Arondịzuogu: Gentle D'Yahoo agọọla na aka ya adịghị n'ogbugbu e gburu ndị mmadụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị Arọndịzọgụ ebeela akwa arịrị maka akụkọ ịtọrọ mmadụ nakwa igbagbu mmadụ n'Okigwe-Arondizuogu n'okpuruọchịchị Ideato na ebe ndị ọzọ n'Imo steeti, okwu a abụrụla okwu a kpụụ n'ọnụ ugbua.

Ihe onyonyo pụtara na soshịal midịa gosiri ebe e gburu mmadụ 17 n'obodo Arondịzuogu, Okigwe na Umualaoma n'Imo Steeti.

Ọ bụ otu na-azọ nnweronwe Biafra ka ndị obodo ahụ na-ebo ebubo na ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ọbụla na mpaghara ahụ.

Ha rụtụrụaka na ọ bụ otu onyeisi ndị otu Biafra a kpọrọ Gentle D'Yahoo na-egbu ma na-atọ ndị mmadụ n'ogbe ahụ.

Ha kwuru na nke a bụ maka ozi ụda olu ya o ziri na-eyi ndị mmadụ bi na mpaghara Arọndịzọgụ egwu ọnwụ.

Mana Gentle D'Yahoo wepụtara ozi n'akara soshịal midịa ya bụ ebe ọ nọ gọọ na aka ya na ụkwụ ya adịghị n'ogbugbu ndị mmadụ n'obodo ndị ahụ. A hụrụ onyonyo a n'ụbọchị Ọgọstu 2, 2025.

Kedụ ka akụkọ si bido n'UmUalaoma na Arondizuogu?

O bidoro n'ụbọchị Fraịde 25 Julaị, 2025 mgbe ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ, wakporo obodo Umualaoma, Ndiukwuatọ na Ndi-Ejezi dị n'Arondizuogu ma gbagbuo ọtụtụ mmadụ.

Ndị obodo ahụ BBC Igbo gbara ajụjụọnụ kwuru na ha gụtara ozu mmadụ iri na asaa (17) nwụrụ site na mwakpo ahụ.

Otu onye obodo ahụ aha ya bụ Mazi Benard Udeachara kọwaara na ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala nakwa ọgbaa tum-tum wuchie ogige ezumezu Umualaoma bụkwa ebe a na-azụ ahịa ma gbagbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

N'okwu ya "Anọ m n'ụlọahịa m oge m nụrụ mkpu akwa ndị mmadụ. Ngwangwa m tinyere isi ka m mara ihe na-eme, a hụrụ m ka ozu ndị mmadụ tọgbọrọ n'ala"

"Anyị gbapụrụ ọsọ ndụ dịka ndị ojiegbe ahụ mere ngwa ngwa pụọ gawa n'obodo Ndiukwuatọ na Ndi-Ejezi ebe ha gbukwara ọtụtụ mmadụ", ka Maazị Udeachara gbakwụnyere.

Oge a jụrụ ma ndị o cheere mere mwakpo ahụ, o kwuru na ya chere na ọ bụ ndị otu Bịafra ka ndị ahụ bụ maka na ha eyighị ndị na-achị ehi n'anya ya, na-agbanyeghi na ụfọdụ n'ime ha kpuchiri ihu ha ekpuchi.

Kamgbe mwakpo ahụ mechara, obodo niile dị n'Arondizuogu nọ na nrụrịtaụka banyere ndị mere ya.

Kedụ ihe ndị uweojii kwuru maka?

Akwụkwọ ozi ndị uweojii Imo steeti katọrọ ogbugbu ahụ ma boo ebubo na ọ bụ otu IPOB/ESN kpara ajọ agwa ahụ.

Kọmishọna ndị uweojii Imo steeti bụ Abọki Danjuma kwuru na ọ ezigala ndị uweojii otu "Tactical Unit" ebe ahụ iji hụụ maka nchekwa ndị mmadụ ma sie imi n'ala iji chọpụta ma nwuchie ndị kpara mkpamkpa ahụ.

Mana onye bụ Gentle D'Yahoo a na-ebo ebubo ịkpa mkpamkpa a?

Lee ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma maka onye nọ n'isi okwu ebubo ogbugbu ndị mmadụ n'Arondizogu:

  • Ezigbo aha nwamadị ahụ kpọrọ onwe ya "Gentle D'Yahoo" bụ Ifeanyichukwu Okorienta Eze.
  • O kwuru na ya na-achịkọta ngalaba otu ESN na IPOB dị icheiche n'Imo steeti nakwa ebe ndị ọzọ n'ala Igbo.
  • Ọtụtụ ihe onyonyo ebe "Gentle D'Yahoo" na-ekwu ka ya na ndị otu ya si akpa ike iji nweta nnwereonwe Biafra agbaala n'anwụ na soshal midia n'oge gara aga.
  • Ha ejirila ọnụ ha kweta ọtụtụ mgbe na ha egbuola ndị uweojii, ndịagha nakwa ndị nkịtị n'ebe dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
  • Ka ya bụ ọdachi dara n'Arọndizuọgụ, ndị ọrụ nche obodo na ndị obodo na-arụaka na ọ bụ "Gentle D' yahoo" na ndị otu ya gụnyere "Angel make up" bụ ihe gbagburu ndị ahụ.
  • A nụrụ ka Gentle na-enye osote ya bụ "Angel Makeup" ntuziaka ka ọ gaa n'Arondizuogu gbagbuo ọtụtụ mmadụ n'ozi 'voice note' ahụ. Mana ozi ọzọ nwaamadị ahụ wepụtara n'akara Facebook, gọnarịrị ebubo ahụ ma kwuo na ọ bụghị ya na ndị otu ya wakporo obodo ahụ kama na ọ bụ ndị iro ya.
  • O kwuru na ọ bụ onyeisi ndị nche obodo Arondizuogu bụ Maazị Chinedu Arukwe, e ji "Okiso Fire" mara na-agba ya mgba.
  • Maazị Chinedu Arukwe a na-akpọkwa "Okiso fire" bụ onye ndị obodo ha nyefere nchekwa Arondizuogu n'aka.

Kedụ ihe Okiso Fire kwuru maka ebubo Gentle D'Yahoo?

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ olu Okiso Fire, nke ezigbo aha ya bụ Maazị Chinedu Arukwe amịtabeghị mkpụrụ.