Ihe ndị dị mkpa Peter Obi na Sheikh Gumi kpara na Kaduna

Peter Obi na Sheik Gumi

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

Otu onye okpukpere alakuba a ma dịka Sheik Ahmad Gumi agwaala BBC ihe ya na Peter Obi kpara mgbe ha zitere na Kaduna n’ubọchị Monde.

Dịka Gumi si kwuo, Obi bụbu Govano Anmabra steeti bịara zute ya ịkpa maka etu o si azọ ọkwa onyesisiala.

“N’ụbọchị Monde bụ mbụ m zutere Peter Obi, ọ bịara ileta m, kelee m ma kwuo maka ihe na-akpalite mmụọ ya ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa” ka o kwuru.

“Ọ gwara m ihe o ji bịa njem na Kaduna nakwa ihe ọ kawadooro ala Naịjirịa ma ọ banye ọchịchị”

Ọ sị na dịka ndị ọzọ na-azọ ọkwa bịara ileta ya, ọ nyere ya ndụmọdụ n’ihi na ihe ha chọrọ bụ onye ga-achị Naịjirịa ọfụma ma jịkọọ ya.

Gumi kwuru na o nwere onye o bu n'obi ọ na-akwado na ntuliaka n'abịa mana ọ gaghị ekwuputa ya ugbua.

Ihe mere nzukọ Obi na Gumi ji ewu ewu kemgbe

Kemgbe ọ gbara na soshal midia na Peter Obi gara ịhụ Sheikh Gumi na be ya, ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu ahụ.

Ụfọdụ katọrọ njem Obi jere na nke Gumi ebe ndị ọzọ kwuru na o nweghi ihe ọjọo dị na ya.

Ndị mmadụ gbarụrụ bụ n'ihi na e nweela ụfọdụ ihe jikọrọ Gumio nakwa ndị omekome na tọrọ ndị mmadụ ọ kachasị na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Chetna na mgbe BBC gbaburu Gumi ajụjụ ọnụ ọ kọwara na ihe mere o ji bụrụ ọnụ okwu ndị omekome ahụ bụ n'ihi na ha 'tụkwasịrị ya obi".

"Ọtụtụ mgbe ka gọọmentị wụrụ ndị ahụ n'ala ma mebie nkwekọrịta ha nweburu, ya mere o ji dị mkpa ịnwe onye akaebe" ka ọ gwara BBC.