You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Egbe eluigwe gbara anyị n'ime ahịa oge anyị na-ezere mmiri n'okpuru osisi'
Ụfọdụ ndị so na ndị egbe eluigwe gbara n'Obidi Agwa dị n'okpuruọchịchị Oguta n'Imo steeti nke gburu mmadụ atọ akọwaala ihe anya ha hụrụ n'oge ihe a mere.
Otu n'ime ndị ọnọdụ ahụ metụtara bụ Nwakaego Napoleon Eric.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara n'obodo ahụ iji chọpụta ka ya bụ ihe siri mee, Nwakaego Napoleon kọọrọ ya na egbe eluigwe ahụ gbara oge obere mmiri na-ezo n'ụbọchị Tuzde 8 Eprel, 2025.
Ọ kọwara na ọ bụ n'ahịa Uzhi bụ ebe a na-ere akpụ ka ihe ọdachi ahụ mere.
"E rechaala m akpụ m bu bịa ahịa chọọ ka m lawa tupu otu nwaanyị zụrụ m ahịa akpọghachi m azụ ka m bịa were ego ahịa ọ zụrụ m. Oge ahụ obere mmiri na-ezo".
"Dịka m tụgharịrị ka m nara ya ego, egbe eluigwe agbaa, gbatuo ọtụtụ mmadụ, gbaa uwe m ọkụ ma mee ka m tapara otu ebe," ka nwaanyị ahụ kọọrọ anyị.
O kwuru na ọ bụ site n'enyemaaka ndị obodo ka e jiri bupụta ya ebe ahụ dịka ọ rịọrọ gọọmenti Imo steeti ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka.
Onye ọzọ nwetara mmerụahụ n'ihi ọdachi ahụ bụ obere nwata nwoke gbara afọ itoolu.
Nne ya bụ Nkechinyere Ughala sịrị na ya dunyere nwa ya ahụ ka ọ zụtaara ya ụfọdụ ihe n'ahịa mana ka obere oge gara, ọ natara ozi na nwa ya so na ndị egbe eluigwe gbara.
Onye President General ndị obodo Obidi Agwa bụ Chief V.C. Eke kwuru na kemgbe nne na nna ya mụrụ ya, udiri ihe ahụ emebeghị n'obodo ha.
Ọ kọwara na mmadụ atọ nwụrụ ozugbo egbe eluigwe ahụ gbara ha ebe mmadụ ise ndị nke ọzọ merụrụ ahụ.
Chief Eke kpọkuru gọọmenti Imo steeti ka ọ zọbata ụkwụ nyere mmadụ ndị ahụ merụrụ ahụ aka tinyere ezinaụlọ ndị nke nwụrụ anwụ.
Ihe anyị ma maka egbe eluigwe gbagburu mmadụ atọ n'ahịa dị n'Imo steeti
Egbe eluigwe agbagbuola mmadụ atọ ma merụọ mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ n'okpuruọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.
Njinji ahụ jiri n'ụbọchị Tuzde 8 Eprel 2025 n'ahịa Ezi Uzhi dị nobodo a kpọrọ Obidi Agwa.
Oge anyị kpọtụụrụ otu onye obodo ahụ, ọ gwara anyị na akụkọ ahụ bụ eziokwu.
Ọ sịrị na egbe eluigwe ahụ gburu mmadụ atọ ma tinye mmadụ anọ ndị ọzọ n'ọnọdụ "ọdị ndụ ọnwụ ka mma."
O kwuru na nke a mere mgbe obere mmiri malitere izo dịka ndị mmadụ na-ere ma na-azụ ihe n'ahịa Ezi Uzhi ahụ.
Egbe eluigwe na amụma gbara ma gbatuo mmadụ asaa, nke mmadụ atọ n'ime ha nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ.
Otu ihe onyonyo a hụrụ na-efegharị na soshal midịa gosiri ka otu nwoke na-eti mkpu na egbe eluigwe agbaala mmadụ asaa n'ahịa ahụ.
Dịka o siri kọwaa, ọ bụ oge mmiri na-ezo ka ihe ọdachi ahụ mere.