Nna m nwere nnukwu ihụnanya ebe ndị Naịjirịa nọ - Nana Hadiza Buhari
E liri ozu Muhammadu Buhari ụbọchị Tuzde 15, Julaị, 2025
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Nna m nwere nnukwu ihụnanya ebe ndị Naịjirịa nọ - Nana Hadiza Buhari
Aha onyonyo, O kwuru na nna ya nwere nnukwu ihunanya ebe ndị Naịjirịa nọ
Nana Hadiza Buhari gwara anyị na
nna ya bụ Muhammadu Buhari nwere nnukwu ihunanya ebe ndị Naịjirịa nọ.
Ọ gwara anyị nke a na mkparịtaụka
anyị na ya nwere.
Cheta na Muhammadu Buhari bụbu
onyeisiala Naịjirịa nwụrụ n'ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025 n'ụlọọgwụ Lọndọn dịka ọ
gbara afọ 82.
Buhari meriri ntuliaka ọkwa
onyeisiala Naịjirịa e mere na 2015 na 2019.
O nyefere ọkwa ọchịchị n'aka Bola
Tinubu na Mee 29, 2023.
Ihe Buhari gwara m maka ịchị Naịjirịa - Peter Obi
Aha onyonyo, Peter Obi kwuru nke oge ọ gara mgbaru na be Buhari dị na Daura, Katsina Steeti
Lee ihe Peter Obi kwuru oge ọ gara mgbaru n'ụlọ Muhammadu Buhari dị na Daura Katsina Steeti.
Cheta na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gunyere osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima, Peter Obi, Atiku Abubakar na Nasir El-Rufai gara njem mgbaru n'ụlọ Buhari iji tie ezinaụlọ ya aka n'obi.
Obi, Atiku, El Rufai na ndị ọzọ agaala zute ezinaụlọ Buhari
Nkọwa foto, Obi, El Rufai, Atiku na ndị ọzọ
Peter Obi ji aha Labour Pati zọọ okwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023, ogbo ya nke PDP bụ Atiku Abubakar na onye chiburu dịka Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai so na ndị gara mgbaru n'ụlọ Muhammadu Buhari bụbu onyeisiala Naịjirịa nwụrụ anwụ.
Ha mere njem ahụ ịga tie ezinaụlọ Buhari aka n'obi maka maka ọnwụ ya dịka e lichara ya n'ụbọchị Tuzde 15 Julaị, 2025.
Nkọwa foto, Atiku
Ọtụtụ ndị ọzọ a ma ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị gunyere osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima gakwara njem mgbaru ahụ.
Ha niile sonyekwere n’ekpere 'Fidau' e mere maka ọnwụ Buhari n'ụlọ ya dị n'obodo Daụra, Kastina steeti.
Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima
Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Lọndọn n’ụbọchọ Sọnde Julaị 13, 2025 mana e ntinyere ozu ya n’ala n’ụbọchị Tuzde.
E tinyela ozu Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa n’ala
Ebe foto si, Screengrab/TVC
Nkọwa foto, Olili ozu Buhari
Ozu onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari
abanyela n’ime ala n’obodo ya bụ Daura, Kastina steeti.
E tinyere
Buhari n’ala ka e kpechere ya ekpere ọnwụ.
Ndị ezinaụlọ ya, ndị ọnyị, ukwu na ibe nakwa ndị a maama bịara emmume olili ozu ya bịakwara leta ya ma sị ya gaa nke ọma.
Buhari nwụrụ n’oge ọ dị naanị afọ 82 n’ụlọọgwụ dị na Lọndọn.
Ọ bụ ndị agha bụ ihe bu akpatị ozu ya site mgbe ozu ya si Lọndọn
bata Naịjirịa ma buga ya n’obodo ya bụ ebe e tinyere ozu ya n’ala.
Lee oge e bulatara ozu Muhammadu Buhari na Naịjirịa
Aha onyonyo, Onyeisiala Bola Tinubu nabatara ozu Buhari n'ọdụ ụgbọelu Katsina Steeti.
Onyeisiala Bola Tinubu nabatara ozu Muhammadu Buhari n'ọdụ ụgbọelu Umaru Musa Yar'adua dị na Katsina Steeti tupu e buru ya gawa n'obodo ya dị na Daura ebe a ga-eli ya.
E burula ozu Buhari gawa n’obodo ya Daura maka olili ya
Ebe foto si, Rahma Abdulmajid/Facebook
Nkọwa foto, A ga-eburu ozu ya gawa n’obi eze Daura onye nke a mara dịka “Emir of Daura” bụ ebe a ga-ekpere ya ekpere
E burula ozu onye ahụ bụbu Onyeisiala NaịjirịaMuhammadu
Buhari nwụrụ anwụ gawa obodo ya na Daura nke Kastina steeti ebe olili ya
ga-eme.
Akụkọ ụlọmgbasa ozi BBC nwetere kwuru na a ga-eburu ozu ya
gawa n’obi eze Daura onye nke a mara dịka “Emir of Daura” bụ ebe a ga-ekpere ya ekpere
tupu e buru ya gawa n’ụlọ ya, ebe a ga-eli ya.
Cheta na e buru ozu ya ka emechara ya emume akwamozu steeti n’isi
obodo Kastina, ebe ndị isi nchekwa Naịjirịa sonyere n’ibupụta ozu ya n’ụgbọelu si
Lọndọn bubata ya na mba Naịjirịa wee duruo ya gawa n’ụgbọelu ọzọ ga-ebuga ya na
Daura maka olili ya.
Ozu Muhammadu Buhari erutela Katsina Steeti
Ebe foto si, Abdulaziz Abdulaziz
Nkọwa foto, Oge a na-ebubatara ozu Muhammadu Buhari n'ọdụ ụgbọelu Katsina Steeti
Ozu Muhammadu Buhari erutela ọdọ ụgbọelu Umaru Musa Yar'adua Airport dị na Katsina Steeti.
Osote onyeisiala Kashim Shettima so ụgbọelu ahụ buletara ozu Muhammadu Buhari maka olili ya n'obodo ya dị na Daura, Katsina Steeti.
Onyeisiala Bola Tinubu nabatara ozu Muhammadu Buhari oge ụgbọelu ahụ bu ozu ya batara.
Ka ọ dị ugbua, e bu ozy Muhammadu Buhari aga obodo ya dị na Daura ebe a ga-eli ya dịka usoro okpukperechi alakụba si kwu.
Ebe foto si, Abdulaziz Abdulaziz
Nkọwa foto, Oge a na-ebubatara ozu Muhammadu Buhari n'ọdụ ụgbọelu Katsina Steeti
Ụfọdụ ndị a ma ama anwụchiela Katsina Steeti maka olili ozu Muhammadu Buhari
Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook
Ọtụtụ ndị a ma ama na gọọmenti anwụchiela Katsina steeti iji kwanyere Muhammadu Buhari ugwu ikpeazụ.
Ihe onyonyo minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris wepụtara n'aka X ya, gosiri oge ya na minista ndị ọzọ rutere n'ọdọ ụgbọelu Katsina steeti dịka ha na-eche ozu Muhammadu Buhari.
A ga-eli ozu Muhammadu Buhari n’obodo ya dị na Daura,
Katsina steeti ụbọchị Tuzde Julaị 15, 2025 ma ọ kụọ elekere abụọ nke ehihe.
Ozu ya hapụrụ Lọndọn n’ụtụtụ Tuzde 15 Julaị bịawa Naịjirịa.
Onyeisiala Bola Tinubu ga-anabata ozu ya n’ogige ọdọ ụgbọelu Katsina steeti
tupu e buga ya n’obodo ya bụ Daura ebe a ga-eli ya site n’usoro okpukperechi
alakụba.
Aha onyonyo, A ga-eli ozu Muhammadu Buhari chịburu Naịjirịa n'obodo ya dị na Daura, Katsina Steeti
Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu hiwere out kọmiiti ga-ahụ maka nhazi olili ozu Muhammadu Buhari. Ndị out kọmiiti ahụ bụ:
Lee ụbọchị ikpeazụ Muhammadu Buhari n'obi ọchịchị Aso Rock dịka Onyeisiala Naịjirịa
Aha onyonyo, Muhammadu Buhari nwụrụ na Julaị 13, 2025 dịka ọ gbara afọ 82
Ihe onyonyo a Bashir Ahmed bụ onye ndụmọdụ Muhammadu Buhari na mgbasaozi wepụtara n'akara X ya, gosiri oge Muhammadu Buhari na-ahapụ obi ọchịchị Aso Rock, Abuja ụbọchị Sọnde Mee 28, 2023.
Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ọ hapụrụ obi ọchịchị Aso Rock dịka onyeisiala Naịjirịa.
O nyefere ọkwa ọchịchị n'aka Bola Ahmed Tinubu ụbọchị Mọnde 29, Mee, 2025.
Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa obodo ezigala puku ndị ọrụ na Kastina steeti maka olili ozu Buhari
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ozu Muhammadu Buhari ahapụla Lọndọn bịawa Naịjirịa maka olili ya n’ehihie taa.
Ndị uweojii nke Kastina steeti kwuru na ha na ndị ọrụ
nchekwa ndị ọzọ e jikọọla aka iziga ndị ọrụ nchekwa n’obodo Daura ya n’ebe ndị ọzọ
na steeti ahụ maka olili ozu onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari
nke e hibere n’ụbọchị taa bụ Tuzde 15 Julaị 2025.
N’aka nke ọzọ, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa obodo na
Naịjirịa, Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) bụ Aminu Datti ekwupụtala
na ụlọọrụ ahụ na-eziga ndị ọrụ mmadụ puku abụọ na narị asatọ na asaa n’ebe a
na-eme olili ozu onye bụbu Onyeisiala nwụrụ anwụ.
Dịka ụlọmgbasa ozi Channels tv siri kwuo, Datti kwuru na ụlọọrụ
ahụ zigara ndị ọrụ ya na ebe dị iche iche n’obodo Daura nke gụnyere obodo onyeisiala
ahụ nwụrụ anwụ, ọdụ ụgbọelu Umar Musa Yar’adua dị na Kastina, obi eze nke Kastina
na nke Daura ya n’ebe ndị ọzọ dị oke mkpa.
Ka ọ dị ugbua, ozu Muhammadu Buhari ahapụla Lọndọn bịawa Naịjirịa
maka olili ya n’ehihie taa.
Ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ banyere Muhammadu Buhari bụbu onyeisiala Naịjirịa
Aha onyonyo, Onyeisiala Buhari, ncheta ndụ ya na ọchịchị ya
Buhari zọrọ ọchịchị ị bụ Onyeisiala Naịjirịa ugboro atọ ma daa tupuu o merie n'afọ 2015 nke mere ya onye mbụ na-anọghị n'ọchịchị meriri gọọmenti nọ n'ọchịchị na Naịjirịa.
N'afọ 2019 ka ọ zọkwara ọchịchị ma merie.
Ozu Muhammadu Buhari ahapụla Lọndọn bịawa Naịjirịa maka olili ya
Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook
Nkọwa foto, Muhammadu Buhari
Ozi anyị na-eweta kwuru na ozu Muhammadu Buhari ahapụla Lọndọ bịawa Naịjirịa maka olili ya.
Bashir
Ahmed bụ onye ndụmọdụ Muhammadu Buhari kwuru na ndị so ozu ya eme njem a gụnyere
osote onyeisiala bụ Kashim Shettima nakwa ndị ezinaụlọ Buhari.
A na-atụ
anya na Onyeisiala Bola Tinubu ga-anabata ozu Muhammadu Buhari n’ọdọ ụgbọelu Katsina
steeti tupu e buru ya gawa n’obodo ya bụ Daura ebe a ga-eli ya dịka usoro
okpukperechi alakụba siri kwu.
Cheta na Muhammadu Buhari nwụrụ n'ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025 n'ụlọọgwụ dị na Lọndọn dịka ọgbara afọ 82.