You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Mmadụ 1483 ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

Mmadụị ise ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19 na Naijirịa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo

  1. Ebonyi steeti amachiela ngagharị maka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ,

    Gọvanọ na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi amachiela ngagharị ndị mmadụ site n'elekere anọ taa bụ ụbọchị ụka rue elekere asatọ kwa ụbọchị.

    Mmachi ahụ bidoro taa bụ ụbọchị ụka mana o dobeghi anya mgbe ọ ga-ebi

    Nke a bụ iji belata ogbugbu nakwa mmefu akụ ndị mmadụ si n'ọgụ ndị NURTW na-alụ were dapụta.

    Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na Kọmịshọna ndị uweojii nke steeti ahụ agaala ebe ihe mere n'Effium ịchọpụta etu ihe sị kwụrụ.

    O kwuru na ọ bụ maka ọkwa ọchịchị nke ndị otu NURTW na-azọ ka esemokwu na ọgbaghara si welite isi.

    "Udo alaghachiela ebe ahụ, o nweghizi ihe na-eme" ka o kwuru.

    O kọwakwara na mmadụ anọ nwụrụ n'ebe ahụ ebe mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

  2. A zọpụtala ndị na-egwu ọlaedo 11 tọrọ n'ime ala kemgbe izu abụọ

    A zọpụtala mmadụ iri na otu bụ ndị na-egwu ọlaedo tọrọ n’ime ala kemgbe izu abụọ gara aga na mba Chaịna.

    Ihe ruru mmadụ iri ka tọrọ n’ime ebe ahụ, dịka a ka na-achọ etu a ga-esi rute ma kpọpụta ha.

    Ọnụ ebe e si abanye n'ime ọgba Hushan ebe a na-egwupute ọlaedo dị na mpaghara Shandong Province dagidere ndị nọ ebe ahụ arụ ọrụ ka ihe gbapụrụ ebe ahụ n'ụbọchị 10 nke ọnwa Jenụwarị.

    Mmadụ 22 tọrọ n'ime ọgba ahụ mgbe ọ dagidere ha, otu anwụọla ebe a kpọpụtarala mmadụ 11, mana ka ọ dị ugbua, amabeghi ma ndị nke fọrọ afọ a ka dị ndụ.

  3. Were naanị otu nkeji gere akụkọ ndị a ga-amasị gị

  4. Covid-19 egbuola mmadụ 53 n'ime otu izuụka

    Mmadụ iri ise na atọ anwụọla site n'ọrịa covid-19 na Naịjirịa n'ime otu izuụka.

    Nke a na-eme dịka osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo na-ekele ndịọrụ ahụike maka mbọ niile ha gbara kemgbeọrịa ahụ mabatara Naịjirịa.

    "Anyị awulitela amamihe anyị nakwa ikike anyị nwere ilụso ọrịa ọgụ" ka Osinbajo kwuru site n'akara Twitter ya.

    O kwuru na ọ bụ ọrụ ha na-arụ na-azọ ndụ ndị mmadụ.

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa covid-19 na Naịjirịa kwụzi na otu puku narị na narị isii na abụọ dịka ọnụọgụgụ nke ngalaba NCDC si kwuo.

  5. Ọkụ gaasị ọzọ agbakwaala na Rivas Steeti

    Akụkọ na-erute anyị ntị na-ekwu na ikuku gas ọzọ agbakwaala dịka ogbunigwe na Rivas Steeti n'ọdọ ikuku gas dị na Rumuodumanya nke dị n'okpuru ọchịchị Obio Akpor nke Rivas steeti.

    Ya bụ ọkụ bidoro mgbe ọ fọrọ nkeji iri na saa ka ọ kụọ elekre asatọ nke abali na satụde n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021.

    Ndị mmenyụ ọkụ na ndị agbata obi bi ebe ahụ nyere aka menyụọ ya bụ ọkụ.

    Amatabeghị ma e were ndị nwụrụ na ya bụ ọkụ.

    Akụkọ ka na-abịa.

  6. Poirier esuola Mcgregor ka ụtara ji

    Dustin Poirier kụpụtara Conor Mcgregor kịtịkpa n'anya dịka ha zutere onwe ha ọzọ n'ụtụtụ taa n'egwuregwu Mixed Martial Arts.

    Nke a na-eme ya ugboro abụọ ha na-ezute onwe ha dịka Mcgregor meriri Poirier mgbe ha zutere mbụ.

    Kama Poirier gosiri Mcgregor na ọ bụghị egwuregwu ka ọ bịara igwu dịka ha zutere ọzọ n'ụtụtụ Sụnde.

    Ọ bụ na agba nke abụọ ka Poirier kuturu Mcgregor n'ala were merie.

  7. A hụtala Covid-19 n'ahụ mmadụ 1,633 ọzọ na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na Twitter ha na mmadụ otu puku na narị isii na iri atọ na atọ ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ ise ọzọ si n'aka ya bụ ọrịa nwụọ.

    Ebe mmadụ otu puku na iri abụọ na anọ esila n'ute ọrịa gbakee.

  8. Unu abọọla chi!

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  9. Daalụ maka ịnọnyere anyị taa

    Ka anyị na gị nwee ọzọ echi.

    Ka chi foo ma fotere anyị niile ihe ọma.

    Iseeee!

  10. Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka a nwụchie Sunday Igboho

    Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị uweojii Naịjiria enyela iwu ka a nwụchie Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara, maka ịsị ndị ọchị ehi si n’Ọyọ steeti kwapụ.

    Nke a na-abịa dịka Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari gwara BBC na Adamu agwala ya na o nyere iwu nwụchi ya.

    Okwu gbasara Igboho ka a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa kemgbe Fraịde bụ ụbọchị ya na ndị nkwado ya gara obodo Igangan ebe ndị Fulani bi dị n'okpuruọchịchị Ibarapa dị n'Ọyọ steeti, bụ ebe ọ nọ kwuo na ndị Fulani niile bi na steeti ahụ ga-akwapụrịri n'ime mkpụrụ ụbọchị asaa.

    O boro ha ebubo ịtọ nakwa igbu ndị mmadụ nakwa ịkpa arụ ndị ọzọ na-eme na mpaghara steeti ahụ.

    Ka okwu nọ na-arị elu, ndị otu ya mụnyere ọkụ n'ụlọ onyeisi ndị Fulani ebe ahụ bụ Salihu Abdukadir.

    Ihe ị kwesịrị ịma gbasara Sunday Igboho

    • Ezigbo aha ya bụ Ichie Sunday Adeniyi Adeyemo
    • Ọ bụ onye na-ebu ikike dịrị ndị Yoruba n'isi
    • Akụkọ kwuru na o toro na Mọdakeke dị n'Ọshụn steeti, mana ọ bụ onye Igboho dị n'Ọyọ steeti
    • Ọ rụburu ọrụ dịka onye mekanik mgbe ọ na-eto na Mọdakeke
    • E bidoro ịnụ aha ya mgbe a chụturu Rashidi Ladoja bụbu gọvanọ Ọyọ steeti, n'ihi nkwado pụrụ iche o nyere Ladoja
    • N'agbanyeghi na ọ zọbeghi ọkwa ọchịchị ọbụla nke o ji abụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị, Igboho na-ekwu na Ladoja bụ onye ọ na-eṅomi
    • Ọ lụrụ nwunye abụọ
    • Ụfọdụ ndị na-eche na o nwere ike nke mmụọ n'ihi ụdịri okwu ọ na-ekwu
    • Ọtụtụ ndị enyi ya gụnyere ndị na-eme ejije n'asụsụ Yoroba
  11. Jiri otu nkeji gere akụkọ ndị ga-amasị gị taa

  12. Gọvanọ Ikpeazu achụọla ndị so ya achị Abịa steeti n'ọrụ

    Aka na-achị Abia steeti bụ Gọvanọ Okezie Ikpeazu, achụọla ndị ya na ya so achị Abịa steeti nke Bekee kpọrọ 'State Executive Council' n'ọrụ.

    O zipuru ozi ọchụchụ ha site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Onyebuchi Ememanka, dịka ọ na-ekelekwa ha maka ọrụ ha rụrụ ndụ Abịa.

    O nyekwara iwu sị ka ha wepụta ihe gọọmentị niile dị ha n'aka ma nyefee ya n'aka odeakwụkwọ ministrị ọbụla ha na-anọchitebu.

    N'otu aka ahụ, gọvanọ Ikpeazu akpọghachitela Dkt. ACB Agbazuere bụ onyeisi ndị ọrụ na gọọmentị ọ kwụsịtuburu ọrụ, ma sị ka o bido ọrụ ozugbo.

  13. Arsenal ejirila aka ha zapụ onwe ha n'Iko FA

    Ndị Arsenal jiri aka ha mee onwe ha ịwa mgbe naanị otu goolu ha gbanyere onwe ha zuru iji chụpụ ha n'asọmpi Iko FA.

    Goolu si n'ụkwụ Gabriel baa na poostu ndị Arsenal na nkeji 24 e ji bido bọọlụ, mgbe Kyle Walker nọ na-ahaziri Peters nri chinyere.

    Nke a mere ka Arsenal ghara inweta ohere ịba n'agba nke ise nke ya bụ asọmpi.

    Ka ọ dị ugbua, Southampton ga-ezute Wolves n'agba ọzọ na-abịa.

  14. Na Akpọtụ Ugbu A, Larry King anwụọla

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na onye ntaakụkọ a ma ama na mbaụwa bụ Larry King anwụọla ka ọ dị afọ 87.

    Ọ nwụrụ taa n'ụlọọgwụ Cedars-Sinai dị n'obodo Los Angeles dị na mba Amerịka, dịka Ora Media bụ ụlọọrụ mmepụta o so hibe si kwuo.

    Ndị ntaakụkọ mba Amerịka na-ekwu na a nọ na-agwọ ya ọrịa covid-19 n'ụlọọgwụ n'ọnwa Jenụwarị a.

    Cheta na ọ rụrụ ọrụ onye ntaakụkọ ihe ruru afọ iri isii (60), ebe ọ nọ nwee ọgbọ ntaakụkọ nke ya n'ụlọọrụ CNN afọ iri abụọ na ise (25) tupu ọ wụsa ọwa.

    N'ọgbọ ntaakụkọ ya ahụ a kpọrọ "The Larry King Show", ọ gbara ọtụtụ ndị a ma ama gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị egwuregwu a ma ama, nakwa ndị na-ewu ewu, ajụjụ ọnụ.

  15. 'Ọkụ Ikụkụ gas egbuola otu onye na Delta steeti' - Ndị Uweojii Delta steeti

    Ọkụ ikuku gas agbaala dịka ogbunigwe gbuo ma merụọ ndị mmadụ ahụ na obodo Agbọ nke dị n'okpuruọchịchị Ịka Saụt dị na Delta Steeti.

    Ya bụ ọkụ gbara n'ogige ebe a na-ere ikuku ọkụ bidoro na elekere ise nke mgbede n'abalị Frịde.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya gwara BBC Igbo na ọ bụ nanị otu onye ka ha hụrụla ya bụ ọkụ gbagburu.

    Onovwakpoyeya kwuru na arụrụ ya bụ ụlọọrụ ikuku ọkụ n'etiti ebe ndị mmadụ bi.

    O kwuru sị "Anyị ka na-aga n'ụlọọgwụ ka anyị mata mmadụ ole ya bụ ọgụ metụtara".

  16. Victor Osimhen esila n'aka ọrịa Covid-19 gbakee!

    Nwaafọ Naijirịa Victor Osimhen na-agbara ndị otu Napoli esila n'aka ọrịa covid-19 pụta.

    Ọ bụ ndị ngalaba ahụike otu ahụ nyere ya bụ ozi.

    Osimhen bụtere ya bụ ọrịa dịka o si Naijirịa lọta.

  17. Mmadụ 1483 ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu puku na narị anọ na iri asatọ na atọ ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na Iri isii na ise si Delta steeti, iri isii na anọ sịkwa Rịvas steeti, iti abụọ na asatọ si Abia ebe ịse ọzọ n'ime ha sị Imo.

    Kama mmadụ ise ọzọ nwụkwara site n'aka ya bụ ọrịa.

  18. Unu abọọla chi!

    Soro anyị taa dịka ọ na-akpọtụ n'ụwa niile.

  19. Ka chi foo

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.

    Ka chi foo.

  20. Kpuchie imi gị maọbụ ị gaa nga ọnwa isii maọbụ kwụọ N20,000 - Gọvanọ Uzodimma

    Aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Hope Uzodimma ekwuputela mkpa ọ dị irube isi n'iwu gọomentị tinyere maka ibuso ọrịa covid-19 agha na steeti ahụ.

    N'ozi o ziputara n'ụbọchị Fraịde, Jenụwarị 22, o kwuru na dịka ọ hụrụ na ndị mmadụ anaghị ekwe ekpuchi imi ha dịka ndị ahụike si kwuo, na ọ ga-eme ya iwu na ndị mmadụ bidoro ikpuchi imi.

    N'ihi nke a, Uzodimma kwuru na onye ọbụla e jidere ka ọ na-ekpuchighi imi ga-aga nga ọnwa isii maọbụ kwụọ nha puku iri abụọ (N20,000).

    O kwukwara na e mepeela ụlọikpe ngagharị anọ ga na-ekpe onye ọbụla a hụrụ na-eyighi mkpuchi imi ikpe ozugbo.

    O kwuru na ọgbakọ ọbụla karịrị mmadụ iri ise (50) dara iwu, nke ga-ebutekwa ịga nga maọbụ ịkwụ nha puku iri abụọ.

    Maka ụlọ ngwọrị, o kwuru sị na ha ga-etinyerịrị ebe a na-akwọ aka nakwa ihe nhicha aka (sanitzer) ma hụkwa na onye ọbụla na-abata n'ime ya kpuchiri imi. Maọbụghị ya, a ga-emechi ya bụ ụlọ ngwọrị.

    Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju:

    Lee ihe o kwuru maka mmepe ụlọakwụkwọ na steeti ahụ: