You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E duola Paul Biya n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Kamerun nke ugboro asatọ
A nọrọ n'ụbọchị Tọzde 6 Nọvemba, 2025 n'ogige ụlọomiewu mba Kamerunu dị na Yaoundé duo Paul Biya n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Kamerunu nke ugboro asatọ ya.
Biya meriri nwetara mmeri nke ugboro asatọ dịka onyeisiala mba ahụ na ntuliaka e mere n'ọnwa Ọktoba 2025. Ntuliaka ahụ bụ nke ọtụtụ mmadụ kwuru na o juputara n'ọgbaaghara.
Mpụtara ntuliaka ahụ kwuru na Onyeisiala Biya ji vootu pasenti 54 merie Issa Tchiroma Bakary nwetara naanị vootu dị pasenti 35.
Paul Biya banyere n'ọkwa ọchịchị n'afọ iri anọ na atọ gara aga ma mee nannị otu emume achụmnta vootu tupu e mee ntuliaka afọ a.
Paul Biya gbara afọ 92 ma bụrụ onyeisiala kacha kaa nka n'ụwa niile.
Kamerun ga-akpụga Issa Tchiroma Bakary ụlọikpe maka ọgbaghara sotere ntuliaka - Atanga Nji
Gọọmenti mba Kamerun ekwuola na ha ga-akpụga onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na anọghị n'ọchịchị bụ Issa Tchiroma Bakary ụlọikpe maka ọgbaaghara dapụtara ka e mechara ntuliaka onyeisiala na mba ahụ.
Mịnịsta na-ahụ maka ime obodo bụ Paul Atanga Nji mere ka a mata nke a ma kwuo na ọ bụ Issa donyere ndị na-eme ọgbaaghara ukwu ma kwado ngagharịiwe.
Opekatamkpe mmadụ anọ anwụọla n'oge ndị na-eme ngagharịiwe na ndị ọrụ nchekwa kwatara kamgbe e mechere ntuliaka onyeisiala mba ahụ n'Ọktoba 12, 2025.
Mana ngagharịiwe bịara kara njọ mgbe Kansụl na-ahụ maka iwu kpọpụtara Onyeisiala mba Kamerun bụ Paul Biya dị afọ 92 dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.
N'aka nke ọzọ, Tchiroma Bakary kwuru na ya meriri ntuliaka ahụ mana Onyeisiala Paul Biya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ Cameroon People's Democratic Movement (CPDM) kwuru na Issa sịrị asị.
Ngagharịiwe akawanyela njọ na mba Kamerun n'ihi mpụtara ntuliaka nyere Paul Biya mmeri
Ngagharịiwe akawanyela njọ na mba Kameun maka mpụtara ntuliaka onyeisiala nke Paul Biya meriri.
Mmeri Paul Biya dị afọ iri itoolu na abụọ bụ nke ugboro asatọ ya kemgbe ọ banyere n'ọchịchị n'afọ 1982.
Ndị nchekwa tinyere ihe mgbochi okporoụzọ, na-agbalị mgbọ egbe na-anụrị ose I ji gbochi ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na obodo Douala nakwa ebe ndị ọzọ.
Ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ụlọ 'Mayor' nke Douala ọkụ.
Cheta na mmeri nke ntuliaka onyeisiala mba Kamerun kpalitere nnukwu esemokwu na mba ahụ.
Otụtụ ndị mmadụ katọrọ mmeri Paul Biya kemgbe ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Kamerun kpọpụtara aha ya dịka onye meriri.
Cheta na onye ndu ndị otu mmegide bụ Issa Tchiroma Bakary, kwupụtara onwe ya n'izu gara aga dịka onye meriri.
A kpọpụtala Onyeisiala mba Kamerun bụ Paul Biya dịka onye meriri ntuliaka onyeisiala mba ahụ.
Biya, onye dị afọ iri itoolu na abụọ, bụ onye malitere ịchị n'afọ 1982 bụkwa onyeisiala kacha ochie n'ụwa, meriri ọchịchị nke ugboro asatọ ya na ntuliaka a.
Cheta na mmeri nke ntuliaka onyeisiala mba Kamerun kpalitere nnukwu esemokwu na mba ahụ.
Chetakwa na onye ndu ndị otu mmegide bụ Issa Tchiroma Bakary, kwupụtara onye onwe ya n'izu gara aga dịka onye meriri, na-ekwu na Kansụl Iwu ga-ekwupụta mpụtara rụrụ arụ.
Ndị Kamerun chị obi n'aka dịka a na-eche mpụtara ntuliaka onyeisiala
Ndị Kamerun achịrịla obi n'aka ugbua dịka a na-eche mwepụta mpụtara ntuliaka onyeisiala mba ahụ.
Ka ọ dị ugbua, a na-atụ anya na ndị Kansụl Iwu ga-akpọpụta onye meriri na ntuliaka onyeisiala nke mba Kamerun taa dịka esemokwu na-arị elu ugbua na mba ahụ.
Cheta na Onyeisiala Kamerun bụ Paul Biya dị afọ iri itoolu na abụọ, na-achọ ọchịchị nke ugboro asatọ na ntuliaka a.
Ebe onye ndu ndị otu mmegide bụ Issa Tchiroma Bakary, kwuru na ya bụ onye meriri, na-ekwu na Kansụl Iwu ga-ekwupụta mpụtara rụrụ arụ.
N'aka nke ọzọ, ndị mmadụ agbahapụla okporoụzọ ndị dị n'obodo Bamenda dị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke na-asụ Bekee.
Opekatampe, mmadụ anọ anwụrụ na Sọnde 26 Ọktoba n'ọgụ ndịagha na ndị nchekwa n'ebe azụmaahịa Douala.
Ndị na-akwado ndị mmegide emegidela iwu machibidoro ngagharịiwe, na-ekwu na pati na-achị achị chọrọ "izuru mmeri" n'aka ha.
Mba Kamerun na-eche zi mpụtara ntuliaka onyeisiala
Amalitela ịgụ vootu na Kamerun dịka emechiri ntuliaka onyeisala na Sọnde nke Paul Biya na-achọ ịgbatị oge ya na ọchịchị.
A na-atụ anya na-aga ewepụta mpụtara ntuliaka n'ime ụbọchị iri na ise nke emechara ntuliaka ahụ.
Ndi ndoro-ndoro ochichi mmadụ itolu na-achọ ịma Bịya aka, ị nara ya ọchịchị nke ọ nọ kemgbe ugboro asaa.
Ya merie, ọ ga-abụ ugboro asatọ ya n'ọkwa ọchịchị kemgbe afọ iri anọ na atọ.
Biya dị afọ iri itolu na abụọ bụ onyeisala kachasi okenye n'ụwa ụgbua.
Ntuliaka onyeisiala mba Kameruun amalitela
Ntuliaka onyeisiala mba Kameruun malitere n'ụbọchị Sọnde 12 Ọktoba 2025, dịka onyeisiala mba ahụ bụ Paul Biya so na ndị na-azọ ya.
E kwuru na ntuliaka ahụ malitere n'elekere asatọ nke ụtụtụ, dịka a tụrụ anya imechi ogige ntuliaka n'elekere isii nke mgbede.
Biya dị afọ iri itoolu na abụọ anọọla n'ọchịchị afọ iri anọ na atọ, ma bụrụkwa onyeisiala kachasị okenye nọ n'ọkwa na mbaụwa.
Mmadụ iri na otu ka ha na Paul Biya na-ama aka na ntuliaka ahụ, nke gụnyere onye bụbu minista na-ahụ maka ohere ọrụ bụ Issa Tchiroma Bakary dị afọ iri asaa na itoolu.
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na mba Kameruun ewepụtala akwụkwọ e ji atụ vootu iri na abụọ, bụ ndị nọchitere anya mmadụ iri na abụọ e nyere nkwado ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ.
Mana ọ bụ mmadụ iri na-azọ ọkwa ahụ ugbua, n'ihi na Akere Muna na Ateki Seta wepụrụ onwe ha iji kwado Bello Bouba Maigari.
Minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme na mba Kameruun bụ Paul Atanga Nji kwuru n'oge gara aga na a gaghị anabata njikọ ọbụla mgbe oge gasịrị.
Ka o sina dị, Odeakwụkwọ mba Kameruun atụọla vootu nke ya.
Na Buea, mpaghara ọdịda anyanwụ na-enwe oke ọgbaaghara, a na-eme ntuliaka n'okpuru nchekwa siri ike. Ndị mmadụ gbahapụrụ okporoụzọ dị na mpaghara ahụ dịka otu ndị na-achọ nkewa na-amanye iwu mkpọchi ha.
Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-eme ntuliaka n'okpuru nchekwa siri ike dịka e ji ụgbọala ndịagha kpọbata ndị ọrụ ntuliaka.
Kedụ ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala Kameruun?
Onyeisiala mba Kamerum Paul Biya dị afọ 92 – ma bụrụkwa onyeisiala kacha okenye n'ụwa – pụtakwara ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a.
O kwere ndị mba ahụ nkwa na "ihe kacha mma ka ga-abịa" ka ọ na-achọ ọkwa onyeisiala nke ugboro asatọ ya dịka ọ chịgoro mba ahụ afọ iri anọ na atọ.
Biya malitere ọchịchị dịka Onyeisiala kemgbe afọ 1982 nwereike ịnọ n'ọchịchị ruo afọ iri ise maọbụ ihe fọrọ nke nta ka ọ gbaa afọ otu narị (100) ma ọ bụrụ na o merie na ntuliaka nke afọ a.
N'aka nke ọzọ, ọ bụ mmadụ iri na abụọ ka a kwadoro ka ha sonye n'ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ, gụnyere Issa Tchiroma Bakary na Bello Bouba Maigari - ha abụọ bụbu ndị ha na Onyeisiala Paul Biya na-arụkọ ọrụ si na mgbago ugwu mba ahụ.
Ha gbara arụkwaghịm n'ọkwa minista ha n'ọchịchị Biya ka ha weghara ọkwa onyeisiala n'aka Biya.
Onye omeiwu Cabral Libii, onyeisioche otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Social Democratic Front (SDF) Joshua Osih na Patricia Tomaïno Ndam Njoya – bụ naanị nwanyị na-azọ ọkwa onyeisiala – sokwa na ntuliaka ahụ.
Cheta na mmadụ abụọ na-azọ ọchịchị gụnyere onye ọkaiwu ama ama na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ Akere Muna wepụrụ onwe ha na mmalite ịchụnta vootu ahụ, iji kwado Maigari nke pati NUDP.
Nke a pụtara na ọ bụ mmadụ iri ga-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a.
Ndị ọzọ gụnyere Iyodi Hiram Samuel, Ateki Seta Caxton, Jacques Bouhga, Kwemo Pierre na Serge Espoir Matomba.
Tupu ntuliaka ahụ, a kpọọla oku zuru ebe niile ka ndị na-agba gọọmenti ụkwụ wepụta otu onye ga-ama Biya aka, onye na-emeribeghị na ntuliaka mbụ.
Etu ọnọdụ akụnaụba Kameruun dị ugbua
Ka ọ dị ugbua, enweghị ọrụ nke ndị ntoroọbịa bụ isiokwu a kpụ n'ọnụ n'etiti ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a.
Dịka ụlọọrụ International Organisation for Migration (IOM) siri kwuo, ihe fọrọ obere ka ọ ruo pasent ndị na-eto eto iri anọ na mba Kameruum nọ n'agbata afọ iri na ise na afọ iri atọ na ise enweghị ọrụ, ebe ndị ntoroọbịa gụsịrị akwụkwọ ruru pasent iri abụọ na atọ na-enwe ịmaaka nke enweghị ọrụ.