Ebonyi steeti amachiela ngagharị maka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ,
Gọvanọ na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi amachiela ngagharị ndị mmadụ site n'elekere anọ taa bụ ụbọchị ụka rue elekere asatọ kwa ụbọchị.
Mmachi ahụ bidoro taa bụ ụbọchị ụka mana o dobeghi anya mgbe ọ ga-ebi
Nke a bụ iji belata ogbugbu nakwa mmefu akụ ndị mmadụ si n'ọgụ ndị NURTW na-alụ were dapụta.
Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na Kọmịshọna ndị uweojii nke steeti ahụ agaala ebe ihe mere n'Effium ịchọpụta etu ihe sị kwụrụ.
O kwuru na ọ bụ maka ọkwa ọchịchị nke ndị otu NURTW na-azọ ka esemokwu na ọgbaghara si welite isi.
"Udo alaghachiela ebe ahụ, o nweghizi ihe na-eme" ka o kwuru.
O kọwakwara na mmadụ anọ nwụrụ n'ebe ahụ ebe mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.









