Africa Eye: Etu e si ebo ndị agadị ebubo amosu iji napụ ha ala ha

Aha onyonyo, Africa Eye: Lee ndị okenye e boro ebubo amosu ma gbuo iji napụ ha ala ha

N'ụfọdụ agbụrụ, ndịo okenye bụ ndị a na-asọpụrụ ma na-akwanye ugwu.

Mana dịka BBC Africa Eye si nyochaputa ọ dịghị etu ahụ n'ụfọdụ ebe na mba Kenya ebe ndị ntọrọbịa na-ebo ndị okenye ebubo amosu iji wakpo maọbụ gbuo ha.

Otu nwoke aha ya bụ Tambala Jefwa awakporo ugboro abụọ kọwara na n'uche ya, ọ bụ maka iji napụ ya ala ya ka ndị ahụ ji boo ya ebubo ahụ ma wakpoo ya ugboro abụọ.

Jefwa sị "ọbara di egwu si m n'ahụ pụọ, ndị ahụ hapụrụ m ebe ahụ chekwa na m ga-anwụ"

Nwunye ya gosiri etu e si maa ya mma ma sụkpọ kwa ya otu anya. Ịnwe nkwenye n'amọsụ abụghị ihe ọhụrụ na mpaghara ala Afrịka.

Mana BBC chọpụtara na o nweziri ndị gbadoro ụkwụ na nkwenye ahụ iji megbu ma gbuo ndị okenye ha ọ kachasị n'ụfọdụ ebe na mba Kenya, Malawi, Tanzania nakwa Saut Afrịka.

Gee ihe ha chọpụtara n'uju ebe a.