Rochas Okorocha metere ihe mere mmụọ jị achụ ya ọsọ - Gọọmentị Hope Uzodimma

Ebe foto si, Instagram
Gọọmentị Imo steeti asaala okwu onye bụbu Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru banyere onye nọchịrị anya ya bụ Hope Uzodinma.
Okorocha kwuru na Uzodimma kpọrọ ya asị dị egwu nke ya amaghị ihe kpatara ya dịka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels na-eme mkparịtaụka banyere ọnọdụ ọchịchị nakwa nchekwa na Naịjirịa ugbua.
Dịka onye ntaakụkọ Channels bụ Seun Okinbaloye jụrụ Okorocha maka esemokwu dị n'etiti ya Uzodinma, ọ sị na ya anaghị esesa gọvanọ ya okwu, na ọ bụ ya na-esesa ya okwu.
"Amaghị m ihe mere Uzodinma. Ọ na-ebuso m agha oge niile mana ekwere m onwe me nkwa na agaghị m emegwara. Ọ na-emere m ụfụ anya."
Okorocha gara n'ihu kwuo na ndị uweojii jichiri ndị ọkwọ ụgbọala ya nakwa ndị ọrụ ya ndị ọzọ n'Imo steeti kamgbe abalị ise gara aga.
"Ugboro ugboro ka ndị uweojii jichiri m, ma n'Imo steeti ma n'Abuja," Rochas na-ekwu.
"Ugboro ugboro ka e mebiri ụlọ m na akụnụba m ndị ọzọ."
"Mana n'ime ihe niile a, ihe m na-ahụ bụ naanị akpọmasị, o nweghị ihe ọzọ."
Okorocha gara n'ihu kwuo na ya ma na ya busowe Uzodinma agha ọ ga ebute nsogbu karịa nke a na-ahụ "n'ime steeti m tara ahụhụ wunlite".
Ọ kọwara na a na-ebo ya ebubo nrụrụaka mana nke bụ eziokwu bụ na ya nwere ego tupu ya abụrụ gọvanọ.
"Ihe ndị mmadu na-echezọ bụ na abụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ."
Gọọmentị Hope Uzodimma, n'ozi Ode Akwụkwọ Mgbasaozi ya bụ Ogwuwike Nwachukwu binyere aka, sị na ọ bụ mkpọtụ ka Okorocha na-eme.
Ha sị: "Ndị Naịjirịa ekwesighi ige ya ntị. Ọ bụ mmụọ ya na achụ ya maka etu o siri mebie steeti ọ chịrị afọ asatọ."
Ozi a sị na ebe ndị Imo "nwere ike ịgbaghara ya mana ha enweghi ike ichefu ihe o mere ha".
Ha sị na Gọvanọ Hope Uzodimma na-ekpochapụ ihe niile Okorocha mebiri.











