World Cup 2018: 'Messi agaghị achịta aja taa'
Dịka Naịjirịa na Ajentina nwere asọmpi taa iji mara ndị ga-agafe agba nke mbụ n'asọmpi Iko Mbaụwa, ndị Naịjirịa egosila nkwado ha n'ebe Naịjirịa nọ.
BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ, ha kwuru na ọ bụ Naịjirịa ga-atụrụ ugo n'asọmpị nke ga-adị taa.
Otu onye kwuru na Messi ga-ada taa n'agbanyeghị na ọ hụrụ ya n'anya nke ukwu, maka na ọ chọrọ ka mba ya bụ Naịjirịa gafee agba nke abụọ.