King Pele: Nchịkọta ndụ ya n'ime foto

Edson Arantes do Nacimento nke Brazil bụ odogwu na bọọlụ e ji Pele maara weliri anya elu na mgbape emume ngosi "Marks of the King" e mere na Brasilia n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun 2008.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pele so n'otu n'ime ndị akachasị akwanyere ugwu n'ụwa

Nwoke a kpọrọ Edson Arantes do Nascimento anwụọla dịka ọ gbachara afọ 82, mana odogwu n'egwuregwu bụ Pele ka na-adị ndụ.

Na-agbanyeghi na ọ kwụsịrị ịgba bọọlụ na 1977, ndị mba ha na-ahụta nwafọ Brazil a dịka "eze egwuregwu bọọlụ" nke mere e jiri ahụta ya dịka onye dị oke mkpa n'ụwa gbaa gburu gburu.

Foto ndị a kọrọ akụkọ banyere ndụ ya.

Pele mgbe ọ dị afọ 17

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A mụrụ Edson Arantes do Nascimento n'ụbọchị 23 Ọkụtoba 1940 n'obodo Tres Coracoes (Three Hearts) dị n'ọwụwa anyanwụ Brazil. O turu n'ime ụbịam ma rụọ ọtụtụ ọrụ iji nyere ezinaụlọ ya aka. O nweghi ike ịzụta bọọlụ nke aka ya mana o ji akwụkwọ afanyere n'ime akwa mere bọọlụ nke ya. Otu ihe ọkachasị echeta n'oge ahụ bụ mgbe ọ hụrụ ka nna ya na-ebe akwa maka na Uruguay meriri Brazil n'asọmpi Ikpeazụ nke Iko Mbaụwa afọ 1950. Obere nwamadị Edson kwere nkwa na ọ ga-amabute iko a otu ụbọchị ka o mee nna ya obi ụtọ.
Mgbe Pele nyere goolu na-agba abụọ nke ikpeazụ asọmpi Iko Mbaụwa afọ 1958 dị n'etiti ha na ndị France

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pele malitere ịgbara ndị otu Santos FC nke Brazil bọọlụ n'afọ 1956, mgbe ọ dị afọ 15. N'ime afọ abụọ o soro otu egwu bọọlụ Brazil gaa asọmpi Iko Mbaụwa afọ 1958. Na-agbanyeghi na o soghi gbaa asọmpi abụọ mbụ ha, Pele nyere goolu isii iji nyere Brazil aka ịmabute iko ahụ. Ọ bụ onye kachasị obere ga-amabute Iko Mbaụwa.
Pele (aka ekpe) makọrọ Zito na ngwụcha asọmpi ikpeazụ nke Iko Mbụwa afọ 1962

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Brazil jisiri iko a aka ike n'afọ n'Iko Mbaụwa 1962 a gbara na Chile - bụ nke raara ahụ ime n'akụkọ banyere asọmpi iko a. Pele esoghi gbaa asọmpi Brazil na Czechoslovakia maka mmerụ ahụ o nwetere n'agba ne mbụ. Lee dịka ọ na-amakọ ogbo ya n'otu Santos nakwa Brazil bụ Zito na ngwụcha asọmpi.
1px transparent line
Pele bere akwa, ndị ntaakụkọ redio gbara ya gburu gburu mgbe o nyere goolu otu puku ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pele nyere goolu 1,283 n'ihe dịka afọ iri abụọ ọ gbara bọọlụ. O nyere goolu otu puku n'asọmpi Brazil n'ụbọchị 19 Nọvemba afọ 1969 site na penariti. Igwe mmadụ jupụtara na ndị ntaakụkọ gbara ya gburu gburu n'ime ọgbọegwuregwu.
Pele ṅụrụ ọṅụ mgbe ọ mabutere Iko Mbaụwa a gbara na Mexico n'afọ 1970

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe kachasị n'ịgba bọọlụ Pele bụ mgbe o mabutere Iko Mbaụwa nke ugboro atọ na 1970. Ọ bụ asọmpi mbụ a ga-egosi na television bụ nke e gosiri n'agwa zuru oke, ndị Brazil gbapụtara ihe n'uwe asọmpi egwuregwu bọọlụ ha ( A na-ahụta ha dịka otu ka ibe n'egwuregwu bọọlụ kamgbe asọmpi a malitere). Pele bụ naanị ọgba bọọlụ ma nwoke ma nwaanyị ga-amabute Iko Mbaụwa ugboro atọ.
1px transparent line
Mgbe Pele na-agba bọọlụ n'otu New York Cosmos

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, "Eze" kwụsịrị ịgbara mba ya bọọlụ na 197, n'afọ ise na-eso ka ọ kwụsịrị ịgba bọọlụ kpam kpam, mgbe ọ dị afọ 37. E gbochiri ya ịgba bọọlụ na mba Yurope mgbe gọọmentị mba Brazile gbochiri ya ime nke a, nke mere na ọ bụ naanị na mba Brazil ka ọ gbara bọọlụ n'otu Santos FC. Mana mgbe ọ gbachara bọọlụ, ọ nọrọ afọ atọ n'otu New York Cosmos nke asọmpi North America Soccer.
Mgbe Pele na-agbara Brazil bọọlụ mgbe ọ dị afọ 50

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mana Pele ka so na-agba bọọlụ maka enyemaka ndị ụwa na-atụ n'ọnụ. N'afọ 1990, mgbe ọ dị afọ 50, o duuru ndị Brazil gbaa asọmpi enyi na enyi ha na mbaụwa ndị ọzọ n'ọgbọegwuregwu Wembley dị na London.
1px transparent line
Onye mbịarambịa na-ekiri eserese Pele bụ nke Andy Warhol sere, mgbe a na-eme ngosi ya na Los Angeles afọ 2014

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na-agbanyeghi nkwụsị ya n'ịgba bọọlụ, Pele ka bụ onye baara uru n'ụwa na-emetụta ndụ ndị mmadụ. Nwafọ Amerịka na-ese nka bụ Andy Warhol, onye sere Pele kwuru na "Pele so n'otu n'ime ndị gbanwere echiche m, kama ọ ga-enwete nkwanye ugwu nkeji iri na ise, ọ ga-enwete ọtụtụ afọ na nkwanye ugwu."
Pele na Sylvester Stallone oge ha na-eme ihe nkiri "Escape to Victory"

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pele abanyeghi n'ọrụ nchịkọta otu egwu bọọlụ kama ọ nọ na-agagharị ụwa n'ọrụ nkwado dị iche iche. Ọ rụkwara ọrụ na TV nakwa Sinima, tinyekwara ihe nkiri a kpọrọ 'Escape to Victory' n'afọ 1981 bụ nke ya na Sylvester Stallone dị obere mgbe ahụ so mee.
1px transparent line
Pele na Nelson Mandela n'afọ 2007

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O zutere ọtụtụ ndị a ma ama n'ụwa gbaa gburu gburu. Mgbe odogwu Brazil a zutere onye bụbu onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Nelson Mandela n'afọ 2007. "Ikiri ka ọ na-agba bọọlụ dịka aṅụrị ikiri obere nwa nakwa onyinye amara jupụtara na mmadụ," Ihe Mandela kwuru banyere Pele.
Pele na-ebe akwa n'akụkụ ọkọlọtọ Brazil

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ gbara mbọ ịhụ na mba ha haziri asọmpi Olympics nke Rio de Janeiro n'afọ 2016 bụ nke mbụ a ga-eme na mba Saụt Amerịka. Na foto a, Pele bere akwa mgbe otu International Olympic Committee kpebiri na ọ bụ obodo a ga-ahazi asọmpi
1px transparent line
Pele na nwa ya Edinho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pele nwere nsogbu n'ime ezinaụlọ ya, ọ lụrụ ụmụnwaanyị atọ ma mụta ụmụ ise. Odogwu Brazil a kwukwara na o nwere ọtụtụ ndị enyi nwaanyị nke na ọ gaghị agụtanwu ụmụ ndị ọ mụrụ n'ezi. Naanị otu nwa ya bụ Edinho gbara bọọlụ - oche goolu. Mana a tụrụ nga maka ebubo ịtụ mgbere ọgwụike nakwa ego site n'afọ 2005 ruo 2019.
1px transparent line
Pele in a wheelchair as he arrives at Sao Paulo's international airport in September 2019

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnọdụ ahụike Pele malitere kawanye njọ kamgbe afọ 2012, mgbe a wara ya ahụ n'ugwu ya ugboro abụọ ma nwee nsogbu akụrụ. N'afọ 2021, mgbe a na-enyocha ya ahụ, ha hụrụ otito (tumour) n'eriri afọ ya (colon).
Ndị ọgba bọọlụ ji ọkọlọtọ iji gosi nkwado ha nye Pele na ngwụcha asọmpi Iko Mbaụwa FIFA Qatar 2022 n'agba nke mgbapụ nke ha na South Korea.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ahụ esighi ya ike ịga mba Qatar, Pele kiriri asọmpi Iko Mbaụwa Fifa 2022 na TV n'ụlọọgwụ. Otu egwuregwu bọọlụ Brazil gosiri ọkọlọtọ e dere aha ya na foto ya mgbe ha merichara South Korea n'agba mgbapụ na 5 Disemba.