Ihe mere otu NLC ji eme ngagharịiwe n'obodo dị iche iche na Naịjirịa

Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) a malitela ime ngagharịiwe n'obodo dị iche iche na Naịjirịa.
Ha gara n'ihi ime nke a na-agbanyeghi nzukọ ndịisi ha na Onyeisiala Bola Tinubu nwere n'obi ọchịchị dị n'Abuja n'abalị Tuzde 16 Disemba.
Dịka nzukọ ahụ gwụrụ, a jụrụ onyeisi ha bụ Joe Ajaero ma ngagharịiwe ahụ ọ ga-aga n'ihu, o kwuru na ọ gaghị a sị na ọ gaghị aga n'ihu maka na ọ bụghị naanị ya bụ onyendu otu a.

"Aga m agwa unu, maka na nke a bụghị otu ofu onye bụ onyendu, Anyị ga-aga tulee ihe onyeisiala Tinubu gwara anyị ma si ebe ahụ mara ihe anyị ga-eme.
Mana e ruru n'ụtụtụ Wenezde 17 Disemba, ọtụtụ ndị otu a malitere ịgbakọta n'isi ụlọọrụ ha dị n'obodo dị iche iche maka ime ngagharịiwe ahụ.
Ndị ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'ụfọdụ obodo ndị a iji hụụ ka ngagharịiwe a si aga.
Gịnị bụ iwe otu NLC ha ji eme ngagharịiwe?

Ihe bụ isiokwu mere otu NLC ji eme ngagharịiwe a bụ maka ọnọdụ enweghi nchekwa na-arị ibe ya elu na Naịjirịa ugbua.
Ajaero kwuru na ngagharịiwe a ga-eme ka gọọmenti teta n'ụra ma buo agha megide enweghi nchekwa nke na-emetụta mmadụ niile ma onye ukwu ma onye nta.
O kwuru na ndị ekperima nakwa mpụ ndị ọzọ a na-eme na Naịjirịa bụ ihe ọgbara ọhụrụ n'omenala na-achịkwa Naịjirịa na e kwesịrị ịgbakọta aka ọnụ ma katọọ ya ma kwuo na ọ bụ akụkọ ọjọọ megide obodo.
O kwuru na e nweghi nchekwa a na-emebi akụnaụba obodo ma na-akpagbu ohere Naịjirịa nwere ịnabata ndị na-abịa azụ ahịa si ofesi ma n'ụlọ.
Ndị otu a nọọrọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba kwuo na ha ga-eme ngagharịiwe n'onodo niile megide ọnọdụ enweghi ezi nchekwa.
Ha katọrọ ntọrị a na-atọrị ụmụakwụkwọ ma ogbugbu a na-egbu ụfọdụ ndị nkuzi na ndị nlekọta ha.

N'Ebonyi Steeti, ndị otu a gbakọtara n'amaegwuregwu 'Pa-Ngele Oruta' dị n'Abakaliki bụ ebe ha nọ malite ime ngagharịiwe iwe.
Onyeisi ya na steeti ahụ bụ Ọkammụta Ogugua Egwu kwara arịrị maka ọnọdụ nchekwa si dị njọ na Naịjirịa.
N'Abuja bụ isiobodo Naịjirịa, ndị otu gbakọtara n'isiụlọọrụ ha ma mee ngagharịiwe iji gosi iwe ha banyere ọnọdụ nchekwa na-agbanyeghi mkparịtaụka ndịisi ha gọọmenti etiti na-enwe ugbua.
Osote odeakwụkwọ NLC bụ Ismail Bello bụ onye duu ndị otu ha mee ngagharịiwe n'Abuja, dịka otu ahụ kwụụ ya n'azụ.
N'otu aka ahụ ndị otu a gbakọtara n'Enugwu steetị n'isiụlọọrụ ha bụ ebe ha malitere ime ngagharịiwe ha.









