Akụkọ na-ekwu na mmadụ atọ anwụọla dịka otu ihe gbapuru ka ogbunigwe na Kogi steeti

Akụkọ si Kogi steeti apụta taa bụ Tọọzde abalị 29 nke ọnwa Disemba, 2022 na-ekwu na opekatampe na mmadụ atọ anwụọla dịka ihe gbara ka ogbunigwe gbara n’obodo Okenne nke steeti ahụ. Ihe a gbara mere n'akụkụ Obieze dị n'okpuruọchịchị Okene.
Nke a abụghị nke mbụ ihe na-agba dịka ogbunigwe n’Okene, nke bụ nnukwu obodo dị nso Lokoja bụ isi obodo steeti ahụ. N'oge iri elu mwakpo ndị otu nnupụsisi Boko Haram, ọtụtụ kepu kepu kwuru na obodo ahụ nwere ụlọ ebe nzuzu bụ ebe ụfọdụ ndị otu ahụ e ji mwakpo mara na-anọ.
Ihe mgbawa gbapuru taa mere ka ọtụtụ ụlọ ndị nọ ebe ahụ maa jijiji nakwa ụlọ ndị nọ n'akụkụ ebe obibi onye ọchịchị ọdịnala bụ Ohinoyi nke Ebiraland.
Ndị hụrụ ihe a mere gwara BBC na a hụrụ ụfọdụ ozu kaha tọgbọọ n'ala dịka ya bụ ihe gbapuchara. Amabeghi ihe kpatara ihe a gbapuru dịka a na-eche ozi nkọwa n’aka gọọmentị Naịjirịa banyere ya bụ ihe merenụ.
Nke a na-abịa awa ole ma ole tupu Onyeisiala Muhammadu Buhari abata mpaghara ahụ. Ndị otu na-ahụ maka ihe mberede, gụnyere ndị na-ahụ maka mgbochi ogbunigwe awụchiela ebe ahụ, ebe a kpọgara ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.
Agbanyeghị ihe a mere, ọ kwụsịghị Onyeisiala Buhari ịga a n'ihu ba emume mgbape ọrụ a haziri, ebe ọ ọ gara mepee ụlọọgwụ ọhụrụ a rụrụ n'obodo Okene.

















