọọmenti a aka mgba.
Trump na Moslem Brotherhood
N'ofesi, Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ekwuola na gọọmentị ya ga-etinye aha ndị Moslem Brotherhood nke Ijipt dị ka ndị Omekataraihepụụjọ.
Trump kwuru nke a ụnyahụ mgbe onyeisi mba Ijipt bụ Abdel Fattah al-Sisi kpọtụrụ na obi ya bụ ebe ọ nọ kwuo na ọ ga-amachi ndị otu ahụ mmekọ gbasara njem na akụnaụba.
Egwuruegwu,
N'egwuruegwu, Ajax ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham n'asọmpi Uefa Champion's league ụnyaahụ.
Goolu a si n'aka Donny van de Beek emeela ka Ajax manye otu ụkwụ n'agba ikpeazụ nke asọmpi a.