Izrel na Hamas: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na nkwekọrịta udo ha nwere

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe abalị atọ ka mba Izrel na ndị Hamas were mkparịtaụka udo na mba Ijipt bụ nke Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump kwadoro.
Ha haziri usoro udo ahụ na n'agba n'agba mana ihe kachasị gbaa ọkpụrụkpụ bụ na ha binyereaka n'usoro udo ahụ ma kweta etu a ga-esi eme ya.
Onyesisiala mba Amerịka bụ Donald Trum dere ọtụtụ ihe banyere atụmatụ udo ahụ n'akara soshal mịdịa ya ma kwuo ebumnobi ya na udo tọrọatọ ga-adị na mpaghara ahụ.
Cheta na nkwekọrịta udo a na-abịa n'afọ abụọ na abalị abụọ kamgbe agha Izrel na Hamas bidoro.
Hamas wakporo mpaghara ndịda anyanwụ mba Izrel n'Ọktoba 7, 2023 gbuo mmadụ ruru 1,200 ma tọrọ mmadụ 251.
Nke a mere mba Izrel jiri bido ibuso Hamas agha na Gaza nke butere ọnwụ mmadụ ọnụ ọgụgụ ha karịrị 67,100 dịka ụlọọgwụ ndị Hamas na-elekọta si kwuo na Gaza.
Mara na otu mba ụwa bụ United Nations (UN) na otu ndị ọzọ na-ahụta ndekọ mmadụ ole nwụrụ nke ụlọọgwụ Hamas wepụtara dịka ndekọ bụ eziokwu.
Nkwekọrịta Izrel na Hamas

Ebe foto si, Reuters
A haziri usoro udo n'etiti mba Izrel na Hamas n'agba n'agba mana ọ bụ n'agba nke mbụ ka ha nwere nkwekọrịta.
Ihe ndị gbapụtara ihe na ya gụnyere:
- Izrel na Hamas ga-atọhapụ ndị niile ha jidere n'agha.
- A ga-emere onye ọbụla ihe ma hara inwe onye a ga-emegide.
Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kọwara usoro udo ahụ dịka "ụbọchị ọma dịaala ndị Izrel".
Izrel na-akọwa na ndị obodo ha nọ n'aka ndị Hamas ruru iri anọ na asatọ na Gaza na ha kwenyere na mmadụ iri abụọ n'ime ha ka dị ndụ.
N'aka nke ọzọ, ndị Hamas kwuru na "nkwekọrịta ahụ ga-akwụsị agha na Gaza, nwepụ ndịagha Izrel na Gaza, nye ohere ka ndị ọrụ enyemaka na ndị ọrụ gbatagbata bubata ihe e ji enyere ndụ aka nakwa ntọhapụ ndị nga n'etiti izrel na Hamas.
Ihe Trump kwuru maka nkwekọrịta udo ahụ

Ebe foto si, Anna Moneymaker/Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara na ndị Izrel na Hamas binyereaka n'agba nke mbụ n'usoro udo.
Cheta na ndị Izrel na Hamas ekwughị okwu ihu na ihu mana ọ bụ onyeozi pụrụiche nke Donald Trump a na-akpọ Steve Witkoff na ọgọ nwoke Trump bụ Jared Kushner so na ndịisi hụrụ maka mkparịtaụka udo ahụ.
Mba dị icheiche so na mkparịtaụka udo ahụ gunyere mba Ijipt, Kataa, na Tọkịị.
Gịnị ga-emezi dịka Izrel na Hamas nwechara nkwekọrịta udo?

Ebe foto si, EPA
A na-atụ anya na ndị omeiwu mba Izrel ga-atụ vootu banyere nkwekọrịtaụka udo ahụ.
Ọ bụrụ na ndị mịnịsta mba Izrel ekweta, ndịagha Izrel ga-apụ na Gaza.
Ụlọọrụ mgbasaozi CBS News na-ekwu na nke a ga-eme n'ime awa iri abụọ na anọ dịka ndị nọ na gọọmenti Izrel si gwa ha.
E kwuru na ihe dịka awa 72 maọbụ n'ime ụbọchị atọ na ndị Hamas ga-atọhapụ ndị Izrel ha tọọrọ bụ ndị nke ka dị ndụ.
Etu umu Izrel na ndị Palestin si nabata nkwekọrịta udo a

Ebe foto si, EPA
Ụmụ amaala mba Izrel nakwa ndị Palestin na-enwe anụrị banyere nkwekọrịta udo nakwa nkwụsị agha na Gaza.
Na gburugburu Khan Younis dị na Gaza ka ndị Palestin na-enwe anụrị naanị nkenke oge ha nụrụ na Izrel na Hamas ekwetala ịkwụsị agha.
Etu ahụ ka ọnọdụ dị na mpaghara Tel Aviv ebe ụmụ Izrel ọkachasị ezinaụlọ ndị ụmụ ha ka nọ n'aka Hamas bụ ndị pụtara n'igwe na-enwe anụrị.

Ebe foto si, Reuters








