Ụgwọọnwa opekatampe N70,000: Lee ihe dị iche n'etiti Naịjirịa na mba ndị ọzọ

    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụgwọọnwa opekatampe bụ ụgwọ e kwesịrị ịkwụ onye ọbụla na-arụ ọrụ ọkachasị na Naịjirịa nakwa mba dị iche iche na-akwụ ndị ọrụ ụdịrị ụgwọọnwa ahụ.

Mara na dịka e nwere ụgwọọnwa okpekatampe (minimum wage), e nwekwara ụgwọọnwa e ji ebi ndụ (living wage).

N'akụkọ a anyị na-etinye anya n'ihe dị iche n'ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa na mba ndị ọzọ dịka a na-eme emume ncheta ụbọchị ndị ọrụ na Naịjirịa taa.

Ihe dị iche n'ụgwọọnwa opekatampe na ụgwụọnwa e ji ebi ndụ

N'oge gara aga, onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba bụ Desmond Okechukwu kọwara ihe dị iche n'etiti ụgwọọnwa abụọ ahụ.

Ọ sị na ihe ụgwọọnwa opekatampe pụtara bụ "na gọọmenti maọbụ ndị na-enye ọrụ agaghị akwụ onye ọrụ ọbụla ego pere mpe na-erughị n'ọnụego ụgwọọnwa opekatampe ahụ iwu kwadoro na Naịjirịa".

"Ebe ụgwọọnwa e ji ebi ndụ (living wage) pụtara usoro ụgwọọnwa e wepụtara n'oge a gbakọchara ihe niile na-enyere ndụ aka ma jiri maka ya na-akwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa ga-enyere ha aka ibi ndụ".

Ego ole ka ụgwọọnwa opekatampe pụtara n'otu awa, otu ụbọchị na Naịjirịa?

Ụgwọọnwa opekatampe Naịjirịa na-akwụ ndị ọrụ bụ puku naịra iri asaa (N70,000) n'otu ọnwa, mana ị chọpụta ego ole a na-akwụ n'awa n'awa maọbụ ego ole ọ pụtara n'otu ụbọchị bụ ihe nwereike ịra ahụ ịchọpụta na-enweghị ntụpọ.

Mana na Naịjirịa, ndị ọrụ na-arụ ọrụ awa asatọ, bido n'elekere asatọ nke ụtụtụ ruo n'elekere anọ nke mgbede.

Nke a pụtara na ọ bụrụ na ha rụọ ọrụ ihe dịka ụbọchị iri abụọ na isii (26-days) n'ọnwa na ọ bụ awa 208 ka ha ga-arụ ọrụ n'ọnwa ahụ.

Anyị ga-ejiri awa asatọ n'ụbọchị nakwa ọrụ ụbọchị iri na isii n'otu ọnwa were gbakọọ ma wepụta ihe e nwereike ịkwụ ndị ọrụ n'otu awa:

  • Awa ole n'ụbọchị - Asatọ (8)
  • Ụbọchị ole n'ọnwa - iri abụọ na isii (26)
  • Awa ole n'ọnwa - awa asatọ (8) x ụbọchị iri na isii (26) = awa 208
  • Ụgwọọnwa opekatampe n'otụ awa - N70,000,00 kerie awa 208 = N337 n'otu awa.
  • Ụgwọọnwa opekatampe n'otu ụbọchị (awa asatọ) - N337 x awa asatọ = N2,696.

Ọnọdụ ụgwọọnwa na mba ndị ọzọ n'Afrịka

Dịka Naịjirịa nwere ụgwọọnwa opekatampe, mba dị iche iche n'Afrịka nwekwara nke ha mana n'akụkọ a, anyị na-etinye anya na mba DR Kongo nakwa mba Senegal.

Na mba DR Kongo ihe gọọmenti na-akwụ ndị ọrụ bụ 14,500 Francs (bụ ego mba ahụ) kwa ụbọchị.

Mana ị bịa na mba Senigal ha kewara ndị ọrụ ha ụzọ abụọ dịka ndị na-arụ ọrụ n'ugbo na ndị na-abụghị ndị ọrụ ugbo.

Ugbua ihe ha na-eri n'ụgwọọnwa n'afọ 2025 bụ 64,223 FCFA (110.46 USD) nke pụtara 0.64 USD/otu awa ma e jiri awa 40 gbakọọ ya n'izu ụka maka ndị na-abụghị ndị ọrụ ugbo.

Ụgwọọnwa opekatampe n'otu awa n'etiti Naịjirịa, Senegal na DR Kongo

Otu ihe ọzọ ga-enye aka ka anyị mara ihe ụgwọọnwa opekatampe Naịjirịa dịka ya bụ i jiri dọla gbanwee ọnụego ụgwọọnwa mba ọbụla.

Anyị ji akụrụngwa gọọgle gbanwee ihe ụgwọọnwa ndị ọrụ pụtara n'ego obodo ha tinye ya n'ego dọla.

Ndekọ a abụghị ihe anyị nwetere n'ụlọakụ mba ụwa mana ọ ga-enye aka ka anyị mata ihe ụgwọọnwa ndị a niile pụtara n'otu awa:

  • Naịjirịa – Naira 337) - $0.21
  • DR Kongo - Francs1812.5 - $0.62
  • Senegal – FCFA 370.61 - $0.64
  • Ghana - Cedi 2.5 - $0.17

Cheta na etu anyi si wepụta ndekọ bụ ị mara ego ole mba ndị a na-akwụ n'otu ụbọchị maọbụ n'otu ọnwa. Anyị kere ụgwọọnwa ha na-akwụ ndị ọrụ ụzọ iri abụọ na isii bụ ụbọchị ọrụ.

Anyị gara n'ihu kee ụgwọọnwa otu ụbọchị ụzọ asatọ bụ awa asatọ a na-arụkarị ọrụ n'otu ọnwa bụ nke nyere aka wepụta ndekọ ego ole e nwereike ị na-akwụ ndị ọrụ na mba ndị a dị iche iche n'otu awa.

Ụgwọọnwa e ji ebi ndụ n'Amerịka na Briten

Na mba Amerịka, ndị ọrụ gọọmenti etiti na-eri ego ruru $7.25 maka otu awa.

Mana steeti dị iche iche nwekwara iwu ụgwọọnwa mere ha ji akwụ karịa nke gọọmenti etiti ha na-akwụ ndị ọrụ.

Steeti dị ka Alaska na-akwụ $11.91 maka otu awa, ebe onye ahụ ga-arụ ọrụ awa asatọ n'otu ụbọchị maọbụ awa iri anọ n'otu izuụka.

Mana na Briten, ihe ha na-akwụ ndị ọrụ bụ ụgwọọnwa e ji ebi ndụ, dịka ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba siri kọwaa. Nke Briten na Amerika dị iche na nke a na-akpọ ụgwọọnwa opekatampe.

Na Briten kemgbe Epril 2025, ọ bụ ndị ruru afọ iri abụọ na otu gbagoo bụ ndị na-eri ụgwọọnwa e ji ebi ndụ, mana ndị na-erubeghị afọ iri abụọ na otu na-eri ụgwọọnwa opekatampe.

  • Afọ 21 na ụma - £12.21
  • Afọ 18 to 20 - £10.00
  • Afọ 18 gbadaa - £7.55
  • Ndị na-amụ ọrụ - £7.55

Nnyocha na mgbakọ niile e mere banyere ụgọọnwa opekatampe n'otu awa n'etiti mba Naịjirịa, Senegal na DR Kong na-egosi na Naịjirịa bụ ndị na-eri ego pere mpe nke na-akwado oku ndị ọrụ Naịjirịa na-akpọ ka e tinyere ha ego n'ụgwọọnwa ha.

Cheta na otu na-ahụ maka ndị ọrụ na mba ụwa bụ International labour Organization (ILO) na-enye ndụmọdụ ka ụgwọọnwa a ga-akwụ ndị ọrụ bụrụ ihe ga-egboro onye ahụ na ezinaụlọ ya mpka ihe ha ga-eji dị ndụ dịka nri, ụlọ na ihe ndị ọzọ.