Timothy Ofoegbu: Ndị nile zọọrọ anyị nnwereonwe tinyere ala Igbo na nnukwu nsogbu

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Onye dere ya, Anthony Okwudei
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Otu nwaafọ ọnụ na-eru n'okwu ma bụrụ onye mgbazi (life coach) bụ Timothy Ofoegbu ekwuola na ndị zọtarala ndị Igbo nnwereonwe tinyere Igbo na nnukwu nsogbu karịrị ha, nke ha na-eti mkpu ya.
Ofoegbu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a.
Ọ rụtụrụ aka ihe ndị fuorola ndị Ọwụwa Anyanwụ n'ihi iti mkpu nnwereonwe.
"Anyị na-eme ọfụma n'agbata afọ 1960, Igbo nọ n'elu, a na-eghu anyị anyaọkụ."
"E bidohala nnwereonwe a, ihe nile anyị nwere lamila. Anyị bidokwa n'isi."
Cheta na Ojukwu duru ndị Ọwụwa Anyanwụ na nnwereonwe Biafra nke mbụ, n'afọ 1967 rue afọ 1970 bụ oge a lụrụ Agha Biafra.
O rue n'agbata afọ 1990s, Ralph Uwazuruike, mee nke ya nke ọ gaara mkpọrọ n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo, ebe Nnamdi Kanu malitere nke ya n'agbata afọ 2000 mara nọrọ na mkpọrọ Sokoto ugbua dịka a tụrụ ya nga mkpụrụ ọka .
Ofoegbu, onye ji mba Singapore maa atụ, kpọrọ ndị Ọwụwa-Anya si ụzọ nkwalite akụnaụba chọwa nnwereonwe, ma hapụ tigbuo-zọgbuo.
Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo:



