Etu nwa m si nwụọ n'ọgbaghara Anti-tout n'Onitsha - Nne Chimezie Uduji

Ebe foto si, Supplied
Ezinaụlọ Uduji egosila mwute ha maka ọnwụ nwa ha nwoke bụ Chimeze n'aka ndị e cheere bụ ndị 'Anti-tout' n'Ọnịcha Anambra steeti.
Akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị ntorọbịa pụtara ịme ngagharịiwe n'ụbọchị Tọzde maka ahụhụ ha na-ata n'aka otu ahụ bụ Anti-tout.
Iwe ha bụ na otu ahụ na-amaja ha, na-anakọ ha ụtụ isi ugboro ugboro, na-enye ha nsougbu mana ọgbaghara dapụtara mgbe ebidoro ịgbanye egbe n'etiti ndị na-eme ngagharị iwe iji chụsaa ha.
Dịka nwanne Chimezie si gwa BBC Igbo na mkparịtaụka, o sị na nwanne ya bụ onye na-ekprere Chineke enweghi nsogbu ọbụla.
Nne Chimezie kọwaara BBC etu ihe ahụ si me n'uju.

Ebe foto si, Supplied
Ọ sị "Chimezie biliri n'ụtụtụ ụbọchị ahụ kpọga ụmụnne ya ndị obere n'ụlọakwụkọ mgbe ọ hụrụ ndị na-eme ngagharịiwe.
Ọ gbaghachiri azụ n'ime yaadị ha mgbe ọhụrụ na ihe na-akwawanye njọ. Mụ na ya malitere ịkpa maka ihe na-eme mgbe anyị hụrụ ebe ndị mmadụ na-agbaba n'ime ebe ụlọ anyị"
Ọ sịkwa na Chimezie gbapụrụ ịga gbachi ụzọ ukwu nke okporoụzọ ahụ mgbe onye ọrụ anti-tout gbara ya egbe.
"Amaghị m na mgbọ tụrụ ya rue mgbe m hụrụ ya ebe ọ na-agbaba n'ụlọ anyị ebe ọ na-agba ọbara. Tupu o bata rue n'ime ụlọ o bidoro iku ume elu elu.
Nwa m abụghị onye agboro, ọ bụ onye obi ume ala na-enedo anya n'ọrụ ya nakwa ịga ụka.
Naanị ihe ọjọo o mere bụ na ọ gara igbachi ụzọ ukwu iji kwụsị ndị agboro ịgbabata be anyị" ka o kwuru.
Ọ sịkwa na ha nwara ịnwetara ya enyemaka mana ndị mmadụ achọghị inye aka maka na agbara ya egbe.
Ọnụ na-ekwuru gọomentị Anambra steeti bụ Christian Aburime kwuru na "Ọ gaghị abụ ndị Anti tout gbara onye ọbụla egbe n'ihi na ha enweghi ikike ibu egbe, mana ha na ndị ọrụ nchekwa ndị na-ebu egbe na-arụkọ ọrụ."



