You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Charly Boy asaala gọọmenti Legọs maka ịgbanwe aha 'bus stop' burula aha ya
- Onye dere ya, Adline Okere, Michael Ngene, Donald Wogu
- Ebeg o si, Legọs
Charles Oputa a ma dịka Charly Boy akatọọla mgbanwe gọọmenti Legọs Steeti gbanwere 'Charly Boy bus stop' dị na mpaghara gbagada steeti ahụ ma kwuo na enweghị uru ọbụla mgbanwe ahụ ga-abara Naịjirịa.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Charly Boy kwuru na ihe ndị ọchịchị kwesịrị ị na-ekwu maka ya bụ ichepụta atụmatụ ga-eme ka ọnọdụ obibi ụmụafọ Naịjirịa dị mma.
N'okwu ya "Ihe mbụ m mere oge m nụrụ na a gbanwere aha odo ụgbọala 'bus stop' bụ ịchị ọchị, onye gwara ndị ọchịchị na ọ bụ ịgbanwe aha ga-eme ka obodo dị mma"?
Charly Boy gara n'ihu rụtụ aka n'ihe na-ebute okwu nkewa oge ọbụla Naịjirịa na-akwado ime ntuliaka.
Ọ kpọrọ oku ka ndị ntorobịa Naịjirịa kee ajị n'ume na ntuliaka afọ 2027 iji hụ na e nwere mgbanwe na Naịjirịa.