Maachị, ọnwa oke ntọrọmmadụ na Naịjirịa

Nwata nwoke ji epekele akwụkwọ o ji eme mkpesa, megide ihe onye nkụzi, nne na nna na onye Kanselọ kwuru

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Atọrọola ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa n’ime izuụka abụọ gara aga
    • Onye dere ya, Azeezat Olaoluwa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos

Ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa amaala ọkwa na ya gbochiri ntọrọmmadụ ma kwụsịkwa mkpọpụ mmadụ 16 na mpaghara Kajuru nke Kaduna Steeti n’abalị Sọnde.

Ma n’otu abalị ahụ kwa, ndị oyi ndụ egwu wakporo obodo ọzọ dị na Kajuru ma tọrọ ọtụtụ mmadụ.

N’ime izuụka abụọ gara aga, mpaghara ugwu nke Naịjirịa ahụtala opekata mpe mwakpo isii nke mere ka atọọrọ ndị mmadụ n’igwe.

Njinji a jiri na nso nso a arụtụla aka etu otu ndị omekoome, ndị a na-enyo enyo na ha na otu Ansaru nke ya na al-Qaeda na-emekọrịta ihe ebulikwuola mkpamkpa ha na mpaghara ahụ.

Ọ bụrụla izuụka abụọ jupụtara n’ihe ịmaaka nye gọọmenti Naịjirịa bụkwanụ nke manyere ya ibokwasa akụrụngwa nchekwa ya ibu arụ iji gbaa mbọ napụta ọtụtụ ndị atọọrọ. Mana ka ọ dị, enwebeghị onye ọ bụla n’ime ha anapụtara.

Iri elu nke ọnọdụ erubeghị isi n’iwu na-egosi etu ndị omekoome bu ngwa ọgụ si emegbu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.

Ọtụtụ mmadụ akatọọla ndị ọchịchị maka azọpụghị njem ngwa ngwa bụ nke na-akwalite ọnọdụ tigbuo zọgbuo.

“Gọọmenti ejighị nchekwa ndụ na ngwongwo ụmụ mmadụ kpọrọ ihe dị oke mkpa. Ndị ọchịchị ahụtaghị ya dịka otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ha ga-elebara anya. Ọ bụrụ na ha ji ya kpọrọ ihe, anyị ekwesịla ịhụ ihe dị iche. Anyị gaara ahụtala mgbanwe dị mma n’ọnọdụ nchekwa,” ya ka Isa Sanusi, onye ntụziaka otu Amnesty International na Naịjirịa gwara BBC News.

Ntọrọmmadụ nke mbụ n’ime ọnwa a bụ nke kpọtụrụ n’abalị 6 Maachị 2024 na Borno Steeti nke dị na mpaghara north-east Naịjirịa. Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị agha nnupụisi wakporo otu ime obodo ebe ndị gbara ọsọ ndụ bi ma tọrọ opekata mpe mmadụ 200, nke ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị ka n’ọnụọgụ n’oge ha gara ịkpa nkụ n’ime ọhịa.

Na-agbanyeghị na ndị agha haziri usoro ọrụ nnapụta a kpọrọ “search and rescue operation”, ha kụrụ afọ n’ala ịkpọghachị mmadụ ndị ahụ a tọọrọ.

Ihe onyonyoo na-egosi ụlọakwụkwọ Kuriga dị na Kuririga n’abalị 8 Maachị 2024 bụ mgbe ndị ojiegbe tọọrọ ihe karịrị ụmụakwụkwọ 250

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ihe ruru ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi 300 ka ndị ojiegbe tọọrọ n’ụlọakwụkwọ a dị na Kaduna
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N’ụbọchị nke na-esote ya bụ 7 Maachị 2024, ihe ruru ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi 300 ka ndị ojiegbe tọọrọ n’otu ụlọakwụkwọ dị na Kaduna. Gọọmenti Steeti ahụ mechara mapụ ọkwa na 28 n’ime ụmụakwụkwọ ahụ eriela mbọmbọ n’aka ndị ntọ.

N’ozi o wepụtara, onye nnọchiteanya UNICEF na Naịjirịa bụ Cristian Mubduatehe katọrọ “ogo na-amapụ obi ụdị njinji ahụ si na-eji n’ala Naịjirịa” kwuo na “nke ahụ na-egosi ọnọdụ ọgbaaghara nke chọrọ ka elebara ya anya ngwangwa site n’ogo gọọmenti dị iche iche nakwa ọha obodo.”

N’abalị 9 Maachị 2024, ndị ojiegbe tọọrọ opekata mpe ụmụakwụkwọ 15 site n’ụlọakwụkwọ ọzọ dị na Sokoto.

Ka mkpụrụ ụbọchị abụọ gasịrị, ndị a na-enyo enyo ị bụ ndị ọkpaegbe wakporo okpuruọchịchị Kajuru nke Kaduna Steeti ọzọ, tọrọ mmadụ 61.

Mwakpo ọhụrụ bụ nke e mere na nso nso a n’okpuruọchịchị Kajuru bụ ebe a tọọrọ ihe karịrị mmadụ 100 nke gụnyere ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị, ndị omekoome kpọọrọ ha rie mbọmbọ.

Nkwa onyeisiala Bola Tinubu kwere ịkwalite ndị agha Naịjirịa ibu agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa abụrụla nke onye ọ bụla na-enyochasị dịka a na-atọrọ ndị mmadụ n’igwe. Na-agbanyeghị ọtụtụ arịrịọ BBC na-arịọ, ndị ọchịchị ajụla ikwu banyere atụmatụ ndị ha nwere maka ntọrọmmadụ ndị a na-aga n’ihu.

O dochabeghị anya ihe mere ntọrọmmadụ jiri rịa elu na nso nso a mana enwetala akụkọ na mgbe gara aga bụ mgbe a manyere ụmụnwaanyị ndị a tọọrọ ka ha siere ndị tọọrọ ha nri.

Ndị ojiegbe akpọọla oku ka akwụọ ha ego mgbapụta iji tọhapụ ụmụakwụkwọ atọọrọ na mmalite ọnwa a, mana ndị ọchịchị gbara isi akwara ịkwụ ụgwọ ọ bụla. Ịtọrọ mmadụ maka iji nara ego mgbapụta bụ nke zuru ebe niile na Naịjirịa, mana ịkwụ ya bụ egọ bụ nke iwu na-akwadoghị.