Ndị dịbịa na-eji ọgwụ e ji agwọ ndị nwere ọrịa ụbụrụ agwọ ndị mmadụ na Saụt Afrịka

Nwoke kpuchiri anya, yi uwe elu na-acha anụnụ anụnụ dina n'elu akwa dịka nwannyị guzo n'akụkụ ya ma weere akụkụ nnụnụ na-efe ya ufe
    • Onye dere ya, Claire Mawisa
    • Onye dere ya, Marco Oriunto
    • Onye dere ya, Nicky Troll
    • Onye dere ya, Jo Munnik
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
    • Ebeg o si, Cape Town & London
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọgwụ e ji agwọ ọrịa 'psychedelic drugs' bụ nke iwu na-akwadoghị na Saụt Afrịka mana ndị dibia amara ka 'shamans' nọ na Cape Town na-agbasa ozi nye ndị ọha na ha na-eji ya eme ọgwụgwọ.

Onye ọ bụla ejidere na-eji ya eme azụmahịa ga-akwụ ụgwọ imebi iwu, ịtụ mkpọrọ afọ iri abụọ na ise ma ọ bụ ha abụọ.

Onye na-ese foto Stuart Dods bụ otu onye chọrọ iwere ọgwụgwọ ahụ na-aka onye dibịa.

Ọ na-achọ enweta ngwọta ọrịa uche nke abụọ ya maka ọrịa uche ọ na-enwe. Ọ nwalere ọgwụ ndị ọzọ mana o kwenyere na psychedelics ji igodo ọgwụgwọ ya.

" nne m nwụrụ na mberede, ọyị m gbasara mmekọrịta anyị otu afọ ka nne m nwụchara. Mgbe ahụ ka uche m mepere" ka nwoke ahụ gbara afọ iri ise na atọ kwuru.

Ngwọta psychedelic ọ chọrọ ime nke ọnụegọ ya ruru $2,000 (£1,500) gunyere ịṅụ ọgwụ ụfọdụ- psilocybin na MDMA nakwa ụlọ ebe ọ ga-anọ.

E nwere ndị na-eme nyocha ịmara ma iji psychedelic agwọ ọrịa uche ma ọ na-arụ ọrụ ọfụma mana a na-adọ aka na ntị gbasara ị jiri ya rụọ ọrụ ebe na-abughị ụlọọgwụ.

Otu ụzọ aka, nke nwere ụfọdụ mbọ agba ojii na-ahụ anya, na-ejide obere efere na mọshrum a mịrị amị na mmiri. Enwere obere efere rọba dị ya n'akụkụ nso nke nwere esere ese obi ịhụnanya na ya.
Nkọwa foto, Megan Hardy na-akwado mọshrum tupu inye Stuart Dods

Megan Hardy onye kpọrọ onwe ya "nwannyị ọgwụ" na-agwọ Dods ṅụrụ tụrụ nwa ọbere na ọgwụ ahụ ọ chọrọ iji agwọ Dods maka na o kwenyere na ọgwụ ahụ ga-eme ka o nwe nnọkọ mmụọ dịka onye ọ chọrọ ị gwọ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Hardy ma na ịji ọ dịka ọgwụ ahụ agwọ ọrịa uche bụ nke iwu na-akwdọghị mana o kwuru na ọ bụ "nnupụisi ezi omume"

Mgbe a jụrụ ya kedụ etu o si amara kpa onye ahụ kwesịrị i si anụ ọgwụ ahụ, ọ kọwara na kemgbe ọgwụ afọ ọ na anwale ọgwụ ndị ahụ n'onwe ya ma mụta nke na nke na-arụ ọrụ.

Oke ọrịa uche n'agbawanye nakwa ule ụlọ ọgwụ gbasara psychedelics bụ nke mere uche ndị ọha a dị na iji ọgwụ a agwọ ọrịa ndị gbasara ịda mbà n'obi, nchekasị na nsogbu nrụgide 'Post-traumatic Stress Disorder'.

Akụkọ kwuru na otu n'ime mmadụ abụọ na mba ụwa nwere ike ị nwe ọrịa Uche n'oge ndụ ha dịka nyocha ụlọakwụkwọ ahụike Harvard na ụlọakwụkwọ Queensland mere. ịgwọta ya abụrụla azụmahịa ọtụtụ ijeri dollar.

Tupu e bido ịgwọ ọrịa a, nke Stuart kwenyere ka BBC kirie, Hardy gwara Stuart na ọ ga-akwụsị mgbe ọ bụla o gosiri na enwere ihe na enye ya nsogbu.

Dods kpuchiri anya yi uwe elu na-acha anụnụ anụnụ dina n'elu akwa. Dịka ọgwụ ahụ na ebido ịrụ ọrụ na-ahụ ya, ọ nọ na-enwe mmekasi ahụ dị iche iche.

Ụmụnwannyị abụọ nọ na agagharị n'ime ụlọ na-akpọ ihe ọkụ ma na akpụgharị akụrụngwa ihe dibị dịka ọ na-agwụ egwu na-ekwu n'ire dịka ọ na-efe ahụ Dods ikuku i ji chụpụ ike na-adịghị mma.

O nyekwere ya ọgwụ ọzọ nke o kwenyere tupu e bido ịchụ aja mana mgbe ọ jụrụ ya ma ọ chọrọ ọgwụ ọzọ, ọ si na ọ maghị.

Mgbe BBC jụrụ Dods etu o si kwenye ka enye kwuo ya ọgwụ ọzọ mgbe ọ ka nọ na-enwe mgbakasi ahụ, ọ si "enweghị mmanye nọ ya n'ime"

Ọtụtụ ndị na agwọ ndị isi mgbaka na-arụtụ aka na ihe dị ịze ndụ nọ n'ụlọ ọrụ a na-enweghị nchịkwa. "Tupu mmadụ enyegi ikike ị ga n'ihu, onye ahụ kwesịrị ịma ihe na-eme na gburu gburu ya" dịka dọkinta Marcelle Stastny onye nkwado otu ndị na-agwọ ndị isi mgbaka na Saụt Afrịka si kwuo.

Mgbe BBC jụrụ Ms Hardy ma ị nọ na okpụrụ ọgwụ ahụ dịka ọ na-edụ aja psychedelic emebighị ikike ya ịlekọta Mr Dods.

Ọ sara na "Anyị na-arụ ọrụ etu uche mmadụ agaghị aghọta etu ihe si aga.

Enwere nyocha ndị mmadụ na-eme ma psychedelics ọ bụ usoro ọzọ dị mma iji agwọ ịda mbà n'obi ma ọ bụ nchekasị.

Na afọ 22, nyocha emere mmadụ nari abụọ, iri ato na ato etu esi eme ọgwụgwọ psychedelics nke gunyere psilocybin gosipụtara na ọgwụ 25mg enyere kwalite ahụike onye nwere ọrịa ịda mbà n'obi.

N'agbanyeghị nkea, nyocha ọzọ European Medicines Agency mere ma bipụta na afọ 2025 nke nyochara mmadụ narị ise na iri itolu na ise kwadoro ka enwe nyocha ọfụma na ụlọ nyocha tupu enye ikike maka ire ya.

Ha dọrọ aka na ntị na iwere psychedelics nwere ike ịkpalite ọbara mgbali elu, obi ịgbali elu nke na-egosipụta mkpa ọ dị inye ihe ndị a na "ọnọdụ nchekwa".

"onye ọbụla na-achọ ọgwụ idozi ahụike ha niile mana o nweghị ọgwụ nwere ike idozi ahụike ọbụla", dịka dọkinta Stastny si kwuo.

Nwaanyị yi uwe guzo n'akụkụ Họọsụ na-acha ụcha. Ọ nọ na-ele anya n'aka ịkpa
Nkọwa foto, Sonette Hill anaghị zi enye ọgwụ psychedelic mana o kwenyere na o nwere ike "ị gwọ mba ụwa"

Afọ gara aga, Sonette Hill bụ onye na-enye ọgwụ psychedelic si mpaghara Cape Town na Saụt Afrịka nyere onye ọ na-elekọta ahụika ya Ibogaine, ọgwụ psychedelic siri ike ewepụtara na osisi a na-ahụ kọma na Afrịka.

O weputara mmetụta a na-atụghị anya ya.

"O jidere m n'olu ma chọrọ igbum. O nwere ihe bara ya n'ime o ji chọrọ igbum"

Ibogaine bụ ọgwụ siri ike a na-enye ndị na-arịa ọrịa ihe riri ahụ. Iwu akwadoghị ka azụọ ya na Saụt Afrịka.

N'ọnọdụ ọzọ, o nwere onye ọzọ dị afọ iri abụọ na isii bịara ka a gwọ ya na ọrịa ihe riri ya ahụ. Dika e nyechara ya Ibogaine, ọ nwụrụ awa isii.

Ihe akaebe gbasara iji psychedelics nwere ike ị dị ọhụrụ mama ndị na-akpọ onwe ha ndị ọgwụgwọ na-eji ọgwụ nke iwu na-akwadoghị na-eto eto na soshial midia

ịlaghachite n'ụlọ ebe Stuart Dods nọ na-enweta ọgwụgwọ, ọ si na ahụ ya anaghị egosi na ọ dịla ya mma mana o kwenyere na ọ ga-adị ya mma emecha.