Ekuputela nwa ọzọ n'ọwa mmiri
Otu nwaanyị n'Obodo Indịa abụrụla onye chukwu jiri zọọ ndụ nwa amụrụ ọhụrụ n'ọwa mmiri. O gwara BBC na ọ bụ akwa nwa ọhụrụ ha nụrụ bụ ihe mere o ji chọpụta ma kupute ya n'ọwa mmiri. Ihe nke a nyere ya oke ọṅụ makana okwuru na ọ bụrụla mama nnukwu nwa ọhụrụ ahụ.