You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọomeiwu Sịnetị akwadola ka Tinubu zigaa ndịagha na mba Bene Rịpọblik
- Onye dere ya, Paul Njie
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Onye dere ya, Lucy Fleming
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ụlọomeiwu Sịnetị akwadola arịrịọ Onyeisiala Tinubu iziga ndịagha Naịjirịa na mba Bene Rịpọblik, iji nye aka weghachi udo na mba ahụ.
Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Godswill Akpabio kwupụtara nke a n'ụbọchị Tuzde 9 Decemba, 2025 oge ha na-enwe ọgbakọ.
Nke a na-abịa dịka Kọmitii Ụlọomeiwu lebachara anya n'arịrịọ Onyeisiala Tinubu, bụ nke gbakwasara ụkwụ na mpaghara 5, nkeji 11 nke iwu Naịjirịa.
Ndị omeiwu niile ji otu olu kwado Onyeisiala ka o zigaa ndịagha, ma nye nkwado ka ha gbata ọsọ enyemaka na mba ahụ.
Cheta na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu gwara Ụlọomeiwu Ukwu ka ha kwado iziga ndịagha Naịjirịa mba Bene Rịpọblik.
Tinubu kwuru na nke a bụ n'ihi mbọ ndịagha gbara iweghara ọchịchị n'ike na mba ahụ na nso nso a.
Arịrịọ a dị n'akwụkwọ leta a gụpụtara n'oge ọgbakọ ụlọomeiwu ahụ n'ụbọchị Tuzde 9 Disemba, 2025.
N'akwụkwọ leta ahụ, Onyeisiala kọwara na Gọọmenti Bene Rịpọblik arịọla Naịjirịa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa ma zitere ha ndịagha elu, dịka ndịagha nwachara iwezuga Onyeisiala Patrice Talon n'ike.
Tinubu rụtụrụ aka na mpaghara 30(5), nkeji nke abụọ, nke akwụkwọ iwu Naịjirịa (nke e megharịrị) ma gwa ndị omeiwu na ya eburula ụzọ kpọtụrụ otu nchekwa Naịjirịa bụ National Defence Council tupu o zitere ha arịrịọ ahụ.
A kwụsịla ndịagha chọrọ ịnapụ Onyeisiala mba Benin bụ Talon ọchịchị n'ike - Alassane Seidou
Mịnịsta na-ahụ maka ime obodo na mba Benin bụ Alassane Seidou ekwuola na a kwụsịla ndịagha ahụ chọrọ ịkwatụ ọchịchị Onyeisiala Patrice Talon.
Seidou kwuru nke a n'onyonyo Tv mba ahụ bụ ebe ọ nọ kọwara na ọ bụ ndịagha na-erube isi n'iwu obodo kwụsịrị ndịagha ahụ chọrọ ịkwatụ ọchịchị Talon.
Ọ bụ n'ụtụtụ Desemba 7, 2027 ka ndịagha nke na-erubere Lt-Col Pascal Tigri isi pụtara kwuo na ha achụpụla Onyeisiala Patrice Talon n'ọchịchị ma wezuga iwu mba ahụ n'akụkụ.
Mana ụlọ nnọchịtaanya mba Fransị dị na mba Benin ji akara soshal mịdịa ha kwuo na ọ bụ eziokwu na ụda egbe dara agharaaghara n'isi obodo mba Benin ọkachasị n'ụlọ Onyeisiala ha dị nso na Cotonou.
Ndị mmadụ gwara BBC na ha nụrụ ụda egbe, ọzọ bụ na e jichiri ndị ntaakụkọ niile na-arụ ọrụ n'obi ọchịchị maọbụ n'ụlọ ebe Onyeisiala mba ahụ.
N'okwu Alassane Seidou "ọ bụ ndịagha mmadụ ole ma ole chọrọ iji ike wepụ ọchịchị n'usoro iwu obodo nke nwereike inweta ntigharị anya".
"Mana ndịagha na-erubere gọọmenti isi kwụsịrị ha. Gọọmenti na-agwa onye ọbụla ka ha gaa n'ihu na-ebi ndụ ha maka na ihe niile na-aga n'usoro ugbua".
Mba Frensi na Rọshịa na-agwa ụmụamaala ha ka ha nọrọ n'ụlọ hara ịpụ n'iro maka ọnọdụ nchekwa na mba Benin.
Mana mba Amerịka nyere ndụmọdụ ka a hara ịga nso na mpaghara Cotonou, ọkachasị ụlọ Onyeisiala ha.
Ndịagha na mba Benin Republic sị ha anapụla Onyeisiala Talon ọchịchị n'ike
Ndịagha na mba Benin dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka ekwupụtala n'ihe onyonyo mgbasaozi TV nke mba ahụ na ha anapụla Onyeisiala Patrice Talon ọchịchị n'ike ma chụpụ ya.
Ozi si n'ụlọọrụ mba Fransị dị na Benin kwuru na a nụrụ ụda egbe n'akụkụ ụlọ ebe onyeisiala ahụ bi dị n'obodo Cotonou.
Ndịagha kwupụtara nkegbu iwu na-achị obodo, mmechi okeala niile nakwa mmechi ihu eluigwe mba ahụ maka njem ụgbọe
Mana onye ọrụ gọọmenti dị onyeisiala nso kwuru na onyeisiala Talon dị mma, ma sị na ọ bụ obere otu ndịagha gara n'ụlọ mgbasaozi TV na ha enweghi nkwado dị agha ndị ọzọ.
"Achịkwatala ọnọdụ ugbua. Ọtụtụ ndịagha ka na-erubere gọọmenti isi - anyị ga-ewere ọnọdụ," Mịnịsta na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Shegun Adjadi Bakari gwara ntaakụkọ Reuters.
Ndị a na-akpọghị aha n'ụlọọrụ Onyeisiala gwara ntaakụkọ AFP: "Ihe a bụ ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha dị obere bụ ndị kpachiri naanị ụlọ mgbasaozi TV. E chekwaala obodo na mba a ugbua.
A mebeghi ebe onyeisiala nọ ugbua.
Ndịagha ewerela ọnọdụ n'okporoụzọ dị iche iche n'obodo Cotonou.
A na-ahụta mba Benin dịka mba ọchịchị onye kwuo uche ya kwụsi ike. Ha bụ mba so ndị kachasị emepụta akụkụ kọtịn, mana soro na mba kachasị daa ogbenye n'ụwa.
Ụlọ nnọchiteanya mba Fransị na Rọshịa agwala ndị obodo ha nọrọ n'ime ụlọ ha maka nchekwa ha.
Ebe Amerịka kwuru na ọ na-ele etu ihe si aga ma nye ndụmọdụ ka onye ọbụla zeere obodo Cotonou, ọkachasị ebe dị nso n'ụlọ onyeisiala.
Dịka ozi ahụ si kwuo, onye ndu ndịagha bụ Lieutenant-Colonel Tigri Pascal ga-edu usoro iwere ọchịchị ndịagha.
Ha kwuru na ihe mere ha jiri mee nke a ma katọọ ọchịchị Onyeisiala Talon na etu o si achịkọta mba ha.
Talon bụ onye dị afọ iri isii na asaa na-akwado ịgbatu n'ọchịchị afọ ọzọ mgba ọ chịzuo ugboro abụọ n'ọkwa ma e mee ntuliaka n'ọnwa Eprelụ.
Ọ bụ onye achụntaego e ji 'eze cotton' maara. Ọ batara n'ọchịchị n'afọ 2016 mgbe o merichara ntuliaka. O kwere nkwa na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ ma dị mbụ kpọpụta aha onye ga-anọchi anya ya.
Iwere ọchịchị n'ike a na Benin na-abịa n'ihe karịrị otu izuụka ndịagha chụpụrụ Onyeisiala Umaro Sissoco Embalo nke mba Guinea-Bissau dị ha nso.
N'afọ ndị dị nso nso a, e nweela ọtụtụ iwere ọchịchị n'ike nke ndịagha na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, nke gụnyere Burkina Faso, Guinea na Niger, nke na-ebute nnukwu ụjọ na ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ ga-akawanye njọ.