Lee ndị na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'otu pati dị ịche ịche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Ebe foto si, Frank Nweke II, Alex Otti na Obinna Ogba
Ọtụtụ pati steeti ahọpụtala ndị ga-azọrọ ha ọkwa gọvanọ na osote ya na ntuliaka 2023 dịka ha merela ntuliaka imeụlọ pati ha.
Chọpụta nke steeti gi na pati ha:
N'Enugwu Steeti
PDP: Gọvanọ: Ọkaiwu Peter Ndubuisi Mba
Bar. Peter Ndubisi Mba bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye Owoh dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti.
Mba nwe ụlọọrụ Pinnacle Oil and Gas nke na-ere mmanụ agbịdị.
Ya bụ nwaamadị bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu, n'ihi na o jibuola ọkwa dịka kọmishọna na-ahụ maka ego n'Enugwu ya nakwa "Chief of Staff" n'okpuru Gọvanọ Chimaroke Nnamani.
Ụlọọrụ ya bụ Pinnacle nwere ngalaba dị iche iche na Naijiria.
Osote Gọvanọ: Ọkaiwu Ifeanyi Ossai
Bar Ossai bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa otu na ndị welitere isi na pati PDP n'Enugwu.
Ossai bụ onye Nsukka dị n' Enugwu steeti.
APC: Gọvanọ: Chief Uche Nnaji

Ebe foto si, Uche Nnaji
Uche Nnaji bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu steeti.
O jibuola ọkwa dịka kọmishọna n'Enugwu.
Uche Nnaji nwe ụlọọrụ a kpọrọ 'Ouch Concepts Limited' ma bụrụ onye Nkanu dị n'Enugwu steeti.
Osote Gọvanọ: Ọkaiwu George Tagbo Ogara
Ọkaiwu Ogara bụ onye Unadụ nke dị na okpuru ọchịchị Igboeze-South n'Enugwu steeti.
Ọ bụ okaiwu ma bụrụkwa onye ojiegoachụegọ.
Ogara azọọla ọkwa gọvanọ Enugwu n'oge gara aga.
Labour Party: Chijioke Edoga
Chijioke Edoga bụ onye Nsukka dị n'Enuguwu steeti. Ọ nọọla mbụ n'ụlọ omeiwu nta n'okpuru pati PDP.
Ọ bụkwara kọmishọna na-ahụ maka gburu gburu idi mma, tupu ọ gawa Labour Party maka ịzọ ọkwa Gọvanọ.
APGA: Gọvanọ: Frank Nweke

Ebe foto si, Frank Nweke
Frank Nweke II bụ naanị onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ọwụwa Anyanwụ ji nwaanyị mere osote ya.
Nweke bụ onye Ozalla Nkanu n'Enugwu Steeti.
Ọ bụbụ minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijiria n'oge Onyeisiala Olusegun Obasanjo na-achị.
Aha ụlọọrụ ya bụ 'Stellar Constellation Group'.
Osote Gọvanọ: Edith Ngozi Ugwuanyi
Ọ bụ onye Amachara Ovoko Igbo Eze south LGA. Ọ bụ onye ọrụ ahụ ike Nọọsụ ma bụrụkwa ọkammụta n'ebe ndị ọzọ.
Ọ zọọlarịị ọkwa onye isi okpuru ọchịchị Igboeze South ugboro abụọ n'oge gara aga. O nwekwara ọtụtụ otu na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị na ụmụaka nakwa nke na-agbatara ndị ọnweghị ka ọ ha ha ọsọ enyemaka.
N'Abia Steeti

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
PDP: Govanọ: Professor Uche Ikonne
Bụ ọkammụta n'Optometry', jibu ọkwa Vice Chancellor nke Abia state University, ma bụkwara Rector nke Abia steeti Polytechnic.
Ọ bụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị doro anya.
Ikonne bụ onye Isiala-Ngwa North dị n'Abia Steeti.
Osote Gọvanọ: Okey Igwe
Onye ọrụ agha nke mba Amerika lara ezumike nka. Ọ bụkwa okaiwu, ma bụrụkwa onye isi oche okpuru ọchịchị Umunneochi n'oge gara aga.
APC: Gọvanọ: Ikechi Emenike
Nwe ụlọọrụ a na-akpọ DER limited nke na-ahụ maka iji ego akpata ego. Ọ bụ onye Ohụhụ Abia steeti ma bụrụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
APGA: Ọkammụta Greg Ibe
Ọ bụ Okammuta ukwu ma bụrụkwa onye nwe Mahadum Gregory University Uturu Abia steeti.
Ọkammụta Ibe bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye jị ego akpata ego n'ebe ọ dị ukwuu.
Osote Gọvanọ: Obinna Ichita
Obinna Ichita bụ onye na-anọchite anya Aba South n'Ụlọomeiwu Abia steeti.
Labour Party: Govanọ: Alex Otti
Onye ọrụ mgbakọ ego na akụnaụba a ma ama.
Nwa oge gara aga, Otti bụ onyeisi ụlọ ọba ego 'Diamond Bank'.
Ọ zọọla ọkwa gọvanọ Abia steeti ọtụtụ oge tupu ọ banye Labour Pati.
Ebonyi steeti

Ebe foto si, Obinna Ogba
PDP: Gọvanọ: Sinetọ Obinna Ogba
Bụ sinetọ na-anọchite anya Ebonyi Central n'ụlọ omeiwu nnukwu bụ sineeti.
Ọ rụọla dịka kọmishọna na-ahụ maka egwuregwu n'Ebonyi steeti.
Osote: Maazị Oliver Osi
Bụ onye na-anọchịte anya Ivo north n'ụlọomeiwu steeti nke Ebonyi.
APC : Govanọ: Hon Francis Nwifuri
Bụ onye a ma ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti.
Nwaifuru ejiela ọkwa onyeisi ụlọomeiwu n'ụlọomeiwu nke Ebonyi steeti ugboro abụọ. O bụ onye okpuru ọchịchị Izzi west nke Ebonyi steeti.
APGA: Gọvanọ: Ọkammuta Benard Odoh
Benard Odohbụ ọkammụta na 'GeoPhysics'. O jibuola ọkwa dịka odeakwụkwọ nke gọọmenti Ebonyi nakwa ọkwa dị iche iche ndị ọzọ.
Labour Party: Gọvanọ: Edward Nkwagu
Edward Nkwagu nwe ụlọọrụ a na-akpọ Edon Nigeria Limited. Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye ọrụ 'Engineering'.
Ọtụtụ pati na steeti dị ka Ebonyi na Abia ka nọ na kata kata ugbua n'ihi nkewa nke Bekee kpọrọ 'faction' na-etisasi udo na pati ha.
Ihe nke a pụtara bụ na ụfọdụ steeti nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ka nọ n'ụlọikpe na-ekwu na ọ bụ ha nwetara mmeri.









