You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu mụ na Jimmy 'Nwachukwu' si zute onwe anyị ma bụrụ oke enyi – Mc A1
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
Nwamadị bụ Nwafor Emmanuel Nkemakolam 'Mc A1' a ma ama n'akpaọchị akọwaala etu o siri zute nnukwu enyi ya nwoke bụ Eugene e ji 'Jimmy Nocap' maara.
Na mkparịtaụka Mc A1, Jimmy na BBC Igbo nwere, ha kọwaara etu njem ha n'ịkpaọchị siri malite ma ruo ogogo ha nọ ugbua.
Mc A1 kwuru na o zutere Jimmy mgbe ọ gara ise ihe onyonyo n'ọgbọ ebe a kpọro 'Clappers junction' dị na Lọndọn, oge ọ na-achọ onyeọcha ga na-eso ya eme ihe onyonyo ịkpaọchị.
O kwuru na mgbe ọ gwara Jimmy ka o see ya ihe onyonyo, na ọ maghị na Jimmy n'onwe ya bịakwara ebe ahụ ise ihe onyonyo, na ọ bụ etu ahụ ka ha siri sekọọ ihe onyonyo.
Mc A1 kwuru na ha gara n'ihu mee ihe onyonyo n'ụbọchị ọzọ ma sizie ebe ahụ na-emekọta ihe ọnụ ma bụrụzie enyi ugbua.
N'aka nke ọzọ, Jimmy kwuru na ezi aha ya bụ Eugene, na ọ bụ nwafọ mba Rọshịa mana o biela na mba Briten ihe ruru afọ iri abụọ (20yrs).
O kwuru na ọ dịla mbụ na-eme ihe onyonyo tupu o zute Mc A1. O kwuru na ọ nabatara Mc A1 maka na ọ bụ ezigbo mmadụ, ma bụrụkwa ezi enyi ya nke mere o ji soro ya lọta na Naịjirịa ịbịa mee ihe ngosi.
O kwuru na obi dị ya ụtọ ịbịa Naịjirịa, na ọ bụrụ obodo dị mma nwere ndị mmadụ dị ukwuu.
Jimmy gara n'ihu kwuo na onwebeghi onye ọbụla gwara ya okwu ọjọọ banyere ihe onyonyo ya na Mc A1 na-eme, kama na ọ bụ naanị okwu dị mma na-akpalite mmụọ ka ọ na-enwete.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na nri ndị Naịjirịa dịkwa mma mana o nwere ihe ọ gwakọtara ọnụ rie nke sara ya afọ oge ọ bịara na Naịjirịa.
Kirie ihe ha kwuru n'uju;