You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Olileanya Moroko agwụla ka Pọtugal merichara ha
Cristiano Ronaldo nyere goolu mere ka ndị Pọtugal merie ma kwudosie ike n'ịgafe agba mgbapụ.
Olileanya Moroko na ha nwere ike inweta pọịntị ga-eme ka obi kaa ha ịbanye agba mgbapụ bere na mwute maka na Pọtugal meriri ha.
Mmeri Pọtugal mere ka ha nọrọ n'ọkwa mbụ n'otu B nke Iko Mbaụwa, rue mgbe Spen na Iran ga-agba taa.
Mana Moroko apụọla n'asọmpi a n'agbanyeghị na ha ka ga-ezute Spen.
Ha gbara n'ọgbọ egwuregwu nke Luzhniki na mba Rọshịa.
Cristiano Ronaldo nyere goolu mere ka Pọtugal gbapụ Moroko, n'ime nkeji anọ.
Goolu a Ronaldo nyere Moroko emeela ka ọ bụrụ onye kachasị nye goolu na mpaghara Yurop n'ụwatụwa.
Ndị Moroko nwara ike ha ịsata goolu e nyere ha, mana ike ha niile enweghị ihe ọ pụtara n'ihu poostu.
Ha abụrụla ndị mbụ ga-ala n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018.
Pọtugal ga-agbazi anya n'egwuregwu ha na Iran ga-agba, mana ha ga-eke nkwụcha ma ọ bụrụ na ha chọrọ imeri.