Bra size: Etu nwaanyị ga-esi mara akpaara o kwesịrị iyi
Bra size: Etu nwaanyị ga-esi mara akpaara o kwesịrị iyi
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eyi akpaara mana ha amaghị nke dị ha mma na nke ha kwesịrị iyi.
Ụfọdụ oge, ụmụnwaanyị na-eyi nke ga-emecha nye ha nsogbu.
Naomi Ekanem bụ ọkachamara n'ihe gbasara akpaara, egosila etu ụmụnwaanyị ga-esi mara ụdịrị akpaara ha kwesịrị iyi, etu ha ga-esi tụọ onwe ha iji mata nke ha kwesịrị iyi, wdgz.
Ọ gakwara n'ihu kọwaa nsogbu nwereike isi na-eyighi ụdịrị akpaara ị kwesịrị iyi pụta.

Nsogbu ndị na-esi na-eyighi akpaara ị kwesịrị:
Nke a gụnyere:
- Anọzighi ọfụma (Bad posture or sloughed back)
- Mgbu n'ubu aka (shoulder pain) (nke e nwere ike iji naanị ịwa ahụ mezie)
- Azụ mgbu na olu mgbu (nke nwereike inyegide onye ahụ nsogbu ebighebi)
- Mkpụchapụ ahụ (nke Bekee kpọrọ abrasions) nke nwereike ịba ọnya
- Akpaara aka ya na-ekekpa ahụ nwekwara ike itinye akara n'ahụ mmadụ (groves)


