Ndị Afrịka isii ga-ewu ewu n'egwuregwu Olimpik 2024 na Paris

Faith Kipyegon, Blessing Oborodudu na Biniam Girmay

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Faith Kipyegon nke mba Kenya eriteela ọlaedo olimpik abụọ ebe Blessing Oborodudu na Biniam Girmay na-ele anya erita ọla na mba Paris
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Afrịka na-ele anya erita ọla iri ise nke bụ ha n'egwuregwu olimpik na mba Paris.

N'ime mmeme 329 n'egwuregwu 32, Afrịka were ọtụtụ ohere erita ọtụtụ ọla n'isi obodo France.

Agbagheghi na-enweela ọtụtụ ndị Afrịka ritara ọtụtụ ọla n'egwuregwu olimpik n'oge gara aga, enwere ndị ọzọ chọrọ ka ụwa mara aha ha.

Lee mmadụ isi ngalaba egwuregwu BBC Afrịka chọrọ ka ị lebenye anya na ha n'egwuregwu Olimpik 2024.

Faith Kipyegon (Onye mba Kenya na-agba ọsọ)

O riteela nzere mba ụwa abụọ ma tinye kwa ndekọ mbaụwa anọ n'ime ọnwa 13 gara aga, Kipyegon kwado ọfụma wee na-aga Paris.

Nwa afọ Kenya a gbara afọ 30 na-atụanya irite ọlaedo Olimpik nke atọ ya n'ọsọ 1500m nke ụmụ nwaanyị. Enwebeghị onye ọsọ Afrịka nwetagoro ọlaedo atọ n'aso ibe ya n'ofu egwuregwu n'Olimpik.

Kipyegon beletara nzere mbaụwa n'ọsọ 1500m nke ụmụ nwaanyị n'egwuregwu Diamond League na Paris na mmalite ọnwa a. Ọ ga-esonye n'ọsọ 5000m n'egwuregwu Olimpik afọ 2024.

Ka o ritechara nrite abụọ ahụ n'egwuregwu mbaụwa n'afọ gara aga, nwa afọ Kenya a o nwere ike ime ihe di ebube na Paris ma chie onwe ya Eze nwaanyị ọsọ?

Letsile Tebogo (Onye mba Botswana na-agba ọsọ)

Letsile Tebogo ji ọkọlọtọ mba Botswana

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ gara aga, Letsile Tebogo bụ onye mbụ n'Afrịka newtara ọla n'ọsọ 100m ụmụnwoke n'egwuregwu mbaụwa.

Nwoke mbụ si Botswana nwetara mmeri n'oge 10 sekọnds n'ọsọ 100m, Tebogo pụtara ihe n'afọ gara aga oge o ritere ọla abụọ n'egwuregwu mbaụwa.

O nwetara ọla ọcha n'ọsọ 100m na ọla nchara n'ọsọ 200m nke mere ya ka ọ bụrụ nwoke mbụ n'Afrịka nwetara ọla n'ọsọ ntakịrị ndị ahụ.

Tebogo gbara afọ 2. Nne ya onye ya na ya nwere ezi mmekọ nwụrụ n'ọnwa Mee,

O nwere ike ị bụ nwoke mbụ n'Afrịka ga-erita ọla n'ọsọ 100m, 200m na egwuregwu olimpiks ka Frankie Fredricks mere ya n'afị 1996, mana o ga-adị njikere iji nweta ọla na Paris.

Biniam Girmay (Onye mba Etiopịa na-agba basikolo na ọsọ ụzọ)

Biniam Girmay na ndị nkwdo ya na-ese foto.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Girmay na-enwata ezi nkwado n'aka ndị obodo ya.

Ọ bụ nye mere nke ọma n'egwuregwu Tour de France ebe ọ bụ nwoke oji mbụ n'Afrịka nwetara ọla n'egwurewgu ahụ. Ọ bụ onye a ma ama n'obodo ya, Eritrea.

O bụrụ na nwaamadị a gbara afọ 24 nweta mmeri n'egwuregwu Olimpiks na Paris, ọ ga-abụ onye mbụ na mpaghara East Afrịka ga-enweta nturugo dị etu ahụ n'egwuregwu Olimpik nke ga-agafe ọla nchara mpaghara ahụ ritere n'afọ 2004.

Blessing Oborodudu (Onye Naịjirịa na-agba mgba)

Onye a ma ama n'igba mgba n'Naịjirịa nakwa Afrịka. O nwetela mmeri 14 n'egwuregwu n'Afrịka nakwa ọla anọ n'egwuregwu Commonwealth, Oborududu bụ onye Naịjirịa ka nwe mee ọfụma n'Olimpik Tokyo afọ 2020 ebe o ritere ọla ọcha na mgba ndị n'ada 68kg.

Ọ gbara afọ 35 ma na-atụ anya irite ọlaedo n'egwuregwu Olimpiks a nwereike i bụ nke ikpeazụ ya.

Oborududu bụ onye nke isii n'ụwa n'abịa na ndị na-agba mgba 68kg.

Ọ pụtara ihe n'afọ 2009. Oborududu o nwere ike iruta ọla edo nke anọ mba Naịjirịa n'egwuregwu Olimpik?

Hugues Fabrice Zango (Onye Burkina Faso na-agba ọsọ)

Hugues Fabrice Zango

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Hugues Fabrice Zango

Zango onye gbara afọ 31 riteara Burkina Faso ọla edo nke mbụ ya n'egwuregwu Olimpik na Tokyo afọ atọ gara aga.

Ọ bụ onye nwetara nzere mbaụwa n'afọ gara aga mgbe ọ nwụrụọsọ 17.64m na Budapest.

Ọ bụ ọkachamara na injiniaring latrik. Ọ bụkwazi onye obod ya na-atụkwasi obi maka ọla na Paaris.

Fatima Zahra El Mamouny (Onye Morocco)

Fatima Zahra El Mamouny

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Fatima Zahra El Mamouny

Onye a maara dị ka B-girl El Mamouny, onye mba Morocca bụ nwanyị mbụ ruru eru maka asọmpi Olimpik.

Kọmiti na-ahazi asọmpi a malitere ya n'afọ 2024 iji dọta ndị na-eto eto.

Nwa agbọghọ ahụ dị afọ 24 mere onwe ya aha n'okporo ámá Rabat, n'agbanyeghị na ndị mụrụ ya akwadoghị ya na mbụ.

Ndị na-agba egwu ga-asọnye n'egwuregwu Olimpik afọ ebe ha ga-egosipụta ma zọọ ọla.