Twitter Ban: Otu ọkaiwu akpụpụla gọọmentị Naịjirịa ụlọikpe maka mmachi Twitter

Aha onyonyo, Twitter Ban: Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed

Otu onye ọkaiwu aha ya bụ Inibehe Effiong akpụpụla Lai Mohammed, Abubakar Malami na Gọọmentị etiti ụlọikpe ukwu dị na Legọs maka ịmachi Twitter.

Effiong sị ma mmachị ahụ megidere ikike dịrị onye dịka e dere ya n'iwu Naijiria nke afọ 1999.

Ọkaiwu Inibehe Effiong kpụpụrụ gọomentị Naịjirịa n'ụlọikpe

Ebe foto si, Inibehe Effiong

Effiong gwara ụlọikpe ka o kpebie na ihe Malami na Mohammed sị na a ga-atụ onye daara iwu mmachi Twitter na okwu na-ezighi ezi makana ọ dịghị n'akwụkwọ iwu Naịjirịa.

Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed

Lai Mohammed bụ Minista na-ahụ mgbasaozi na Naịjrịa akụwarala BBC akụoyibo Nsugbe gbasara mmachị gọọmentị Naijiria machiri Twitter.

O kwuru na Twitter bụ ngwaọrụ otu Ipob na otu ndị ọzọ ji agbasakarị ozi ha.

O kọwakwara ihe Gọọmentị Etiti bu n'uche n'ozi ahụ ha ziputere bụ nke Twitter wepụrụ.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: