You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Paralympic 2024: Shaun Anderson ji otu aka agba nta na etu egwuregwu si zọọ ya
- Onye dere ya, Eshlin Vedan
- Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa
- Ebeg o si, Pretoria, South Africa
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Shaun Anderson kọwara egwuregwu ya dịka ihe "zọrọ ndu ya" ka ọ na-akwado ịga Paralympic ka o wechera ihe mberede okporoụzọ abụọ ma nwekwaa mmụọ ịdamba.
N'afọ 2004 ka e bepuru ụkwụ aka-ekpe nweoke ahụ bụ onye mba Saụt Afrịka ka o jechara anyịya-igwe wee ihe mgberede.
N'afọ 2017 ka o mechara otu afọ ọ gachara Rio de Janeiro Paralympic, azụ ezinaụlọ ya gara ịkụta mechere bụrụzịa ihe ịgba anya mmịrị oge ụgbọmmịrị ha kpuru.
Anderson tọrọ n'okpuru ụgbọmmịrị ahụ.
"A nọ m n'okpuru ụgbọmmịrị ihe ruru njeki anọ na ọkara. Echetaghị m ihe ọzọ mana ihe ọzọ m maara bụ na m tetara hụ n'ụkwụ m kpọwụrụ akpọwụ"
Nke a mere na Anderson nwere nkwarụ sita n'ukwu ya gbadaa.
"A gara m Rio Paralympics, na-akwụ ọtọ, na-aga ije ma na otu afọ n'ihu, ị bụrụ onye nwere nkwarụ nọ n'oche"
"Etinyebeghị m isi na mmịrị kemgbe m nwechara ihe mgberede ahụ. Kemgbe ahụ abanyịbeghị n'ụgbọmmịrị ọzọ. Mmịrị adịghị amasị m.
Egwuregwu a azọọla m ndụ
Ọ bụ ka o wechara ihe mgbere abụọ ahụ ka Anderson nwere mmasị n'ịgba ụta nakwa ịma ube.
Nwoke ahụ dị afọ 51 kwuru sị "nwa m nwoke chọrọ ime egwuregwu ịgba ụta".
"Anyi gara ebe a na-ere ụta ga zụta ya na ube, nwa m nwoke gbara ya tupuu mụ asị ha na 'm chọrọ ịgba ụta, mana ha sịrị na m ama mgbawu ya".
"Adaghị ekweta na e were ihe m agaghị emewu".
"N'ikpeazụ, achọpụtara etu m ga-esi gba ụta, ihe ndị ọzọ abụrụzịa akụkọ"
N'ime ọnwa isii ka ọ wetara mmerị nke mbụ na-egwuregwu ịgba ụta nke ndị Saụt Afrịka International field Archery association hazịrị.
"Oge ọ bụla mmadụ gwara m na m ama mmewu ihe ọbụla, m na agba mbọ me ka onye ahụ mara na ya dara ya".
"A na m eme ọfụma na egwuregwu, Egwuregwu na-amasị m. Egwuregwu na-azọ m ndụ".
N'afọ ise ọzọ, Anderson gara Rio 2016 soro ụmụnwoke na-agba ụta. Ha nwereike ụkwụọtọ, ma ọ bụ nọrọ n'oche ndị ọrụsị.
N'agbanyeghị na ọ pụrụ ya n'agba nke 32 n'olympiik ahụ, o jị obị anụrị laa maka ịsọ na egwuriegwu ahụ.
"Ọ napụrụ m na ezinaụlọ nnukwu ihe tupuu m abịa ebe a, ọkachasị ego".
Mana mbọ niile Anderson gbara ịbịa Rio akalaabụ ihe efu maka na ọ dara n'ọrịa ndị bekee kpọrọ "burst colon" oge ọ na-achọ ịbịa Rio. Ọrịa sitere n'ọgwụ ọ na-aṅụ kemgbe o jị ọgbatụmtụm nwe ihe mgberede.
Ihe mgbawa obi ọzọ mere ya bụ oge Covid gburu nna ya n'ihe dịka ịzụ ụka oge ọ na-aga egwuregwu Paralympics nke e mere na Tokyo.
Anderson obi tiwara knuru na "nke a tinyere n'akpụ, maka na m chọrọ i wetara ya mmeri"
Ọ dị m ka m abaghịzị uru ọbụla
Ọ bụ oge e meriri ya n'asọmpị nke mbụ ọ gbara n'isi obodo Japan ka mmụọ ịdamba Anderson jiri kawanye njọ.
O kwuru na ndị na-eme egwuregwu na-edobe ahụ gwamgbe ka ha enweghị nsogbu ma mgbe ha nwere ezigbo mmụọ ịdamba.
"Ndị mmadụ na ahụ gị ka onye na-eme egwuregwu ma na-asị n'ihe diala gị mma, na ihe niile diala gị mma".
"Ọ dị m ka ọ na m abaghị uru ọbụla, ka m enweghịzị isi na mmadụ"
"Ọ dị m ka m abụzị ihe mgbanwa obi dịala azịnaụlọ m. Eziokwu ọ dị m ka m gbuo onwe m".
Mana ezigbo enyemaka gbara Anderson gburugburu nyere aka zọpụta ya.
"Achọpụtara m na m hụrụ ndụ n'anya ma hụ ezinaụlọ n'anya nke ukwuu"
"Akwụsịrị m oge m chọpụtara na m kwesiri ka enyere ma aka. enyemuaka ahụ bịakwara".
"Ndụmọdụ m na-agwa onye ọbụla bụ ka "ha hara ịtụ egwu oge ha nwere nsogbu"
"Ihe a bụ ihe ga-adị n'ime oge niile".
"Enwere m ndị ezigbo mmadụ na-eche maka ihe dị mma gba onwe m gburugburu, na-eche ezigbo ihe oge niile. E kachapuru ajọ echiche niile. Oge ọbụla obi adịghị mma, a na m agwa ezịnaụlọ m"
E wepuru m ọkụ latrịk
Anderson na-akwado ịga Paralympiik nke atọ, ọ nọ na-ebe ọ na-azụ anụmanụ dịka atụrụ, ezi na ọkụkọ bụ ebe ọ nọ nwere na nwere akwado n'Pretoria.
maka nsogbu ọkụ latrịk na mba Saụt Afrịka bụ ihe na-eme kemgbe afọ atọ ugbua nke mere na-oge ụfọdụ ha a ma nwe ọkụ, Anderson wepuru ọkụ latrịk na be ya ma tinye Sola.
"Sola ka m nọ ugbua"
"A na m akọ akwụkwọ nrị. Ewere mkpụrụ osisi dị icheiche. Anyị na-akọta ọtụtụ ihe anyị na-eri"
Na Paris ka o so na asọmpị nkw W! maka ndị nwere nkwarụ site na-elu rụọ n'ala etiti ahụ ha.
Ọ na-eji ọnụ ya nwere nyere onwe ya aka ịgba ụta.
O kwuru na ndị na-ekiri egwuregwu ndị nwere nkwarụ anaghị ama na ọ bụ akọnuche ka ha jị asọmpị, ma kwukwaa na ya onwe ya amaghị ihe ndịa ruo na ya ebido ịnọ n'oche nkwarụ.
"Amabụghị ihe ndị nwere nkwarụ sị mba ọzọ na-ahụ oge niile ha tetara ụra n'ụtụtụ ka ha kulie, rịe nrị ma pụta ịgba ụta"
"O were ọtụtụ ihe dị icheiche m na-eme ụtụtụ niile. M kulie, ngaa mposi, nyụọ amịrị"
"Enwere nwata nwoke na-enyere m aka enwete ụta m o ge niile"
"Ebe a na-agba ụta ọ rụpụtara na be ya bụzị ebe a na-akụzịrị ndị mmadụ etu e si agba ụta. Ọzọ bụ na Anderson azụpụtara onye nwekwara nkwarụ bụ Philip Coates-Palgrave soyere ya ga asọmpị ịgba ụta na Tokyo".
"Ebum n'obi m bụ ka ndị na-etoeto na-agba ụta tọzuo iga egwuregwu nke mba ụwa".
"Na ọ dị n'ịrụ m ga-achọ ịkụzịrị ndị nwere nkwarụ na-agba ụta".
"Dịka onye na-ekpere kraịst, o kwuru kedu "ka o si bụrụ m were ihe mgberede ugboro abụọ", mana ọ hụghị onwe ya dịka onye a bụrụ ọnụ.
"Ekwetara m na ihe niile mere nwere ihe kpatara o ji mee"
"Adịghị m ama ihe kpatara ya ma ọ bụ ihe chukwu bu n'obi maka m"
"Mana ọ bụrụ na ndị mmadụ ga-ejiri ihe mere m mụta n'ihe, ọkachasị ihe niile m meputara na-agbanyịghị ọnọdụ m na ihe iche aka mgba mere m, ya bụ na m mere ọfụma.