'Akpụkpọ ahụ m na-akpụchasị' - Ụmụnwaanyị Afrịka e ji aghụghọ kpọbata ebe a na-arụpụta droonu na Rọshịa

Foto gosiri mba Rọshịa, Saụt Sudan, droonu na silhouette na nwaanyị anyị zoro aha ya na silhouette.

Ebe foto si, Getty Images / BBC

    • Onye dere ya, Mayeni Jones
    • Ndị mere akụkọ a, Africa correspondent
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Adua dị afọ iri atọ na abụọ bụ onye mba Saụt Sudan. Ọ kọwara e tu e si jiri aghụghọ ziga ya n'ebe a na-arụpụta droonu na mba Rọshịa.

"Mgbe anyị ruru ebe ahụ ka anyị hụrụ droonu ebe niile".

Ebe ahụ bụ 'Alabuga Special Economic Zone' dị na Tatarstan repụblịk n'ime Rọshịa.

Adau kwuru na ọ bụ ụlọọrụ na-enye ọrụ a na-akpọ "Alabuga Start programme" ka ya tinyere akwụkwọ ma bụrụ ndị nyere ọrụ ahụ.

Ha na-ekwe ndị mmadụ nkwa ezigbo ọrụ dị iche iche.

Mana e bola ndị ahụ na-enye ọrụ ebubo iziga ndị ha nyere ọrụ n'ebe dị njọ nwereike imemila ndụ ha bụ nke ha kwuru na ọ bụghị eziokwu mana ha kwetere na ndị ha nyere ọrụ na-arụ ọrụ n'ebe a na-emeputa droonu.

Na mba Saụt Afrịka ka e boro "Alabuga Start programme (AS)" ebubo ma kwuo na ha na-atụ mgbere mmadụ.

BBC nyere ha ohere ịzara ọnụ ha mana ha ekweghị ekwu okwu banyere ebubo e boro ha.

Ụmụnwaanyị Afrịka karịrị otu puku so na ndị na-arụ ọrụ n'ebe a na-arụpụta ngwa agha.

BBC gosiri Adau foto mana ọ sị na ọ bụ ebe ahụ dị na foto anyị gosiri ya.

Ọ sị na ya maara maka ọrụ ahụ n'afọ 2023 mgbe ndị ya maara na-egosi ya n'akara Facebook nakwa mgbe mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ dị elu na mba Sudan kesara ozi ha.

Akwụkwọ ndị mịnịstrị mba Saụt Sudan jiri kesaa ozi maka ọrụ ahụ nke Adau wetere

Ebe foto si, Supplied to the BBC

Nkọwa foto, Adau

Ọ kọwara na ya na ndị na-enye ọrụ kpara nkata na WhatsApp.

"Ha sị m dee aha m na ndekọ ndị ọzọ banyere m"

Adau kọwara na ọrụ ya tinyere bụ ọrụ ịnya tower-crane maka na ya ma anya nkanụzụ.

"A chọrọ m ịrụ ọrụ ọ bụ ụmụnwoke kachasị arụ ya"

O kwuru na tupu enye ya ọrụ na ọ gafechara otu afọ.

Tiketị ụgbọelu si Juba gaa Istanbul na Maach 16.

Ebe foto si, Supplied to the BBC

Nkọwa foto, Akwụkwọ tịketị Adau ji banye Tartastan
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụ na n'ọnwa Maachị afọ garaaga ka o mechara banye na Rọshịa.

Ọ sị na " onyi bụ ihe karịrị mgbe ha ruru n'ebe ahụ mana mgbe ha ji ụgbọala na-aga Alabuga Special Zone nyere ha obi ụtọ na mbụ.

E ji ọnwa atọ kuziere ya etu e si asụ asụsụ ha mana ọ bụ mgbe ahụ ka nsogbu ya bidoro.

Ọ sị na ha binyere aka n'akwụkwọ machiri ha ịgwa mmadụ ọbụla ihe ha hụrụ n'ọrụ ha nke mere na ha agaghị agwa ezinaụlọ ha ihe ọbụla.

Ebe niile anyị chọrọ ịrụ ọrụ dịka ebe a na-arụpụ ihe dị icheiche maọbụ ịnya crane abụghịzị ihe anyị hụrụ - e dugara anyị ebe a na-arụpụta droonu.

Alabuga kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha ji aghụghọ duga ndị ha nyere ọrụ ma kwuo na ebe niile ha rụrụ ọrụ dị na websịate ụlọọrụ ha.

Anyị gosiri ya onyonyo si na ozi ụlọọrụ mgbasaozi Rọshịa bụ RT gosiri ebe a na-arụpụta droonu nke a kpọrọ Iranian Shahed 136 mana ọ sị na ọ bụ ebe ahụ ka ya rụrụ ọrụ.

Ọ kọwara na ọ bụghị ihe a gwara ha mgbe ha na-achọ ọrụ ka ha hụrụ ọzọ bụ na mgbe ya bidoro ọrụ, ya na-ruo n'ụlọ, ya ahụta na anụ ahụ ya na-akpụchasị.

O kwuru na a na-enye ha uwe na ihe e ji ekpuchisi ahụ mana 'kemịkal' ha ji arụ ọrụ na-agafe uwe ahụ ma na-emeru ha ahụ.

Nwoke ọkụ kemịkal gbara aka ya.

Ebe foto si, Supplied to the BBC

Nkọwa foto, Kemịkal gbara anụ ahụ ya ọkụ

Ọ bụ n'abalị abụọ nke ọnwa Epril 2024 ka ọ bụ izuụka abụọ Adau bịara Rọshịa, mana mba Yukren wakporo Alabuga Special Economic Zone.

Adau kọwara etu ya si kulite n'ụra ọ bụrụ na ogbunigwe droonu a tụrụ agbakasịchala elu ụlọ ha.

Ọ sị na ọ bụ mgbe ya pụtara iro ka ya hụrụ ndị ọzọ nọ n'iro si n'ụlọ ebe ha bi na-agba ọsọ ndụ.

Ọ sị na ya hụrụ ndị na-agba ọsọ na-arụ aka n'eluigwe mana mgba ya lere anya n'elu ka ya hụrụ droonu.

Obere oge onye ọbụla agbawara ọsọ bụ oge ahụ ka ya bidoro gbawa ọsọ ma gbakarịa ndị bu ya ụzọ.

Onyonyo mwakpo ahụ Yukren mere Rọshịa gosiri na ọ bụ ụbọchị ahụ Adau kwuru na ha gbara ọsọ nakwa ebe ha gbara ọsọ ka a wakporo n'ime mba Rọshịa.

Ndị mmadụ na-ekiri nnukwu awụrụ na-apụta

Ebe foto si, Supplied to the BBC

Nkọwa foto, Photo Adau sere mgbe droonu mba Yukren na-awakpo ebe ha nọ

"Droonu tụrụ ogbunigwe ma mebie ụlọ ebe ha bi".

Ọ bụ ọnwa ole ma ole ka ọ maara na ọ bụ ebe a na-arụpụta droonu ka ha na-arụ ọrụ.

Ọ bụ mgbe ahụ ka uche ya gwara ya ihe mere e ji were ogbunigwe droonu tụọ ụlọ ha bi.

Ọ bụ mgbe Yukren tụrụ ogbunigwe ahụ mana mgbe e boro Yukren ebubo ịtụ ogbunigwe droonu n'ebe ndị nkịtị nọ ka ha kwuru na ọ bụ ndị na-arupụta droonu na Rọshịa ka ha wakporo.

Mgbe Adau nyefere akwụkwọ arụkwaghịm ya, ezinụlọ ya zigara ya tiketi iji laghachite ụlọ, mana o kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị enweghị ike ịkwụ ụgwọ maka ụgbọelu ịlaghachi azụ ma mechaa nọrọ ebe ahụ - n'ihi na ụgwọ ọnwa ha dị obere karịa ka ikwere ha na nkwa.

E kwesiri ị na-akwụ Adau ụgwọ ọnwa $600 (£450) mana ihe ọ na-enweta n'ọnwa adịghị eru ọkara ya mgbe ụfọdụ maka na a na-ewepụ ego ihe dị iche iche gụnyere ụgwọ ụlọ, ụgwọ akwụkwọ, ego ụgbọala ha ji aga-ọrụ nakwa ụgwọ ụtụisi.

BBC gbakwara nwaanyị ọzọ ajụjụ ọnụ kwuru na ya rụrụ ọrụ na Alabuga mana emeghị ajọ ihe.

Mana Adau kwuru na ịrụ ọrụ n'ebe a na-arụpụta ngwaagha na Rọshịa kwasara ndụ ya ma mekpaa ya ahụ.