You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Owo: Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ ndị e jidere maka ebubo igbu igwe mmadụ n'ụlọụka Katọlik n'Ondo Steeti
Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọikpe dị elu n'Abuja ajụla arịrịọ inye mmadụ ise ịtọhapụ beelụ bụ ndị e jidere maka ebubo igbu igwe mmadụ n'ụlọ ụka St. Francis, dị n'Owo, Ondo steeti.
Ọkaikpe rụtụrụ aka n'ebe na-eri mperi n'arịrịọ ọkaiwu ndị ahụ a na-enyo enyo na ha gburu igwe mmadụ na-arịọ ụlọikpe.
Ọ sị na ọ bụ naanị onye nke mbụ n'ime mmadụ ise ahụ a na-enyo enyo ka e dere aha ya n'akwụkwọ arịrịọ ha na-arịọ ụlọikpe mana aha ndị nke ọzọ apụtaghị nke ọma n'akwụkwọ ahụ.
"Dịka akwụkwọ arịrịọ ahụ si dị, ọ bụ mmadụ ise ahụ jikọrọ aka ọnụ na-arịọ ụlọikpe ka atọhapụ ha, mana ekwesiri ka ha niile nnụọ iyi icheiche".
Ọkaikpe Nwite rụtụrụ aka n'ebe ọkaiwu na-ekpe ndị ahụ ikpe kwuru na ndị nọọrọ mmadụ ise ahụ ka ndị akaebe bụ mmadụ a na-enyo enyo na ha na ndị na-enyi ọha egwu na mba ofesi na-emekọ.
Mana ọkaiwu na-anọchịtaanya ha enweghị ihe o kwuru maka nke ahụ.
"Anụla m ihe niile onye ọbụla kwuru ma tulee okwu a nke ọma, ọ dị m ka ndị a na-enyoneyo a nwere azịza ha ga-aza banyere mpụ. Nke a mere m ji ajụ arịrịọ ịtọhapụ ha. Mana m ga-ekpe ikpe a ngwa ngwa".
"Anyị ga-enyighalị ikpe ọzọ n'Ọktoba 16, 2025".
Ụlọikpe kwuru ka e chekwaa ndị akaebe
Ọkaikpe Emeka Nwite nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja anabatala arịrịọ ka e chekwaa ndị akaebe na-agba ama n'ikpe iyi ndụ egwu gbasara mwakpo e mere n'Owo dị n'Ondo steeti n'afọ 2022.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Ọkaiwu na-ekpe ndị e boro ebubo ikpe bụ Calistus S. Eze gwara ụlọikpe na e nwere akwụkwọ dị n'ihu ụlọikpe ahụ e webatara n'abalị 14 Ọgọst.
O kwuru na akwụkwọ ahụ gbasoro mpaghara 73(1,2,3,4) nke iwu na-egbochi iyi ndụ egwu, ma rịọ ka ụlọikpe ahụ kpuchite ma chekwaa ndị akaebe.
Ọkaiwu ahụ gara n'ihu mee ka ụlọikpe mata, na ndị ọ na-ekwuchitere chọrọ ịgbanwe Ọkaiwu na-ekwuchitere ha, ma kwuo na nke ahụ nọ n'ihu Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa.
Ha rịọziri ụlọikpe ka o yigharịa ikpe ahụ n'ime otu ọnwa iji nye Ọkaiwu ọhụrụ ezigbo oge ịkwado maka ikpe ahụ.
Ọkaiwu ndị e boro ebubo bụ Abdullahi A. Mohammad agbaghị ụkwụ megide arịrịọ ndị ahụ, kama ọ gwara ụlọikpe na ya gbara akwụkwọ n'ụbọchị 11 Ọgọst iji nye ndị ọ na-ekwuchitere ntọhapụ beelụ.
O kwuru na ndị ahụ e boro ebubo anọọla afọ atọ n'ụlọmkpọrọ, dịka e gbochiri ndị ezinaụlọ ha ileta ha, bụkwanụ nke megidere iwu ụlọikpe nyere n'ụbọchị 11 Ọgọst.
Ka e mesịrị, e yigharịrị ikpe ahụ ruo n'ụbọchị 10 Septemba, 2025 maka ikwupụta ikpe n'akwụkwọ a gbara maka ntọhapụ beelụ.