Etu ndị ọrụ n'Imo Steeti si nabata mbuli ụgwọọnwa ha nke gọọmenti kwupụtara
Ndị ọrụ n'Imo Steeti akọwaala ekwuola ebumnobi ha banyere mkpebi Gọọmenti n'ibuli ụgwọọnwa ha.
Gọvanọ Hope Uzodimma nke steeti ahụ, mgbe ọ na-achọ ịmalite ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe puku naịra iri asaa (N70,000) kwuru na o buliela ụgwọọnwa ndị ọrụ bekee na steeti ahụ malite n'ọnwa Ọgọst afọ 2025.
O kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị ndu otu jikọtara ndị ọrụ nwere n'isiụlọọrụ gọọmenti dị n'Owerri na Tuzde 26 Ọgọst, 2025.
Ụfọdụ ndị ọrụ a gwara BBC Igbo okwu, kọwara ha na-atụ anya ka nkwupụta a bịa na mmezu.
Otu onye ọrụ bụ Maazị Igniaus kwuru na ọ nabatara mbuli ụgwọọnwa a ma ọ bụrụ na ha ga-akwụ ya n'ezie dịka Gọvanọ si kwuo.
Otu nwaanyị bụ Oriakụ Ifesinachi Dimoji gosiri nnukwu aṅụrị maka akụkọ a, ma kwuo na ọ bụ ihe dị mma ọkachasị ugbua ihe siri ike.
Nwoke ọzọ bụ Maazị Nzeocha Simeon kwuru na gọọmenti gara aga nyere ndị ọrụ ụfọdụ ego mgbakwụnye ma rịọ ka gọọmenti na-achị ugbua kwụọ ndị ọrụ Imo etu ahụ.
Otu nwaanyị ọzọ bụ Oriakụ Opara Justin sị na nkwupụta ahụ bịara n'oge dị mma mgbe ndị ọrụ chọsiri ya ike ma kpee ekpere ka ọ bịa na mmezu.
Ego ole bụ ụgwọọnwa ndị ọrụ na mbụ nakwa nke ọhụrụ

Ozi si n'aka ụlọọrụ mgbasaozi gọọmenti Imo Steeti bụ 'Imo State New Media' kwuru na e buliri ụgwọọnwa opekatampe ka ọ bụrụzie otu narị puku naịra na puku anọ (N104,000).
Ozi ahụ kwuru na ụgwọọnwa e ji anabata ndị nkuzi mahadum n'ogogo mbụ bụ narị puku naịra abụọ na puku iri abụọ na abụọ (N222,000).
Akụkọ kwuru na e bulikwara ụgwọọnwa opekatampe ndị dọkịnta na-arụ ọrụ na steeti ha site na narị puku naịra abụọ na puku iri na ise (N215,000) gawa na narị puku naịra ise na puku atọ (N503,000).
Gọvanọ Uzodimma kwere nkwa ịkwụ ndị lara ezumike nka ego nkwụsị ọrụ ha a kpọro 'gratuity' malite na Wednezde 27 Ọgọst, 2025.
Mana ndị ọrụ kwuru na o dobeghi anya ego ole ga-abụ ụgwọọnwa ha kpọmkwem ruo mgbe a ga-akwụ ha ụgwọọnwa nke Ọgọst n'izuụka nke mbụ n'ọnwa Sepụtemba.
Gịnị mere e jiri bulie ụgwọọnwa?

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Gọvanọ Uzodimma kwuru na kamgbe gọọmenti ya weere ọchịchị na 2020, na ndị ọrụ bekee ataala ahụhụ n'ihi enweghi nchekwa, ọrịa Covid-19, nsogbu akụnaụba n'ihi iwu nwogharị nakwa mwepu ego enyemaka mmanụ ụgbọala.
Na ọ bụ n'ihi nke a mere gọọmenti ya jiri kpebie ibuli ugwọọnwa ndị ọrụ Bekee.
"A kwụọ ndị ọrụ ezigbo ụgwọ, nrụpụta ga-arị elu, obi ga-adị ndị ezinaụlọ mma, akụnaụba obodo ga-etokwa.
"Nke a bụ ụzọ anyị nwere ike iji ewulite ndụ ndị Imo Steeti. Gọọmenti kwenyere n'iwulite ọnọdụ azụmaahịa na akụnaụba, ịhụ na ọnọdụ ndị ọrụ Bekee dị mma."
O kwukwara na ọ chọrọ ka ndị ọrụ Bekee na gọọmenti Imo Steeti na-enwe ezi mmekọrịta nke ga-ebute ọganihu steeti.
Ihe ọzọ bụ na ego mkpata gọọmenti agbagoola elu site na nde narị naịra anọ (N400m) ruo ijeri naịra atọ (N3bn).
O kwuru na ego Imo steeti na-eketa n'aka gọọmenti etiti nọbu na-agba ijeri naịra ise na ijeri naịra asaa (N5-7bn) n'afọ 2020 agbagoola elu ruo ijeri naịra iri na anọ (N14bn) ugbua.



