Ihe mere ndị Super Falcons ji were iwe gbajọọ ọzụzụ ha

Super Falcons nke Naịjirịa gbara isi akwara na ha agaghị apụta kwadoo make asọmpi ha na ndị Zambia kwesịrị ịgba na Fraịde.

Nke a bụ maka na akwụbeghi ha ụgwọ bọọlụ ha gbara kamgbe asọmpi Iko Mba Afrịka nke ụmụnwaanyị malitere na mba Morocco.

Otu onye so na ndị nkuzi na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oge ruru mgbe ha ji enwe ọzụzụ na Wenezde, mana ha jụrụ ịpụta maka ụgwọ eji ha.

Ego ole ka e kwesịrị ịkwụ Super Falcons?

Otu onye n’ime ndị Super Falcons kwesịrị inwete otu narị dọla ($100) kwa ụbọchị, o kwesịrị inwete puku dọla atọ ($3,000 na mmeri ọbụla ha nwetere n'agba 'group stage' nakwa otu puku dọla na narị ise ($1500) ma ha gbaa nhatanha n'asọmpi 'draw match'.

Site na mgbakwụnye ego e tinyere n'asọmpi ụmụnwaanyị, e kwesịrị ịkwụ ha puku dọla ise ($5,000) maka imeri n’agba ’quarter-final’.

Na-agbanyeghi na Super Falcons agbaala asọmpi anọ, merie abụọ na 'group stage', merie otu n’agba quarter-final, ma daa otu, o nwebeghi shịshị ọbụla a kwụrụ ha n'ụgwọ.

Naanị ego e nyere ha bụ otu puku dọla ($1000) maka ụbọchị iri ha nọrọ na Morocco n'oge asọmpi.

Kedụ Ihe otu NFF kwuru?

Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) sị na ha na-eleba anya n'ịhụ na a kwụzuru ụmụnwaanyị a ụgwọ ha niile.

N'ozi ha wepụtara n'onyonyo, ha sị na ihe kpatara ya bụ nsogbu ịgbanwe ego (Forex) dị na Naịjiria ugbua.

Ugboro ole nsogbu akwụghị Super Falcons ụgwọ dapụtarala

Nke a abụghị mbụ ndị Super Falcons ga-ajụ inwe ọzụzụ maka akwụghị ha ụgwọ asọmpi ha gbara.

Nke mbụ mere n'afọ 2014, mgbe ha mabuuru Iko Mba Afrịka na Saụt Afrịka, ọzọ bụ n'afọ 2016 ha mabutere iko a nke ugboro asatọ na mba Kameruun.

N’afọ 2019 a gbara asọmpi Iko Mbaụwa na France, nsogbu a kwụghị ụgwọ dapụtakwara ọzọ mgbe Germany gbapụrụ Super Falcons n'asọmpi ahụ.