Frank Lampard Out: Gịnị mere e ji asị Lampard 'buru ngwongwo gị laa'?

Ebe foto si, Getty Images
Na-erughi otu izu Chelsea kpọpụtara aha Frank Lampard dịka onye nchịkọta ọhụrụ ha, ndị na-akwado otu a ekwuwela ka a chụọ ya n'ọrụ.
Ndị na-akwado ha ekweghi ka ike ya nọrọ ala ọfụma n'oche dịka onye nchịkọta, tupu ha amalite ịkpọku ndị were ya n'ọrụ sị ha sepụ oche ahụ.
Ha bidoro ihe a kpọrọ "#LampardOut" n'elu soshal midia.
Gịnị bụ iwe ha?
Ha na-aba mba na na-emebeghi eme ọ mawala ụkwa dịka onye nchịkọta; nke a si n'onye lawa onye lawa ndị Chelsea na ndị Bohemian dị n'obodo Dublin, Ireland, gbara na "pre-season" ha.
Ebe ụfọdụ kwuru ka e nye ya ohere makana o tebeghi aka ọ batara nchịkọta, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụdịrị ihe a mere ha ji atụ ụjọ maka ọchịchị e nyere ya.
Ndị ọzọ kwuru na maka ụdịrị ike ọ kpaara Chelsea oge ọ na-agba bọọlụ, na ọ gaghị amasị ha ka ọ bata mechuo ihu ya na aha ya.
Mana a maliteka ya n'oge itiwe mkpụ ọpụpụ ya?
Nye ụfọdụ ndị, ọ gbasaghị ha na ọ bụ naanị mkpụrụ ụbọchị isii ka ọ nọrọla n'oche nchịkọta Chelsea tupu ha agbaa bọọlụ ahụ.
Ndị dịka @SgtCrackers kwuru sị ka ọ pụọ ugbua chi ka dị.

Ebe foto si, TWITTER
Otu onye gara mepee akara Twitter ọhụrụ ọ kpọrọ "@LampardOutCFC", ebe ọ nọ kwuo ka a chụọ Lampard ụkwụ eru ala ma kpọghachịta Jose Mourinho chịkọburu Chelsea.

Ebe foto si, Twitter
@charlesomolo15 kwuru sị ndị mmadụ kwụsịkwa ịkpa "agwa ọjọo" a.

Ebe foto si, Twitter
@adesanyadarking dere sị na ọ gbagwojuru ya anya na ndị mmadụ ga na-achọ ka a chụọ Lampard.

Ebe foto si, Twitter
Kedụ ụdịrị egwuregwu na-amasị gị?









