Ịchụ nta ndị na-egbu mmadụ, na-ere akụkụ ahụ mmadụ maka 'ịgwọ ọgwụ anwansi'

- Onye dere ya, Tyson Conteh
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
- Ebeg o si, Sierra Leone
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Nne nwata nwoke dị afọ iri na otu e gburu afọ anọ gara aga na-enwe mgbawa obi maka na enwebeghị onye e jidere aka ya dị n'ọnwụ ya.
"A nọ m n'ihe mgbu. E gburu nwa m mana naanị ihe m na-ahụ bụ na ọnye ọbụla nọ nwayọ" Sallay Kalokoh gwara BBC Africa Eye mgbe ọ na-ekwu na ha hụrụ ozu nwa ya bụ Papayo mana e wepụla akụkụ ahụ ya, anya ya na otu aka ya.
Ọ gara ire azụ n'ahịa mana ọ laghachịtaghị azụ.
Ezinaụlọ ya chọrọ ihe dịka izuụka abụọ tupu ahụ ozu ya n'ebe e bekasịrị ebekasị.
Kaloko kwuru na "anyị na-agwa ụmụaka anyị ka ha na-efi asaa n'anya. Ọ bụrụ na ha na-ere ihe, ha agakwana ebe zoro ezo maọbụ nara mmadụ ha amaghị ihe onyinye ọbụla".
Mmadụ e gburu n'obodo m bu Makeni na mpaghara etiti Sierra Leone bụ nke na-agbawa obi maka na anyị na-anụ maka ndị e gburu maka ọgwụ anwansi mana enweghị nke ndị gọọmenti na-eme nnyocha maka ya.
Mana ọnwụ Papayo bụkwa nke ndị uweojii ekweteghị na e gburu ya maka ọgwụ anwansi
Ndị ahụ na-egbu mmadụ maka ịgwọ ọgwụ anwansi na-agwa ndị ha na-agwọrọ ọgwụ na ọgwụ ha na-ere maka na nke ọbụla e ji mmadụ gwụọ na-eme nke ọma
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Maka ihe ụkọ na-emetụta gọọmenti mba ahụ nakwa etu ajọ ihe si eme mere ya ọ taa akpụ gọọmenti ha ime nnyocha ma chọpụta ndị aka ya dị na mkpamkpa a.
Nkwenye ndị Sierra Leaone nwere maka ịta amụsu bụkwa ihe ọzọ bụ nsogbu ọkachasị ndị uweojii nke mere na ọ bụghị ihe niile ka ha na-eme nnyocha aga n'isi njedebe.
Mana BBC chọrọ ịchọpụta ndị ahụ na-ere akụkụ anụ ahụ mmadụ nke mere ha ji zute mmadụ abụọ bụ ndị kwuru na ha na-agwọ ọgwụ anwansi.
Otu onye n'ime ha kwuru na ha nwere ndị na-azụ ya ahịa na mpaghara Afrịka mana BBC amaghị na ihe o kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ asị.
Otu onye ndị ọrụ anyị mere nnyocha nzuzo sị na ya bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ inweta ike dị egwu site n'iji mmadụ chụọ aja.
Na mbụ anyị gara n'obodo a na-akpọ Kambia dị nso na mpaghara ugwu Guinea bụ ebe anyị zutere nwoke aha ya bụ Kanu. O kpuchiri ihu ya ka a hara ịmara onye ọ bụ.
Ụlọọgwụ ya bụ ebe ọ na-ahụ ndị ọrịa dị n'ime ọhịa. Ọ sị na ya na-arụrụ ndị na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị ọrụ. Ma kwuo na ndị na-abịakwute ya na-esi mba dịka Guinea, Senegal na Naịjirịa.
Ọ bụ n'oge ntuliaka ọbụla ka a na-agwa ezinaụlọ ka ha kpachara anya n'ebe ụmụaka ha nọ maka na ọ bụ oge ahụ ka a na-atọrọ mmadụ.
N'oge nke abụọ anyị gara ebe ahụ ka Kanu gosiri Osman isi mmadụ nwụrụ anwụ ma gwa ya na ọ bụ ahịa ọ na-azụ.
"Ị na-ahụ nke a? Ọ bụ mmadụ nwe ya. Amịkpọrọ m ya. Ọ bụ isi nwata nwaanyị. A na m eche ka onye mere ya bịa nwere ya taa maọbụ echi".
N'ebe a bụ "ebe anyị na-akwụgbu mmadụ, bekasịa ha... ma ndị ọkaranya chọrọ ike na-abịa ebe anyị enye ha ihe ha chọrọ".
Mana Osman gwara Kanu na ya chọrọ mkpụrụaka nwaanyị ya ga-eji gwọọ ọgwụ nke mere Kanu ji gwa ya na ọ bụ 70m leones nke pụtara [£2,500; $3,000]."

Ka anyị ghara itinye onye ọbụla n'ọnọdụ ọjọọ mere na anyị agaghị zute Kanu ọzọ. O nwereike ịbụ onye na-egwu mmadụ chamdum. Mana anyị nwere ihe akaebe niile anyị wetere nwegara ndị uweojii ka ha mee nnyocha banyere ya.
Ndị na-eme udịrị ọgwụ ya na-akpọ onwe ha ndị dịbịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ bụ ndị na-eji mgbọrọgwụ na akwụkwọ ndụ na-agwọ ọrịa.
Ndekọ otu ahụike mbaụwa bụ World health organization na-egosi na mba Sierra Leaone bụ ebe a nụrụ agha n'afọ 1990 bụ ebe nje ebola kpara mkpamkpa n'afọ iri gara ma kwuo na ha nwere naanị ndị dọkịnta bekee ọnụ ọgụgụ ha dị otu puku bụ ndị e debenyere aha ha n'akwụkwọ mana e nwere ndị na-eme ọgwụ ọdịnaala ruru puku iri anọ na ise.
Sheku Tarawallie bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị na-eme ọgwụ ọdịnaala na mba Sierra Leaone na-ekwu na ndị na-eme udịrị ọgwụ Kanu na-eme na-emebi aha ha.
"Anyị na-agba mbọ ka aha anyị dị mma mana ndị mmadị adịghị aghọta. Ha na-achịkọta anyị niile ọnụ dịka ndị na-eme ajọ ihe. Mana anyị bụ ndị na-agwọ ọrịa anyị abụghị ndị na-egbu mmadụ".
Tarawallie na-agba mbọ ka gọọmenti nyereaka na-imepe ebe a na-agwọ ndị ọrị n'usoro ọdịnaala.
Ọ bụ ndị na-achọ ego nakwa oke ọchịchị bụ ndị na-egbu mmadụ maka ịgwọ ọgwụ anwansi.
Ọnụ ọgụgụ ndị e gburu na Sierra Leaone bụ nke a mabeghị, amaghị na ha abụ ndị okpukperechi Karịst maọbụ ndị alakụba.
Onye na-eme nnyocha na mahadum Aberystwyth bụ Emmanuel Sarpong Owusu kwuru na-enweghị ebe gọọmentị mba ahụ na-edekọ ndị nwụrụ ma ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ n'ihe mberede na ndị ọzọ ma kwuo na ọtụtụ oge na anaghị ama nke bụ nke.
Anyị chọpụtara onye ọzọ na-egbu mmadụ na-ere ahụ mmadụ na mpaghara mpaghara Freetown, anyị chọpụtara na ha na-ere ọgwụike na ndị ọzọ.
"Ọ bụghị naanị m. e nwere ndị na-arụ ọrụ ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na-arụ ọrụ n'okpuru m" ka nwoke ahụ gwara Osman bụ onye iyi uwe e ji esete onyonyo zere ezo.
Idara kwuru sị "Enweghị ụdị mpaghara ahụ mmadụ ị gaghị enweta. Kpọọ aha mpaghara ahụ mmadụ ị chọrọ, anyị ga-enwetere gị ya. Anyị ga-eke ọrụ".
Ọ gara n'ihu kwuo na o nwere ndị ọ bụ ijide mmadụ bụ ọrụ ha. Mgbe ọzọ Osman gara n'ebe ahụ ka ọ mere ka Osman gee ntị ihe onye sị na ha adịla njikere ijide mmadụ.
Mana Osman gwara ya chere mgbe Idara sị na ha ahụla onye ha ga-ejide. Anyị kpọtụrụ Komishịọna ndị uweojii Ibrahim Sama.
Sama gwara anyị etu a ga-esi jide ndị ahụ mana ọ sị na a gaghị eme ihe ọbụla ma ọ bụrụ na Tarawallie bụ onyeisi ndị na-eme ọgwụ ọdịnaala esoghị.
"Mgbe ọbụla anyị nụrụ na e nwere onye na-agwọ ajọ ọgwụ anyị na Tarawallie na-eso" Onye uweojii bụ Aliu Jallo kwuru.
E jidere Idara ma nweta mma a maama e ji egbu mmadụ ebe Tarawallie mere nnyocha ma kwuo na e nwere ọkpụkpụ mmadụ, ntụtụ isi mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ n'ụlọ arusị ya.
Nke a ka ndị uweojii jiri jide Idara ma kpụga ya na ụmụnwoke ndị ọzọ ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ maka ịgwọ ọgwụ anwansi. Ha sị na aka ha dị ọcha nke mere aga ji nye ha ntọhapụ ruo mgbe ndị uweojii ga-emecha nnyocha.

Dịka anyị anụbeghị ihe ọbụla n'ọnụ ndị uweojii na mpaghara Kambia maka Kanu, anyị chọrọ ijiri aka anyị gbaa ya ajụjụ maka ihe anyị chọpụtara n'aka anyị mana anyị adịghịzị enweta ya.
A na-akpachi okwu gbasara ndị mkpa n'oge ụfọdụ. Afọ abụọ garaaga ka onye nkuzi na mahadum nwụrụ. E mechere hụta ozu ya n'ụlọ ndị dịbịa na mpaghara Waterloo.
A kpụgara ndị a na-enyo enyo maka ọnwụ ya n'ụlọikpe mana a gwara BBC na a tọhapụla ndị ahụ kamgbe.
Ezinaụlọ nọ n'ụdịrị ihe ahụhụ a ebe ha na-achọ ikpe nkwụmọtọ. N'ọnwa Mee ka a gwara BBC na e gburu onye dị afọ iri abụọ na itoolu aha ya bụ Fatmata Conteh n'obodo a na-akpọ Makeni.
Ọ bụ onye na-edozi mmadụ isi ma bụrụkwa nwaanyị mụrụ ụmụaka abụọ. A hụrụ ozu ya n'akụkọ ụzọ ka otu abalị gachara o mere ncheta ọmụmụ ya.
Ọtụtụ ndị e gburu na nsonso a ihe dịka eze adịghịzị nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-eche na-egburu ya maka ịgwọ ọgwụ anwansi.
Ezinaụlọ Fatmata buru ozu ya gaa Freetown ebe e mere nnyocha 'autopsy' ịchọpụta ihe gburu ya. Mana gọọmenti enweghị ume ime ụdịrị ihe ahụ ọzọ bụ na mpụtara nnyocha autopsy ezughịoke, ọzọkwa bụ na enweghị onye e jidere maka ya.
Dịka mama Papayo, enweghị ihe e mere, maọbụ ndị e jidere nakwa ebum n'obi ndị mmadụ na enweghị ihe gọọmenti ga-emere ha mere igbu mmadụ ji bụrụ nke na-akpọtụ akpọtụ na Makeni.









