Ghana na Morocco abụrụla mba Afrịka mbụ na-amachi ndị njem si China

Nke a na-abịa dịka China wepụrụ ọtụtụ iwu nchekwa maka ọrịa nke ọtụtụ na-eche na-akwalite mfesa ya na mba ahụ ugbua.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Akụkọ na-ekwu na mmadụ atọ anwụọla dịka otu ihe gbapuru ka ogbunigwe na Kogi steeti

    Okene, Kogi

    Akụkọ si Kogi steeti apụta taa bụ Tọọzde abalị 29 nke ọnwa Disemba, 2022 na-ekwu na opekatampe na mmadụ atọ anwụọla dịka ihe gbara ka ogbunigwe gbara n’obodo Okenne nke steeti ahụ. Ihe a gbara mere n'akụkụ Obieze dị n'okpuruọchịchị Okene.

    Nke a abụghị nke mbụ ihe na-agba dịka ogbunigwe n’Okene, nke bụ nnukwu obodo dị nso Lokoja bụ isi obodo steeti ahụ. N'oge iri elu mwakpo ndị otu nnupụsisi Boko Haram, ọtụtụ kepu kepu kwuru na obodo ahụ nwere ụlọ ebe nzuzu bụ ebe ụfọdụ ndị otu ahụ e ji mwakpo mara na-anọ.

    Ihe mgbawa gbapuru taa mere ka ọtụtụ ụlọ ndị nọ ebe ahụ maa jijiji nakwa ụlọ ndị nọ n'akụkụ ebe obibi onye ọchịchị ọdịnala bụ Ohinoyi nke Ebiraland.

    Ndị hụrụ ihe a mere gwara BBC na a hụrụ ụfọdụ ozu kaha tọgbọọ n'ala dịka ya bụ ihe gbapuchara. Amabeghi ihe kpatara ihe a gbapuru dịka a na-eche ozi nkọwa n’aka gọọmentị Naịjirịa banyere ya bụ ihe merenụ.

    Nke a na-abịa awa ole ma ole tupu Onyeisiala Muhammadu Buhari abata mpaghara ahụ. Ndị otu na-ahụ maka ihe mberede, gụnyere ndị na-ahụ maka mgbochi ogbunigwe awụchiela ebe ahụ, ebe a kpọgara ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.

    Agbanyeghị ihe a mere, ọ kwụsịghị Onyeisiala Buhari ịga a n'ihu ba emume mgbape ọrụ a haziri, ebe ọ ọ gara mepee ụlọọgwụ ọhụrụ a rụrụ n'obodo Okene.

  2. Amerịka etinyela iwu ọhụrụ nnyocha ime ahụ maka ọrịa Covid nye ndị njem si China

    Nnyocha ime ahụ ndị mba Chaịna

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka ekwuola na ndị njem si mba Chaịna ga-emeriri nnyocha ime ahụ iji gbaa ama na ha ebughị ọrịa covid-19 dịka Chịana kwuru na ha ga-emepe ọnụ ụzọ mba ha maka njem ọzọ

    Nke a na-abịa dịka Chaịna bụ ebe mbụ a hụrụ ọrịa a gbachiri ọnụ ụzọ mba ha kemgbe afọ 2020 ma bịaziri bụrụ ebe ya bụ ọrịa na-efesasi ike ọzọ kemgbe ọnwa ole m ole gara aga.

    Mba Ameriịka na-esochi mba Italy, Japan, Taiwan na India mkpebị a dịka mba Australia nakwa ma UK kwuru na ha agaghi ehibe iwu ọhụrụ ọbụla nye ndị njem si mba Chaịna.

    A hụrụ ọrịa Covid-19 n'ahụ ihe ruru mmadụ 5,000 kwa ụbọchị n'izu a, mana ndị ọrụ ahụike na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị ahụ karịrị ndị na-ebute ya bụ ọrịa dịka a na-arụ aka na kwa ụbọchị ndị na-ebute ya bụ ọrịa ga-eru ihe dịka otu nde. Ọtụtụ ụlọọgwụ ndị dị n'obodo ndị mepere emepe ebe ahụ juru eju dịka ndị mmadụ na-agba mbọ na-achọ ọgwụ nakwa anata ọgwụgwụ ọrịa a ugbua.

  3. Gọọmentị Naịjirịa na-atule ibuli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ oyibo ugbua

    Ahịa

    Gọọmenti etiti Naijiria na-ekwu na ọ na-atụle n'ịkwalite ụgwọ ọnwa ndị ọrụ oyibo na Naịjirịa. Ha na-ekwu na nke a bụ n'ihiọnọdụịrị elu nke ọnụ ahịa ihe ahịa nakwa obibi ndụ na Naịjirịa ugbua.

    Okwu ụgwọ ọnwa na-abụkarị okwu na-akpata okwu na Naijiria. Ọtụtụ gọọmentị steeti na-agbụrụ ihe maka ịgbakwụnye ụgwọ ọnwa ndị ọrụ oyibo ha n'ihi enweghị ego mkpata na steeti ha. N'agbanyeghị etu ọnọdụ ihe isi ike dị ugbua na Naịjirịa, ọtụtụ ụlọọrụ ka na-akwụ ihe na-erughị N50,000.00 kwa ọnwa.

    Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige kwuru na Tuzdee na kọmitii gọọmentị etiti hibere na-ahụ maka ụgwọ ọnwa amalitela itinyeaka n’okwu mgbanwe ụgwọ ọnwa ugbua.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ngụkọ ihe na-eme na Naịjirịa bụ ‘National Bureau of Statistics’ kwupụtara na ọnụ ahịa ụfọdụ ihe nri riri oke elu na Nọvemba.

    Ụfọdụ ndị Naijiria kwuru na iri elu ọnụ ahịa ọtụtụ ngwaahịa gụnyere nri amụbaala ma rie elu ruo ụzọ abụọ n'nwa iri na abụọ gara aga.

    Ememme ekeresimesi nke afọ a siiri ọtụtụ ezinụlọ ike ọkachasị ndị enweghị ka ọ hara ha maọbụ ndị nọ n’isi mkpata ego ezinaụlọ ma gharazie inwe ọrụ ugbua.

  4. Poopu Francis ekwuola na onye bu ya ụzọ bụ Benedict na-arịa ahụ ugbua

    Pope Francis na Benedict ka na-ezute onwe ha kwa mgbe kwa mgbe, kemgbe ọ gbara arụkwaghịm dịka Poopu na 2013.

    Ebe foto si, REUTERS/VATICAN

    Poopụ Francis ekwuola na onye bụbu Poopu nke aha ya bụ Poopu Benedict XVI na-arịa oke ọrịa ugbua dịka ọ rịọrọ ndị njem bịara ala nso Vatican ka ha kpere ya ekpere.

    Poopu Benedict gbara afọ 95, bụ onye ndu mbụ nke Ụka Katọlik kwụsịrị ọrụ ya n'afọ 600 maka okwu so ịka nká.

    O mere nke a n'afọ 2013.

    N’okwu ikpeazụ Poopu nke afọ a, Poopu Francis gwara ndị mmadụ ka ha "kpere Poopu Benedict ekpere pụrụiche".

    Isi ụka Katọlịki na Vatican kwuru na ahụike onye bụbu Poopu adatuwanyela n'awa ole m ole gara aga.

    Ọnụ na-ekwuchitere Vatican bụ Matteo Bruni kwuru, "Ọnọdụ a bụ ọnọdụ a na-elebasi anya ike dịka, ndị dọkịta na-esochi ya."

    Poopu Francis dịka ọ n na-agwa ndị na-ege ya ntị n'ụlọ ezumezu nke Vatican Paul VI mgbe gbara ama na ahụike Benedict na-agbada.

    Ọ gara ileta ya na ebe obibi ndị nsọ mọnk nke Mater Ecclesiae bụ ebe Benedict bi kemgbe ọ rituru n'ọkwa ya, bụ ebe nọ nso n'ụlọ nzukọ ndị na-ege ya ntị n'ime ogige Vatican nọ mgbe ahụ.

    Na mbido ọnwa a, Francis kpupụtara na ọ na-aga eleta Benedict ugboro ugboro.

    N'ikwu okwu banyere Benedict, ọ kpọrọ ya "onye senti" ma kwuo na ọ bụ nwoke nwere ndụ ime mmụọ dị elu, dịka ọ kọwara na ọ isi na-acha ọkụ ma nwee ezigbo agwa zuruoke.

    Cheta na Benedict XVI dị afọ 85 n'ebe ọnwa Febụwarị 2013 mgbe ọ mere ihe tụrụ ụwa n'anya site n'ịrịtu n’ọkwa ya dịka Poopu maka okwu ịka nka.

    Nke a na-abịa dịka ihe na-erughị afọ asatọ gachara ka a họpụtara ya dịka Poopu ka Kadịnal Joseph Ratzinger.

  5. Ndị ekperima atunyela ogbunigwe n'ime ụlọọrụ ndị uweojii n'Ihiala, Anambra steeti

    Ndị ọrụ nchekwa n'Anambra steeti ka na-agba mbọ ịhụ na udo lọghachitere na steeti ahụ kemgbe enweghị nchekwa malitere inye steeti ahụ nsogbu.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa n'Anambra steeti ka na-agba mbọ ịhụ na udo lọghachitere na steeti ahụ kemgbe enweghị nchekwa malitere inye steeti ahụ nsogbu.

    Ndị ojigebe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n’okpuruọchịchị Ihiala nke Anambra steeti taa bụ Wenezde, abalị 28 nke ọnwa Disemba ma tunye ogbunigwe n’ime ya bụ ụlọọrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gbaara BBC Igbo ama nke a n’ehihe Wenezde a ma kọwa na na busoro ndị ojiegbe ahụ agha ma napụ ha otu n’ime egbe ‘Ak47 rifle’ ha jiri bịa ya bụ mwakpo.

    N’ozi ya, o kwuru “Ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ anyị n’isi ụtụtụ Wenezde mana anyị na ha kwakọrịtara mbọ dịka anyị busoro ha agha nke mere ha jiri rie mbọ mbọ ọsọ”

    O kwuru na enweghị onye nwụrụ na ya bụ mwakpo mana ha ka na-agba mbọ ịnwuchi ndị mere ya bụ mwakpo.

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na ha emenyụọla ya bụ ọkụ nke ogbunigwe ndị ojiegbe ahụ tunyere kpatara.

    Akụkọ ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ zipụtara kwukwara na ndị ojiegbe ahụ tọhapụrụ ụfọdụ ndị a na-enyo enyo ndị uweojii ji eji n'ụlọọrụ ha.

    Ikenga azaghị BBC ajụjụ banyere nke a kpọm kwem dịka o kwuru "Anyị na-enyo ụfọdụ ndị anyị na-eso n'okwu a ugbua".

    Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Chukwuma Soludo zipụtara ozi nye ọha taa bụ Wenezde ma na-ekwu na Anambra abụrụla ebe udo na-achịzị karia etu ọ dịbu.

    N’ozi ekeresimesi ya, o kwuru “Ihe dị iche adịla n’okwu nchekwa n’Anambra steeti kemgbe m malitere ọchịchị nke bụ na mgbanwe ya dịka ndịche dị n’etiti ehihe na abali ugbua.”

    Cheta na Ihiala so n’akụkụ Anambra steeti ebe akụkọ mwakpo nakwa enweghi ezi nchekwa na-esikari apụta.

    Ọnọdụ a metụtara ntuliaka steeti ahụ n’afọ 2021 dịka e nweghị mee ntuliaka na mpaghara ahụ n’uju maka okwu enweghị ezi nchekwa.

    Okporoụzọ jịkọrọ Ihiala/Iseke/Ọlụ bịakwara bụrụ ebe ndị njem na-ezi ezi n’ihi ọnọdụ a.

    Ọ bụ n'okporoụzọ a ka ndị ekperima nọ tọrọ ndị agha Naịjirịa abụọ na-ala obodo ha maka agbamakwụkwọ na ebe mbido afọ a.

    Ndị ekperima a mechara gbuo mmadụ abụọ ahụ, ma wepụta onyonyo ebe ha na-ebepụ ha isi na soshal midia.

    Ndị agha Naịjirịa boro ebubo na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) n'ịchafụ kpara arụ a, mana Ipob gọrọ agọ na ọbụghị ha.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala na-asọ okporoụzọ Ihiala-Ọlụ asọ, maka na ejighi ihe a na-agba na ntị agba n'anya.

  6. Osimiri Baracuda Beach eloola mmadụ abụo na Legọs

    Osimiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Mmadụ abụọ tụfuru ha dịka ha gara ikpori ndụ n’osimiri a kpọrọ Baracuda Beach, na Legọs steeti n’ụbọchị Mọnde, ya bụ ụbọchị a kpọrọ 'Boxing Day'.

    Onyeisi ụlọọrụ gbata gbata na Legọs bụ Olufemi Oke-Osayintolu, kwuru na nke a bụ eziokwu ma kwuo na a ka na-agba mbọ ịchọta ozu mmadụ abụọ a..

    Osayintolu kọwara na mmadụ abụọ a gara ịzọpụta otu onye ha hụrụ na mmiri na-achọ iburu, mana mmiri burukwara ha.

    Ndị ọrụ nchedo ndụ (lifeguards) nọ nso ebe ahụ kwuru na mmadụ abụọ a gafere ebe e kwuru ka mmadụ ghara ịgafe, ọ bụ ya mere na ha onwe ha enweghị ike ịgafe ebe ahụ ịga zọpụta ha.

    Ọ bụ eziokwu na o meela abalị abụọ ihe ọdachi a mere, mana Osayintolu kwuru na ndị ọrụ ya ka na-agba mbọ ịmata ma a ga-ahụ ozu ndị ahụ mmiri buuru.

  7. Etu ọtụtụ mmadụ si laa n'iyi n'emume 'Calabar Bikers Carnival' nke afọ 2022

    Calabar Bikers Carnival

    Mmadụ iri na anọ, nke gụnyere otu nwaanyị dị ime, alaala mmụọ n'ike, n'emume 'Calabar Bikers Carnival' nke afọ 2022, na Calabar, bụ isi obodo Cross River Steeti nke Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Cross River bụ Irene Ugbo gwara BBC na ya bụ ihe mere eme n'ezie.

    O kwuru na ọ bụ otu onye ọkwọ ụgbọala bu ụgbọala ya gbabanye n'ime igwe mmadụ bụ ndị na-ekiri mmemme.

    "Amachaghị m ihe merenụ, mana ọkwọ ụgbọala ahụ na-agba nnukwu ọsọ oge ọ gbabara n'etiti ndị mmadụ kwụ na-elele ndị na-anya ọgbatumtum," otu onye hụrụ ihe merenụ gwara BBC.

    Mana Irene Ugbo kwuru na ọ bụ mmanya ka onye ọkwọ ụgbọala ahụ ṅụrụ nke kpatara o ji nyaa ụdị ihe ahụ ọ nyara.

    "Anyị anwụchiela ya bụ ọkwọ ụgbọala, ọ nọ n'aka ndị uweojii ugbua," Ugbo kwuru.

    N'ihi nke a, Gọvanọ Cross River Steeti bụ Ben Ayade, kagburu emume 'Bikers Carnival' ahụ, ma kwuo na ha amalitela nnyocha iji mata etu ọkwọ ụgbọala ahụ si batanwuo n'ogige ebe a na-eme ya bụ mmemme, nke anaghị ekwe ka ndị mmadụ bata.

    Onyonyo na foto na-efesa na soshal midia ugbua gosiri etu ya bụ ihe mberede si kwọpịa ndị mmadụ, ụfọdụ ozu mmadụ tọgbọrọ n'okporoụzọ.

    'Bikers Carnival' bụ otu n'ihe omume nke e ji mara emume 'Calabar Christmas Carnival' bụ nke malitere n'afọ 2004 mgbe Gọvanọ Donald Duke bụ aka na-achị Cross River Steeti.

    Mana ọ bụ gọvanọ nke ugbua bụ Ben Ayade, tinyere ihe ọmụme Biker's Carnival iji mee ka ya bụ emume Calabar Christmas Carnival na-ekpo ọkụ karịa.

    Ndị na-esonye n'emume a bụ ndị nwere ọgbatumtum pụrụ iche, bụ sọ mma, bụ nke ha na-egosipụta n'ụbọchị ahụ iji mee ndị mmadụ obi aṅụrị.

    Ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa, tinyere ụfọdụ ndị bụrụla gọvanọ, na-esonye n'emume a kwa afọ.

  8. Ụnụ asaala chi

    Igbo ndị ọma, ekele o.

    Ụnụ abọọla chi.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa. Ndewo.

  9. Onye ebukwarala anyị amụma ụgha banyere afọ 2023 - Ndị uweojii Ghana

    Prophessy

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii mba Gana Amachiela ndị ndu okpukperechi ibu amụma banyere afọ ọhụrụ bụ nke ha sị nwereike ibute ụjọ, obi ezughi ike nakwa ọnwụ.

    Ụfọdụ ndị kwuru na mmachi a megidere ikike dịịrị mmadụ inwe okpukperechi nke ya ma sị na o megidere iwu.

    Mana ndị uweojii a sị na-agbanyeghi na mmadụ nwere ikike a kama na ọ bụghị iji ya na-emegide ndị ọzọ.

    Ọtụtụ ndị na-ekpe ụka Kraịst na-agbakọta n’abalị ngwụcha afọ bụ mgbe ndị ụkọchukwu dị iche iche na-ebu amụma ihe ndị nwereike ime n’afọ ọhụrụ.

    Ndị uweojii mere iwu n’afọ gara aga mgbe ndị ụkọchukwu buru amụma banyere ọnwụ nakwa ọdachi ga-eme n’afọ ọhụrụ.

    Ha mawapụtara ụbọchị 27 Disemba dịka ụbọchị ime mkpesa banyere amụma, ha sị na onye ọbụla kwesịrị ikperechi ya kama ghara imegide ikike dịịrị onye ọzọ.

  10. Akin Osuntokun abụrụla onyeisi achụmnta vootu Peter Obi na Labour pati

    Akin Osuntokun

    Ebe foto si, Akin Osuntokun

    Otu Labour Pati ahọpụtala Akin Osuntokun dịka onyeisi achụmnta vootu ọhụrụ ha nakwa nke Peter Obi na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    Osuntokun nọchiri anya Doyin Okupe bụ onye gbara arụkwaghịm n’ihi ikpe a mara ya maka ntụrụaka ego.

    Tupu oge a, Osuntokun arụọla ọrụ dịka onyeisi News Agency of Nigeria, onye ndụmọdụ Onyeisiala Olusegun Obasanjo n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa onyeisi achụmnta vootu pati PDP n’afọ 2011.

    Cheta na ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nọọrọ n’ụbọchị 19 Disemba, 2022 maa Okupe ikpe maka ịnata ego dị nde narị naịra abụọ site n’aka Sambo Dasuki bụbu onye ndụmọdụ nchekwa bụ nke ọ sị megidere iwu na-achị ịtụ mgbere ego.

  11. Ị bọọla chi

    Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa

  12. Ndịagha atọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta na Mọnde

    Ụgbọelu Helikọpta

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha mba Nijee ekwuola na mmadụ atọ anwụọla mgbe ụgbọelu helikọpta ndịagha ha kpọkasịrị n’ọdọụgbọelu Diori Hamani n’ụbọchị Mọnde.

    Ndị nwụrụ n’ihe mberede ahụ gụnyere ndịagha Nijee abụọ na otu onye agha mba Ukren.

    Ụgbọelu helikọpta a kpọrọ Mi8 nwuuru ọkụ ngwa ngwa ọ kpọkasịrị n'ọdọụgbọelu ahụ n'ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ.

    Akụkọ kwuru na o mere mgbe ụgbọelu ahụ si ọzụzụ na nwalee na-achọ ifedata.

    Mbọ niile a gbara ịzọpụta mmadụ atọ nọ n'ime amịtaghị mkpụrụ dịka ọkụ ahụ repịara ha tupu e menyụọ ya.

    Ndịagha mba Nijee sị na nyocha ịchọpụta etu ihe a si mee na-aga n'ihu ugbua.

  13. Aka akparala ekperima a ma ama na Kaduna

    Onye ekperima

    Ebe foto si, Police

    Aka ndị uweojii Kaduna Steeti akparala otu onye ekperima a ma ama na steeti ahụ na-eresi ndị 'bandit' egbe, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Mohammed Jalige si kwuo.

    Jalige kwuru na ọ bụ ndị uweojii na-eche nche nwụchiri nwa amadị a aha ya bụ Bilyaminu Saidu na mpaghara Tudun Wada na Zaria dịka ya na onye otu ya bu ọgbatumtum na-enweghị akara njririmara.

    Nwa amadi a bụ onye obodo Shuwaki, nke dị n'okpuruọchịchị Bakori nke Katsina steeti.

    "Oge ha hụrụ ndị uweojii, onye nke nọ n'azụ ọgbatumtum ahụ wụturu ma were ụkwụ gbaba n'ime ọhịa, ndị ọrụ anyị wee nwụchie onye nke na-anya ya bụ ọgbatumtum," Jalige kọwara.

    "Oge anyị nyochara ọgbatumtum ahụ nke ọma, anyị hụrụ egbe AK47 anọ, mgbọegbe 7.62mm dị 344, ekwentị iri, na ọtụtụ ọgwụ a gwọrọ agwọ."

    Jalige kwuru na ha ejichiela nwa amadị ahụ ma malite nnyocha, dịka ha chọpụtara na ya na onye otu ya nke gbara ọsọ na-ebugara ndị ekperima 'bandit' egbe kwa mgbe kwa mgbe.

  14. Mmiri eloola mmadụ abụọ gara inwe aṅụrị ekeresimesi

    Ụgbọ kpuru ekpu

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu ezinụlọ na mba Kenya anọrọla n'anyammiri ugbua dịka ọpụpụ ha pụrụ ịga nwee aṅụrị ekeresimesi tụgharịrị ghọọrọ ha ihe iru uju.

    Na mgbede ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị ekeresimesi, ka ezinụlọ Memom, gara inwe aṅụrị n'osimiri 'Jomo Kenyatta Beach' nke a na-akpọkwa 'Pirate's Beach' dị na Mombasa, Kenya.

    Mana dịka ha nọ n'ụgbọmmiri na-enwerị aṅụrị, ụgbọmmiri ahụ kpuru, mmiri we rie otu nwoke na otu nwaanyị n'ime mmadụ iri na abụọ ndị ezinụlọ a.

    Onyeisi otu Red Cross nke Mombasa bụ Mahmoud Noor kwuru na otu onye ọzọ n'ezinụlọ a nọ n'ọnọdụ dị njọ n'ụlọọgwụ ebe e bugara ya maka ịnata ọgwụgwọ.

    Ụmụaka abụọ dị afọ atọ na afọ ise bụ ndị a zọpụtara n'ihe ọdachi a nọkwa n'ụlọọgwụ, mana ha na-enweta onwe ha.

    Ndị ọrụ gbatagbata so zọpụta ndị ezinụlọ a gụnyere ndị 'Kenya Coast Guard na ndị Kenya Red Cross; amabeghị ihe kpatara ụgbọ ahụ ji kpuo.

    Ngalaba 'Kenya Maritime Authority' kwuru na ha ewelitela aka na mgbasa ozi maka etu ndị mmadụ ga-esi chekwaa onwe ha ma ha bịa n'osimiri, iji belata ọnụọgụgụ ihe mberede a na-enwe ebe ahụ.

    Cheta na n'ime afọ atọ gara aga, anaghị ekwe ka ndị mmadụ gaa n'osimiri 'beach' dị icheiche na Kenya n'ihi iwu mmachi maka Covid-19, mana ewepụrụ iwu ndị ahụ n'afọ a.

  15. Oyi atụgbuola ihe karịrị mmadụ 30 na mba Amerịka na Canada

    Snow

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe ruru mmadụ 38 alaala mmụọ dịka oke oyi ọtụtụ a kpọrọ 'Arctic Freeze' na-enye nsogbu na mpaghara dị icheiche na mba Amerịka nakwa Kanada.

    Ndị ọchịchị na-ekwu na mmadụ 34 nwụrụ n'Amerịka, dịka obodo Buffalo dị na steeti New York bụ ebe ọ kacha metụta.

    Mmadụ anọ nwụrụ na mpaghara British Columbia nke mba Kanada dịka mmiri oyi kpọrọ akpọ (ice) mịchaara otu ụgbọala 'bus' ọ daa,

    Ndị ọrụ na-ekwu na ha atụghị anya na oke oyi ọtụtụ a, nke ihe kpatara ya bụ ọnọdụ a na-akpọ 'bomb cyclone', ga-eru itu a n'afọ a.

    Nnukwu snow

    Ebe foto si, Getty Images

    A na-atụ anya na ọnọdụ a ga-ebelata n'ụbọchị olemole na-abịanụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo, mana ha nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ma ọ bụrụ na ha enweghị ebe dị ezigbo mkpa ha chọrọ ịga.

    Ọnọdụ nnukwu 'snow' nke a emeela ka ihe ruru mmadụ 200,000 ghara inwe ọkụ latrik. O mekwaala ka akagbuo ọtụtụ njem ụgbọelu, nke pụtara na ọtụtụ ndị chọrọ ịga nọnyere ezinụlọ ha n'oge ekeresimesi, enweghịzi ike ime otu a.

  16. Ụtụtụ ọma

    Ndị ọma, ụnụ eteela.

    'Boxing Day' ọma nụ o.

    Lee akụkọ ndị anyị na-ewetara gị dịka ị na-ezu ike.

  17. Gọvanọ Dave Umahi adaala pati APC nha ego N5,000,000 n'Ebonyi steeti

    Dave Umahi

    Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook

    Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi adaala otu pati ya bụ APC nha maka ibisa akwụkwọ mgbasaozi achụmnta vootu aghara aghara na steeti ahụ.

    Dịka ozi si n'aka Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Uchenna Orji siri kwuo, pati ahụ na-achị achị na steeti ahụ megidere iwu steeti ahụ banyere ibikasị akwụkwọ mgbasaozi aghara aghara.

    Dịka onye kọmishọna ahụ siri kwuo, ihe a ihe imaatụ nye ndị ọzọ na steeti ahụ ọkachasị banyere irubere iwu isi.

    Ozi ya kwuru

    "Gọvanọ ekpebiela iji pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya bụ APC mee ihe ịmatụ, n’ihi nke a, adaala APC nha ego ya ruru nde naịra ise (5,000,000.00) maka ịda iwu steeti anyị.”

    "APC ga-akwụrịrị ego ahụ n’ọba ego ụtụ isi steeti ma nweta akwụkwọ ịgba ama ya bụ ego, ha ga-ekesakwa ya bụ akwụkwọ na ọba ozi soshal midia ha niile tupu ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2022 maọbụ ọbụrụ na ha emeghị nke a, ada ha nha nde naira iri ise (50,000,000.00)."

    Ọ gara n’ihu dọọ ndị pati ndị ọzọ nke a na ntị ma chetere ha iwu a nke dị ire na ya bụ steeti

    Cheta na iwu nke akara atọ n’akwụkwọ iwu steeti ahụ machiri ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị iji ebe ọgbakọ ọha dịka ụlọakwụkwọ, ogige mkpori ndụ, ahịa ebe ọgbakọ ọha ndị ọzọ mee mmemme ndọrọndọrọ ọchịchị ọkachasị achụmnta vootu ma ọbụrụ na ha anataghị ikike n’aka ọchịchị steeti ahụ

    Iwu a, nke Gọvanọ bịanyere aka na Nọvemba, machikwara ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị imakasi akwụkwọ achụmta vootu na steeti ahụ mgbe ha enwetaghị ikike gọọmentị steeti.

  18. Ndị ọchịchị Taliban amachịela ụmụnwaanyị mba Afghanistan ịrụ ọrụ enyemaka

    Ọchịchị Taliban emetụtala ikike dịrị ụmụnwaanyị n'Afghanistan n'ụzọ ọjọọ dị iche iche.

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ọchịchị Taliban emetụtala ikike dịrị ụmụnwaanyị n'Afghanistan n'ụzọ ọjọọ dị iche iche.

    Ụlọọrụ atọ na-arụ ọrụ enyemaka akwụsịla ọrụ n’Afghanistan dịka ndị ọchịchị Taliban machiri ụmụnwaanyị ịrụrụ ha ọrụ.

    N’ozi ụlọọrụ atọ a jịkọrọ aka zipụta, ụlọọrụ Care International, Norwegian Refugee Council (NRC) na Save the Children kwuo na ha agaghị enweike ịga n'ihu n'ọrụ ha "na-enweghị ndị ọrụ nwaanyị".

    Otu enyemaka ndị a na-achọ ka ụmụnwaanyị nweeike ịga n'ihu na-arụrụ ha ọrụ.

    Ọchịchị ndị Taliban n’Afganistan emegidela ikike ụmụnwaanyị n’ụzọ dị iche iche kemgbe ha weghara ọchịchị na 2021.

    Iwu ọhụrụ gbasara ndị enyemaka na-abịa dịka ole na ole gachara mgbe ndị Taliban machiri ụmụnwaanyị ịga mahadum na mba ahụ.

    Abdel Rahman Habib, onye na-ekwuchitere ministri na-ahụ maka akụnaụba n’ọchịchị Taliban boro ebubo n’iwu ọhụrụ gbochiri ụmụnwaanyị ịrụ ọrụ bụ n’ihi na ndị ọrụ ụmụnwaanyị na-arụ n’ụlọọrụ enyemaka ndị mba ofesi na-ada iwu ụkpụrụ ejiji ụka Alakụba nke bụ isi iwu ebe ahụ, ya bụ iwu ikpe ichafụ nakwa iji ejije ‘hijab’ kechie ihu.

    Ndị Taliban ezịpụtala ozi ịdọaka na ntị maka nkagbu ikike nke ụlọọrụ ọbụla na-agbasoghị iwu ahụ ngwa ngwa.

    Ndị isi nlekọta ụlọọrụ enyemaka nke NRC na Save the Children kwuru na ha "agaghị enweike ịjikọaka ọnụ ruo ọrụ metụtara ọtụtụ nde ndị mba Afghanistan nọ na mkpa kemgbe ọnwa Ọgọọst 2021" ma ọ bụghị maka ndị ọrụ ụmụnwaanyị ha.

    Ozi ha gara n’ihu kwuo:

    "Ọ bụ ezie na anyị ka na-agba mbọ ịghọta iwu ọhụrụ a, anyị na-akwụsịtụ ọrụ anyị, dịka anyị na-achọ ka ndị nwoke na ndị nwaanyị nweeike ịga n'ihu n’ọrụ enyemaka anyị nke na-azọpụta ndụ ndị Afghanistan,"

    Ramiz Alakbarov, onyeisi nhazi ọrụ enyemaka nke otu United Nations (UN) kwuru na UN na-anwa ime ka ndị Taliban gbanwee iwu ahụ dịka ha kwuru nke a bụ “akara uhie megide ndị ọrụ enyemaka niile”.

    Otu United Nations nwere ike kwụsị iziga ngwa enyemaka nye mba Afghanistan maọbụrụ na ndị ọchịchị Taliban ewepụghị iwu a machịrị ụmụnwaanyị ndị ọrụ enyemaka, ịrụ ọrụ dịka otu onye ọrụ ahụ siri gwa BBC.

    Mana Mazị Alakbarov kwuru na amabeghị ihe ndị Taliban pụtara n'iwu ya.

    O kwuru na onye minista ahụike nke Taliban agwala UN na ụlọ ọrụ ahụ kwesịrị ịga n'ihu n'ọrụ ahụike ya na ụmụ nwanyị nwere ike "ịkọ ọrụ na ịhapụ ọrụ ha".

    Ministri ndị ọzọ akpọtụrụla UN ozugbo na-ekwu na ọrụ na mpaghara nlekọta ọdachi na ihe mberede kwesịrị ịga n'ihu, ọ gbakwụnyere.

  19. Ọnọdụ anyị ka njọ ugbua karịa mgbe ị batara ọchịchị - Kukah gwara Buhari

    Onyeisiala Muhammadu Buhari na Bishop Mathew Kukah

    Ebe foto si, Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa

    Onye nlekọta ụka Katọlik na Dayọsis Sokoto, Sokoto Steeti bụ Bishọp Mathew Hasan Kukah ewepụtala ozi ekeresimesi ya nke afọ 2022, ebe ọ nọrọ rụtụ aka n'ihe dị icheiche nke ọ sị na ha anaghị aga nke ọma n'ọchcịhị Onyeisiala Muhammadu Buhari.

    Bishọp Kukah bụ onye a ma ama nwere nkwuwa okwu n'ihe gbasara ọnọdụ ọchịchị Naịjirịa kwa mgbe kwa mgbe.

    N'ozi ya, Kukah kwuru na nke a bụ ekeresimesi ikpeazụ Buharị ga-anọ n'ọchịchị dịka onyeisiala, mana "nke bụ eziokwu bụ na n'agbanyeghị nkwa ọma niile i kwere oge ị na-abanye ọchịchị, ị hapụla anyị n'ọnọdụ ka njọ karịa oge ị malitere ọchịchị."

    "Nrụrụaka nke anyị che na ị ga-ebuso agha aghọọla oke mmọnwụ, ihe kpatara nke a bụ ọchịchị gbakwasara ụkwụ n'ịma mmadụ.

    "N'ekeresimesi afọ gara aga, arụtụrụ m aka na ị dara iwu Naịjirịa dịka ị jụrụ irube isi n'usoro 'federal character'. Mpụtara ya kwụ anyị niile n'ihu ugbua," Kukah dere.

    Bishop Kukah toro Buhari maka mbọ ọ gbara na ngalaba nrụpụta ọkpụrụkpụ ihe (infrastructure) nakwa mbọ ime ka mpụ ntuliaka bịa na njedebe, mana ọ jụrụ Buhari sị, "Ị chọrọ ka m kwenye na onweghị ihe i nwere ike ime gbasara atụmatụ pati gị ịkpọpụta mmadụ abụọ bụ ndị okpukperechi alakụba maka ịzọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala?"

    Kukah kwuru na ya kelere Chukwu maka mgbake n'ọrịa na ahụike Buhari, n'agbanyeghị na ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ agaghị asị na ha ahụla mgbanwe ọbụla n'ọnọdụ ahụike Naịjirịa.

    Ọ gara n'ihu dụọ ndị Naịjirịa ọdụ ka ha ghara inwe nkoropu obi, kama "ka anyị rụọ ọrụ dịịrị anyị dịka anyị nwere ohere ịhọpụta ndị ndu ọhụrụ."

    "Họrọ onye ndu onye uche gị na-agwa gị na ọ ga-ahụ anyị n'anya, ihe gbasara anyị ga na-emetụ ya n'obi, ọ ga-eso anyị bee akwa, soro anyị chịa ọchị. Ka anyị lewe anya n'ihu ma hapụ ileghachi anya azụ," Kukah dere.

  20. Nchekwa dị n'Abia steeti gosiri na Chineke hụrụ steeti anyị n'anya - Ikpeazu

    Okezie Ikpeazu

    Ebe foto si, Okezie Ikpeazu

    Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu

    Gọvanọ Abia steetị bụ Okezie Ikpeazu ekwupụtala obi ụtọ ya maka ihe ọ sị bụ ọnọdụ udo na nchekwa dị na steeti ahụ dịka a na-eme emume ekeresimesi nke afọ 2022.

    Ikpeazu kwuru nke a site n'ozi ekeresimesi nke onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Onyebuchi Ememanka zipụtara taa bụ ụbọchị 25 nke Disemba.

    O kwuru sị: "Nke a bụ nnukwu ọrụ ebube nakwa ngosipụta ịhụnanya Chineke nwere n'ebe anyị nọ, na steeti anyị nwere nnọọ udo na ịda jụụ n'oge dịka nke a mgbe ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-echere mpaghara di icheiche nke obodo anyị aka mgba," ikpeazụ kwuru, dịka Ememanka si dee.

    "Anyị na-agwa ndị be anyị si esi lọta ka ha nọsapụ ahụ ma na-agara mkpa ha ebe ọbụla ha chọrọ ịga, ma na-atụtakwara gọọmentị ezigbo alọ maka ọganihu."

    Ikpeazụ kelekwara ndị Abia maka nkwado ha n'ebe ọchịchị ya nọ, dịka o kwuru na ye kwenyere na ọchịchị ya mere nke ọma, ọ kachasị n'ihe gbasara nchekwa, na ịrụ ọrụ a hụrụ anya.

    "Ọ bụ eziokwu na o nwereike anyị egbochaghị mkpa niile cheere anyị aka mgba, mana anyị mere nke ọma na ngalaba dị icheiche ma dịkwa njikere ime karịa," Ikpeazu kwuru.