Ndị niile zọrọ ọchịchị n'aha APC n'imo bịakọta ọnụ - FCC Jones

Aha onyonyo, Imo APC primaries: 'Pati ka a na-atụrụ vootu ọbụghị mmadụ'

Ka ndị Imo steeti chere aka ịghọrọ onye ga-efe ọkọrọtọ APC na 2019, FCC Jones Onwuasoanya bụ ọnụ na-ekwuchitere APC n'imo steeti kpọkuru ndị niile zọrọ ọkwa n'aha pati ha ka ha bịkọta ọnụ.

Onwuasoanya kwuru sị na ọbụghị mmadụ ka a na-atụrụ vootu, na ọ bụ pati.

O kwukwara na APC Imo ewepụtala usoro iji mee udo, nke bụ na onye na-achọghị usoro ahụ nwereike ịga ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị